Números 27
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ụmụ ndị inyom Zelofehad
1Ụmụ ndị inyom Zelofehad nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase bụ ndị si nʼagbụrụ Manase nwa Josef. Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara, 2nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu Mosis, na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ Izrel niile kwuo sị, 3“Nna anyị Zelofehad nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere Kora, bụ ndị ahụ zukọtara megide Onyenwe anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke. 4Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.”
5Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu Onyenwe anyị. 6Ma Onyenwe anyị zaghachiri Mosis sị ya, 7“Ihe ụmụ Zelofehad na-ekwu ziri ezi. Ị ghaghị ikenye ha oke nʼetiti ụmụnne nna ha, ma nyefeekwa ha oke ruru nna ha.
8“Gwa ndị Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị. 9Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke. 10A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke. 11Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị Izrel niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu.’ ”
Joshua aghọọ onyendu
12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu Abarim site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọdan leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ Izrel anya. 13Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ. 14Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara Zin, mgbe ọgbakọ ụmụ Izrel sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri Meriba Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.)
15Mosis zara Onyenwe anyị sị ya, 16“Ka Onyenwe anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a. 17Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị Onyenwe anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.”
18Ya mere, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Kpọrọ Joshua, nwa Nun, onye nwere mmụọ Chineke nʼime ya, bikwasị ya aka gị. 19Mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha. 20Nyekwa ha ụfọdụ ikike gị, ka nzukọ niile nke ụmụ Izrel nwee ike rubere ya isi. 21Ma ya onwe ya ga-eguzo nʼihu Elieza onye nchụaja, onye ga-ajụrụ ya ase site na mkpebi Urim nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-apụ, site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-ana abata. Ma ya onwe ya, ma ndị Izrel niile, tinyekwara nzukọ niile.”
22Ya mere, Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. O duuru Joshua mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja na ọgbakọ niile. 23Mosis bikwasịrị aka ya abụọ nʼisi Joshua, rara ya nyefee maka ije ozi ahụ niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

¿Sabías que…?
Herencia y la sucesión del liderazgo
- Cuando las cinco hijas de Zelofejad —Mala, Noa, Hogla, Milca y Tirsa— solicitaron tierras debido a que su padre murió sin dejar hijos varones, se estableció un nuevo estatuto legal que permitía a las hijas heredar la porción familiar.Fuentes: Zelophehad · el propio texto bíblico
- Moisés recibió la instrucción de contemplar la tierra prometida desde los montes de Abarim antes de morir, desenlace anunciado debido a lo ocurrido en las aguas de Meriba, en Cades, en el desierto de Zin.Fuentes: Abarim · Meribah (of Kadesh) · Kadesh · el propio texto bíblico
- Para asegurar que la comunidad no quedara como ovejas sin pastor, Moisés impuso públicamente sus manos sobre Josué ante el sacerdote Eleazar y toda la congregación, comisionándolo formalmente como su sucesor.Fuentes: Joshua · Eleazar · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Abarim · 31.754, 35.715 · versículo 12
- Meribah · Hoy: Ain el Qudeirat · 30.648, 34.422 · versículo 14
- Zin · Hoy: Zin Desert · 30.971, 35.325 · versículo 14
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org