Marcos 8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Jisọs enye puku mmadụ anọ nri
1Nʼoge ahụ, igwe mmadụ ọzọ zukọrọ. Ebe ha na-enweghị ihe ha ga-eri, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, 2“Enwere m ọmịiko nʼebe igwe mmadụ ndị a nọ. Nke a na-eme ya ụbọchị atọ anyị na ha nọ. Ugbu a, ha enweghị ihe ha ga-eri. 3Ọ bụrụ na m ezilaga ha nʼụlọ ha, ụfọdụ nʼime ha ga-ada nʼụzọ nʼihi agụụ. Nʼihi na ụfọdụ ha si nʼebe dị anya bịa.”
4Ndị na-eso ụzọ ya zara ya, “Ebee ka mmadụ ga-achọta achịcha ga-ezuru ndị a nʼime ọzara a?”
5Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?”
Ha zara sị, “Asaa.”
6Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ. 7Ha nwekwara azụ ole na ole. O weere ya kpee ekpere, ọ gwara ha ka ha kesaakwa ya. 8Ha riri, rijuo afọ. Ha tụtụkọtara iberibe achịcha dafuru nʼebe ndị a nọ rie nri. Ha tụtụjuru nkata asaa. 9Ndị riri nri a ruru ihe dịka puku mmadụ anọ. Mgbe ahụ o zilagara ha. 10Ngwangwa, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼakụkụ obodo Dalmanuta.
11Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya. 12Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.” 13Ọ hapụrụ ha nʼebe ahụ banyekwa nʼụgbọ mmiri ọzọ, ịgafe nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.
Ihe na-eko achịcha nke ndị Farisii na Herọd
14Ndị na-eso ụzọ ya chefuru iwere achịcha. Ọ bụ naanị otu ogbe achịcha fọdụụrụ ha nʼime ụgbọ. 15Ọ dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya. Lepụnụ anya maka ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke Herọd.”
16Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụ nʼihi na anyị enweghị achịcha.”
17Mgbe Jisọs ghọtara isi mkparịta ụka ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu maka enweghị achịcha? Ọ pụtara na unu adịghị ahụ maọbụ aghọta? Obi unu o siri ike? 18Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta? 19Mgbe m ji ogbe achịcha ise zụọ puku mmadụ ise, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?”
Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.”
20“Mgbe m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?”
Ha zara sị ya, “Nkata asaa.”
21Ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-enweghị nghọta?”
Jisọs agwọọ onye ìsì na Betsaida
22Mgbe ha ruru Betsaida, ụfọdụ mmadụ kpọtaara ya otu onye ìsì rịọọ ya ka o metụ ya aka, 23Ọ duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, ọ gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. Ọ jụrụ ya sị, “Ị na-ahụ ihe ọbụla?”
24Nwoke ahụ leliri anya elu ma sị, “Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha dị ka osisi na-agagharị agagharị.”
25Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara ya aka nʼanya, mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe niile nke ọma. 26Ọ zilagara ya ụlọ ya sị ya, “Abanyekwala nʼime obodo.”
Ọgbụgba ama Pita banyere Kraịst
27Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nʼobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipai. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”
28Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọkwa sị na ị bụ Ịlaịja maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
29Ma ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”
Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst ahụ.”
30Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya.
Jisọs ekwuo okwu ọnwụ ya
31Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị. 32Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ ya pụọ nʼotu akụkụ, bido ịbara ya mba.
33Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.”
Ihe ọ ga-efu iso Jisọs
34Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ. 35Nʼihi na onye na-azọ ndụ ya ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla gụrụ ndụ ya dị ka ihe furu efu nʼihi m, na nʼihi oziọma m, ga-azọpụta ya. 36Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, iritecha ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ha? 37Ọ dị ihe ọzọ dị nʼụwa mmadụ nwere ike iji gbanwere ndụ ya? 38Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọbụla nʼihi m na nʼihi okwu m nʼụwa ọjọọ a, na nʼụwa mmehie a, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke Mmadụ, mgbe ọ ga-abịaghachi nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”

¿Sabías que…?
Ver quién es Jesús
- Después de que unos cuatro mil hombres comieron y se recogieron siete cestas de pedazos, Jesús entró en la barca con sus discípulos y fue a la región de Dalmanuta, un nombre que aparece solo en este capítulo. Era un lugar en el lado oeste del mar de Galilea, cerca de Magdala. En el pasaje paralelo de Mateo, él llega a los límites de Magdala, que probablemente era el nombre griego de una de las torres de vigilancia de la orilla occidental del lago.Fuentes: el propio texto bíblico · Dalmanutha
- En Betsaida, algunas personas trajeron a un ciego, y Jesús lo llevó de la mano fuera de la aldea, le escupió en los ojos y le puso las manos encima. Al principio, el hombre veía a la gente como árboles que caminaban; solo cuando Jesús volvió a poner las manos sobre los ojos del hombre se le restauró la vista por completo. La ciudad se describe en el lado este del lago, a unas dos millas subiendo el Jordán, en Gaulanítide; Felipe el tetrarca la amplió y la llamó Julias, por la hija del emperador, aunque algunos han supuesto que había una sola Betsaida, edificada a ambos lados del lago, cerca de donde el Jordán entra en él.Fuentes: el propio texto bíblico · Bethsaida
- Jesús y sus discípulos siguieron hacia las aldeas de alrededor de Cesarea de Filipo, ciudad situada unas veinte millas al norte del mar de Galilea, junto a la base del monte Hermón, en el nacimiento superior del Jordán, y descrita como el límite norte de su ministerio público. Según algunos, antes había sido Baal-Gad o Baal-Hermón, un santuario cananeo de Baal, y después se llamó Panio o Paneas, por una caverna profunda llena de agua cerca de la ciudad. Allí Pedro dijo: "Tú eres el Cristo"; y cuando reprendió a Jesús por enseñar que el Hijo del Hombre debía sufrir muchas cosas, ser muerto y resucitar después de tres días, Jesús respondió: "Ponte detrás de mí, Satanás", nombre que significa adversario o acusador.Fuentes: el propio texto bíblico · Caesarea Philippi · Satan
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Caesarea Philippi · Hoy: Banias · 33.246, 35.693 · versículo 27
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículo 27
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org