Números 3
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ịgụ ndị Livayị ọnụ
1Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Erọn na Mosis nʼoge Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị.
2Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, Nadab, ọkpara ya, Abihu, Elieza na Itama. 3Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Erọn, ndị e tere mmanụ ịbụ ndị nchụaja, ndị e doro nsọ nʼihi ije ozi dịka ndị nchụaja. 4Ma Onyenwe anyị mere ka Nadab na Abihu nwụọ, nʼihu ya nʼime ọzara Saịnaị, mgbe ha ji ọkụ na-adịghị nsọ wetara ya onyinye. Ebe ọ bụ na ha amụtaghị ụmụ ndị ikom nke aka ha, ọ bụ naanị Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja ogologo ụbọchị ndụ nna ha bụ Erọn.
5Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 6“Kpọkọtaa ebo Livayị niile were ha nyefee Erọn onye nchụaja nʼaka, ka ha bụrụ ndị inyeaka ya. 7Ha ga-ejere ya na nzukọ Izrel niile ozi nʼụlọ nzute ahụ site na ịrụ ọrụ metụtara ebe obibi ahụ. 8Ha ga-elekọta ngwongwo ụlọ nzute, rụọ ọrụ metụtara ndị Izrel niile mgbe ha na-eje ozi ha nʼebe obibi ahụ. 9Were ndị Livayị nyefee Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼaka. Ọ bụ ha ka a ga-esi nʼetiti ụmụ Izrel nyefee ha nʼaka kpamkpam. 10Họpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha bụrụ ndị na-eje ozi dịka ndị nchụaja. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ka a ga-egbu.”
11Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 12“Anarala m ndị Livayị dịka ndị nọchitere anya ụmụ ndị ikom mbụ niile a mụrụ nʼetiti ndị Izrel. Ndị Livayị niile bụ nke m. 13Nʼihi na ihe niile meghere akpanwa bụ nke m. Site nʼụbọchị ahụ m gburu ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt ka m doro ụmụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼetiti ndị Izrel nsọ nye onwe m, ma mmadụ, ma anụmanụ bụ nke m. Abụ m Onyenwe anyị.”
14Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼọzara Saịnaị sị ya, 15“Gụọ, chọpụta ihe ọnụọgụgụ ebo Livayị bụ. Gosi ikwu na ezinaụlọ onye ọbụla si nʼime ya pụta. Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom niile site nʼonye dị otu ọnwa.” 16Ya mere, Mosis gụrụ ha ọnụ dịka iwu ọ natara site nʼokwu Onyenwe anyị si dị.
17Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Livayị:
Geshọn, Kohat na Merari.
18Ndị a bụ aha ndị ikwu Geshọn dịka ezinaụlọ ha si dị:
Libni na Shimei.
19Ụmụ Kohat dịka ikwu ha si dị:
Amram, Izha, Hebrọn na Uziel.
20Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị:
Mahali na Mushi.
21Ndị Geshọn bụ ndị ikwu Libni na Shimei. Ndị a bụ ndị ikwu Geshọn.
22Ọnụọgụgụ ndị ikom dị otu ọnwa gbagoo dị puku asaa na narị ise (7,500).
23Ndị ikwu Geshọn mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼazụ ụlọ nzute.
24Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael.
25Ọrụ dịrị ụmụ Geshọn bụ ilekọta ụlọ nzute ahụ, na ụlọ ikwu ya, na ihe mkpuchi ya, na akwa mgbochi ọnụ ụzọ ụlọ nzute. 26Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a.
27Nke Kohat bụ ikwu ndị Aram, ndị Izha, ndị Hebrọn na ndị Uziel. Ndị a bụ ndị ikwu Kohat.
28Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii (8,600).
Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ.
29Ndị ikwu Kohat mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ndịda nke ebe nsọ.
30Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Kohat bụ Elizafan nwa Uziel.
31Ọrụ e tinyere ha nʼaka bụ ilekọta igbe ọgbụgba ndụ, tebul ahụ, ihe ịdọba oriọna ahụ na ebe ịchụ aja. Ihe ọzọ bụ ilekọta ngwongwo niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ, akwa mgbochi na ihe niile metụtara otu e si e ji ha eje ozi.
32Onyeisi ndị ndu nke ndị Livayị bụ Elieza nwa Erọn, onye nchụaja. Ọ bụ ya na-elekọta ndị ọrụ ha bụ ihu maka ihe niile metụtara ebe nsọ ahụ.
33Ndị Merari bụ ikwu Mahali na Mushi. Ndị a bụ ndị ikwu Merari.
34Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku isii na narị abụọ (6,200).
35Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Merari bụ Zuniel nwa Abihail.
Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ.
