Nehemías 6
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Izuzu ọjọọ megide Nehemaya
1Mgbe a gwara Sanbalat, na Tobaya, na Geshem onye Arab, na ndị iro anyị ndị ọzọ na m ewuzichaala mgbidi ahụ, na ọ dịkwaghị ntipu fọdụrụ na ya, ọ bụ ezie na nʼoge ahụ, etinyebeghị m ibo nʼọnụ ụzọ ama ya niile, 2Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.”
Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ. 3Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?” 4Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ.
5Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa. 6Nke a bụ ihe e dere nʼime ya;
“Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha, 7na ị họpụtala ndị amụma ndị ga-ekwupụta na Jerusalem na ị bụ eze ndị Juda. Ugbu a, ozi a ga-eru ntị eze, ya mere, bịa ka mụ na gị kparịtaa ụka nʼetiti onwe anyị.”
8Ma eziri m ya ozi sị, “O nweghị eziokwu ọbụla dị nʼihe ị na-ekwu, nʼihi na ha bụ ihe i chepụtara nʼobi gị.”
9Nzube ha bụ ime ka ụjọ tụọ anyị. Ha na-echekwa sị, “Ha ga-ada mba nʼọrụ a ma hapụkwa ịrụcha ya.”
Ma akpọkuru m Chineke sị ya, “Biko gbaa aka m ume.”
10Otu ụbọchị, a gara m nʼụlọ Shemaya, nwa Delaya, nwa Mehetabel, onye e mechibidoro ụzọ nʼụlọ ya. Ọ sịrị m, “Ka anyị zukọta nʼụlọ Chineke, nʼime ụlọnsọ, ka anyị mechiekwa ụzọ niile nke ụlọnsọ ahụ, nʼihi na ndị ikom na-abịa igbu gị, e, nʼabalị ka ha na-abịa igbu gị.”
11Ma azara m si; “O kwesiri ka mụ onwe m bụ onyeisi ọchịchị gbaa ọsọ? O kwesiri ka mmadụ dịka m gbaa ọsọ gbaba nʼụlọnsọ Chineke ịzọpụta ndụ ya? Agaghị m aga.” 12Mgbe ahụ ka o doro m anya na Chineke agwaghị ya okwu ọbụla, kama na ọ bụ Tobaya na Sanbalat zụrụ ya. 13E goro ya ọrụ ka o yinye m egwu, ka m site na-ime otu a mehie, mgbe ahụ, ha ga-ahụ ihe ha ga-eji nye m aha ọjọọ, kwaa m emo.
14“Chineke m, cheta Tobaya na Sanbalat, nʼihi ihe ndị a niile ha mere, chetakwa Noadaya, bụ onye amụma nwanyị, na ndị amụma ndị ọzọ niile fọdụrụ, bụ ndị ahụ chọrọ ime ka m tụọ egwu.” 15E wuchara mgbidi ahụ nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Elul, nʼime iri ụbọchị ise na abụọ.
Ọgwụgwụ ọrụ
16Mgbe ndị iro anyị niile nụrụ ya, mba niile ndị nọ anyị gburugburu tụrụ ụjọ, obi jụkwara ha oyi, nʼihi na ha matara na-arụrụ ọrụ a site nʼinyeaka Chineke.
17Ọzọ, nʼụbọchị ndị ahụ ndị Juda a na-asọpụrụ na e zigara Tobaya ọtụtụ akwụkwọ ozi, akwụkwọ ozi Tobaya na-erutekwa ha aka. 18Nʼihi na ọtụtụ ndị Juda ṅụrụ iyi ịnọ ya nʼukwu, nʼihi na ọgọ ya nwoke nʼala Juda bụ Shekanaya nwa Ara. Ọzọkwa, Jehohanan nwa nwoke Tobaya na-alụ nwa nwanyị Meshulam, nwa Berekaya. 19Ha niile nọgidere na-agwa m otu Tobaya si bụrụ ezigbo mmadụ. Ma ha na-apụkwa gaa kọọrọ ya ihe niile m kwuru. Nʼihi ya Tobaya zitere ọtụtụ akwụkwọ ozi ime ka ụjọ tụọ m.

¿Sabías que…?
Conspiraciones y el Muro Terminado
- Sanbalat y Guesem invitaron repetidamente a Nehemías a reunirse en la llanura de Ono, una zona en el territorio de Benjamín a unos cincuenta kilómetros al noroeste de Jerusalén. Nehemías reconoció que esta invitación buscaba alejarlo de la ciudad para hacerle daño y frenar la reconstrucción.Fuentes: el propio texto bíblico · Ono · Sanballat · Geshem
- Los adversarios también sobornaron a figuras locales, como Semaías y la profetisa Noadías, para intimidar a Nehemías y hacer que se refugiara en el templo. Esconderse en el santuario para salvar su vida habría implicado violar normas sagradas y arruinar su reputación ante el pueblo.Fuentes: el propio texto bíblico · Shemaiah · Noadiah · Tobiah
- A pesar de la intimidación externa y de la lealtad dividida de nobles locales emparentados con Tobías, la reconstrucción del muro de Jerusalén se completó en cincuenta y dos días, el veinticinco de Elul.Fuentes: el propio texto bíblico · Tobiah
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Hakkephirim · Hoy: within 10 km of Kafr Ana · 32.027, 34.868 · versículo 2
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 7
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org