Filipenses 4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Arịrịọ mmechi maka ịdị nʼotu nakwa ịnọgidesi ike
1Ya mere, ụmụnna m, ndị m hụrụ nʼanya, na ndị ihe ha na-agụsị m agụụ ike, unu ndị na-enye m ọṅụ, na ndị bụ okpueze m nʼihi ọrụ m na-arụ, bikonu, guzosienụ ike nʼime Onyenwe anyị.
2Arịrịọ m na-arịọ Yodia na Sintiki bụ, ha biko, nwe otu uche nʼime Onyenwe anyị. 3E, ana m arịọkwa gị, ezi onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, biko, nyere ụmụ nwanyị ndị a aka nʼihi na ha abụọ bụ ndị so m rụọ ọrụ ikwusa oziọma nye ndị ọzọ. Ha sokwa Klement rụọkwa ọrụ, bụ ndị ahụ e dere aha ha nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ.
Ndụmọdụ ikpeazụ
4Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile nʼime Onyenwe anyị. Ka m kwuokwa ya ọzọ, ṅụrịanụ ọṅụ! 5Meenụ ka mmadụ niile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obiọma nʼihe niile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. 6Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọbụla. Kama nʼihe niile, sitenụ nʼekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe niile na-akpa unu nʼihu Chineke. 7Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọbụla mmadụ nwere ike ịghọta, ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nʼime Kraịst Jisọs.
8Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya. 9Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.
Ekele nʼihi Onyinye ha
10Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya. 11Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla. 12Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. 13Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
14Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya. 15Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu. 16Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m. 17Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye unu, kama ana m achọ ka mkpụrụ unu ga-amịta baa ụba, bara unu uru. 18Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma. 19Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.
20Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
Ekele ikpeazụ
21Keleere m ndị nsọ niile nʼime Kraịst Jisọs.
Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu.
22Ndị nsọ niile nọ nʼebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nʼụlọ Siza.
23Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu. Amen.
¿Sabías que…?
Alegría, acuerdo y colaboración generosa
- Pablo exhorta a Evodia y a Síntique, dos mujeres de la iglesia de Filipos que habían trabajado con él en el evangelio, a ponerse de acuerdo en el Señor. El Easton's Bible Dictionary (1897) da al nombre de Evodia, escrito allí Euodias, el sentido de “un buen viaje”, y al de Síntique el de “afortunada” o “afable”, y entiende que el ruego sugiere que las dos estaban en desacuerdo.Fuentes: el propio texto bíblico · Euodias · Syntyche
- Pablo recuerda a los filipenses que, cuando salió de Macedonia, ninguna otra iglesia se asoció con él en dar y recibir, y que aun en Tesalónica suplieron sus necesidades una y otra vez; ahora ha recibido sus dones de parte de Epafrodito. Macedonia era una provincia romana al norte de Grecia, y Tesalónica, a orillas del golfo Termaico, era la capital de uno de sus cuatro distritos y estaba gobernada por un pretor.Fuentes: el propio texto bíblico · Macedonia · Thessalonica
- Pablo nombra a Clemente, un cristiano de Filipos y colaborador suyo, entre aquellos cuyos nombres están en el Libro de la Vida. El Easton's Bible Dictionary (1897) recoge la opinión de escritores antiguos de que este Clemente era el Clemente de Roma, conocido en la historia posterior de la iglesia; la carta misma no hace esa identificación.Fuentes: el propio texto bíblico · Clement
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Macedonia · 41.600, 22.540 · versículo 15
- Thessalonica · Hoy: Thessaloniki · 40.638, 22.946 · versículo 16
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org