Nations Bible

Nehemías 10

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

1Ndị tinyere aka, nʼakwụkwọ ahụ bụ:

Onyeisi ọchịchị:

Nehemaya nwa Hakalaya.

Zedekaya, 2Ndị ọzọ bụ Seraya, Azaraya, Jeremaya,

3Pashua, Amaraya, Malkija,

4Hatush, Shebanaya, Maluk,

5Harim, Meremot, Ọbadaya,

6Daniel, Gineton, Baruk,

7Meshulam, Abija, Mijamin,

8Maazaya, Bilgai na Shemaya.

Ndị a bụ ndị nchụaja.

9Ndị Livayị so tinye aka ha nʼakwụkwọ bụ,

Jeshua nwa Azanaya, Binui otu nʼime ụmụ Henadad, Kadmiel,

10ndị so ha na-arụ ọrụ: Shebanaya,

Hodia, Kelita, Pelaia, Hanan,

11Mika, Rehob, Hashabaya

12Zakua, Sherebaya, Shebanaya,

13Hodia, Bani na Beninu.

14Ndịisi ọchịchị tinyere aka ha bụ,

Parosh, Pahat-Moab, Elam, Zatu, Bani,

15Buni, Azgad, Bebai,

16Adonaịja, Bigvai, Adin,

17Atea, Hezekaya, Azoa,

18Hodia, Hashum, Bezai,

19Harif, Anatot, Nebai,

20Magpịash, Meshulam, Hezia,

21Meshezabel, Zadọk, Jadua,

22Pelataya, Hanan, Anaia,

23Hoshea, Hananaya, Hashub,

24Halohesh, Pilha, Shobek,

25Rehum, Hashabna, Maaseia,

26Ahaya, Hanan, Anan,

27Maluk, Harim na Baana.

28“Ndị ọzọ fọdụrụ bụ ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị nche, ndị ọbụ abụ, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ndị ahụ niile sitere nʼirube isi nʼiwu Chineke wezuga onwe ha site nʼebe ndị mba ọzọ ahụ bi ha gburugburu nọ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị niile tozuru ịghọta ihe. 29Ndị a niile sooro ụmụnne ha ndị Izrel a na-asọpụrụ, jikọtaa onwe ha nʼọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi ịgbaso iwu Chineke, nke o nyere site nʼaka Mosis, bụ ohu Chineke; na ilezi anya rube isi nʼihe niile enyere nʼiwu, ntụziaka niile na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị.

30“Anyị kpebikwara na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom agaghị alụ di maọbụ nwunye site na mba ọzọ.

31“Anyị kpebikwara na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ eburu ngwa ahịa ha maọbụ mkpụrụ ubi ha bịa ire ya nʼụbọchị izuike, maọbụ nʼụbọchị ọzọ dị nsọ, anyị agaghị azụ ihe ọbụla. Anyị na-ekpebikwa na anyị agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼafọ nke asaa niile, kwekọọkwa na anyị ga-agbaghara ụmụnna anyị niile ji anyị ụgwọ nʼafọ ahụ.

32“Anyị kwekọrịtakwara na anyị ga-atụ ụtụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke otu shekel afọ niile maka iji kwadoo ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke, 33maka ime ka ihe ndị a dịrị nʼụlọnsọ ukwu ahụ: achịcha nsọ, onyinye ọka nke ụbọchị niile, aja nsure ọkụ na onyinye nke ụbọchị izuike, mmemme ọnwa ọhụrụ niile, ha na mmemme ndị ọzọ niile a kara aka, maka aja dị nsọ niile na aja ikpuchi mmehie ndị Izrel, maka ozi niile a na-aga nʼụlọnsọ Chineke anyị.

34“Anyị bụ ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị ọzọ, ejirila ife nza chọpụta mgbe ezinaụlọ ọbụla nʼetiti anyị ga-eji bubata nku nʼụlọ Chineke anyị nʼoge ya kwa afọ, maka ebe ịchụ aja nke Onyenwe anyị Chineke anyị dịka e dere ya nʼiwu.

35“Anyị kpebikwara na mmadụ niile nʼotu nʼotu ga na-ewebata mkpụrụ mbụ nke ihe ubi ya nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na mkpụrụ osisi ọbụla, maọbụ ihe ubi ndị ọzọ.

36“Dịka e dere ya nʼIwu, anyị ga-ewebata ụmụ ndị ikom mbụ anyị, na nwa mbụ nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ anyị niile, nʼụlọ Chineke anyị. A ga-enye ha ndị nchụaja na-eje ozi nʼebe ahụ.

37“Karịsịa, anyị ga-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ Chineke anyị, nyekwa ha ndị nchụaja, ụtụ ọka mbụ anyị kwọrọ, ya na onyinye ndị ọzọ nke mkpụrụ ubi mbụ anyị, dịka mmanya vaịnị mbụ, mmanụ oliv mbụ na mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Anyị kpebikwara inye ndị Livayị otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile anyị nwetara nʼubi anyị, nʼihi na ọ bụ ọrụ ndị Livayị ịnakọta otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼobodo niile ebe anyị na-arụ ọrụ. 38Ndị nchụaja bụ ụmụ ụmụ Erọn ga-eso ndị Livayị mgbe ha na-anakọta onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ndị a. Ha ga-ewekọta ihe ndị a niile webaa ha nʼụlọ Chineke anyị, ruo nʼime ọnụụlọ ịchịkọba ihe, nke ụlọakụ. 39Ndị Izrel na ndị Livayị, kwesiri iweta onyinye ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv nʼime ụlọ ịchịkọba ihe, nʼebe a na-edebe ngwongwo niile e ji eje ozi nʼụlọ ukwu ahụ, nke ndị nchụaja na-eje ozi, ndị nche na nke ndị ọbụ abụ.

“Anyị agaghị agbakụtakwa ụlọ Chineke anyị azụ.”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

El sellado del pacto

  • El gobernador Nehemías, junto con sacerdotes, levitas y líderes de la comunidad, puso su sello en un documento formal comprometiéndose a obedecer la Ley de Moisés. El resto del pueblo, incluidos hombres, mujeres y todos los hijos con entendimiento, ratificó el compromiso con un juramento solemne.Fuentes: el propio texto bíblico · Nehemiah
  • La comunidad se comprometió de manera específica a guardar el sábado, negándose a comprar mercancías o grano de los pueblos vecinos en días sagrados. También acordaron dejar descansar la tierra y condonar deudas cada siete años, además de evitar matrimonios con los pueblos circundantes.Fuentes: el propio texto bíblico
  • Para asegurar el sostenimiento del templo, el pueblo instituyó una contribución anual de un tercio de siclo y echó suertes para suministrar leña para el altar. También se comprometieron a llevar los diezmos y las primicias de sus cosechas, rebaños y masas para el sustento de los sacerdotes y levitas.Fuentes: el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.