36Ọrụ e tinyere nʼaka ndị ikwu Merari bụ ilekọta mbudo niile nke ụlọ nzute ahụ, na mkpọrọ ya niile, ụkwụ ya niile, na ngwongwo niile e kwesiri iji rụọ ọrụ metụtara ha. 37Ọrụ ndị ọzọ bụ ilekọta ogidi osisi niile dị gburugburu ogige ahụ ha na ụkwụ ha, ǹtu na ụdọ ha niile.
38Mpaghara akụkụ ọwụwa anyanwụ nʼihu ụlọ nzute ahụ ka e debere maka ụlọ ikwu Mosis na Erọn, na nke ụmụ ya ndị ikom.
Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ ahụ nʼaha ụmụ Izrel niile.
Onye ọbụla ọzọ bịara ebe nsọ ahụ nso ka a ga-egbu.
39Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom Livayị niile Mosis na Erọn nwetara mgbe a gụrụ ha ọnụ nʼikwu nʼikwu dịka iwu Onyenwe anyị nyere ha si dị, bụ iri puku abụọ na puku abụọ (22,000). Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị site nʼotu ọnwa gaa nʼihu.
40Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gụọ ndị ikom Izrel niile e buru ụzọ mụọ, ndị dị site nʼotu ọnwa gbagoo. Chọpụta ọnụọgụgụ ha, dee aha ha niile nʼakwụkwọ. 41Nabata ndị Livayị ka ha bụrụ nke m nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụrụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ọzọkwa, anụ ụlọ ndị Livayị niile bụ nke m, nʼọnọdụ ụmụ mbụ nke anụ ụlọ niile a mụrụ nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel niile. Abụ m Onyenwe anyị.”
42Ya mere, Mosis gụrụ ndị ikom niile e buru ụzọ mụọ nʼIzrel, dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu, 43chọpụta na ọnụọgụgụ ndị ikom e buru ụzọ mụọ site nʼonye dị otu ọnwa ruo nʼokenye dị iri puku abụọ na puku abụọ na narị abụọ na iri asaa na atọ (22,273).
44Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị: 45“Nye m ndị Livayị nʼọnọdụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Nyekwa m anụ ụlọ ndị Livayị niile nʼọnọdụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ nʼIzrel. Ndị Livayị bụ nke m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 46Ihe a ga-eji gbara narị ụmụ ndị ikom Izrel abụọ na iri ndị ikom asaa, na atọ (273) ndị e buru ụzọ mụọ mapụtara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị 47bụ ego ruru shekel ise, na isi onye ọbụla, ụdị shekel ebe nsọ, nke ọtụtụ ya bụ iri gera abụọ. 48Were ego mgbapụta a nye Erọn na ụmụ ndị ikom ya.”
49Ya mere, Mosis natara ego mgbapụta ahụ nʼisi onye ọbụla dị nʼọnụọgụgụ ndị ahụ mara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị. 50Ego niile ọ natara site nʼaka ndị ikom Izrel niile e bụ ụzọ mụọ bụ ọlaọcha ruru puku shekel na narị shekel atọ na iri isii na ise (1,365), dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. 51Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ego mgbapụta ndị a dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

¿Sabías que…?
Los Levitas y los Primogénitos
- Los levitas fueron designados por Dios para asistir a Aarón y a sus hijos en el servicio del tabernáculo en lugar de todos los primogénitos varones de Israel, consagrados cuando Dios hirió a los primogénitos en Egipto. Dado que los primogénitos israelitas eran 22.273 y los levitas 22.000, se recaudó un precio de rescate de cinco siclos por cada uno de los 273 excedentes para entregarlo a los sacerdotes.Fuentes: el propio texto bíblico
- Los levitas se organizaron según los tres hijos de Leví: Gersón, Coat y Merari. Cada clan tenía un lugar asignado para acampar alrededor del tabernáculo y labores específicas: los gersonitas cuidaban las telas y cortinas, los coatitas transportaban el mobiliario sagrado como el arca y el candelabro, y los meraritas estaban a cargo de la estructura pesada de tablas, postes y basas.Fuentes: el propio texto bíblico · Gershon · Kohath · Merari
- Los dos hijos mayores de Aarón, Nadab y Abiú, habían muerto ante el Señor en el desierto de Sinaí al ofrecer fuego no autorizado, sin dejar descendencia. Por lo tanto, solo sus hijos menores, Eleazar e Itamar, ejercieron el sacerdocio durante la vida de Aarón, y Eleazar fue nombrado jefe de los líderes levitas.Fuentes: el propio texto bíblico · Aaron · Nadab
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Wilderness of Sinai · Hoy: about 50 km around Jebel Musa · 28.540, 33.973 · versículos 4, 14
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 13
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org