Nations Bible

Marcos 13

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Amụma banyere mmebi nke ụlọnsọ ukwu

1Mgbe o sitere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-apụ, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya siri ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ a si maa mma. Lee ụdị nkume buru ibu e ji wuo ha.”

2Jisọs zara ha, “Ị hụrụ ụlọ ukwu ndị a? Oge na-abịa mgbe ọ na-adịghị nkume ga-atụkwasị nʼelu ibe ya, nʼihi na a ga-ala ha niile nʼiyi.”

3Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, na ncherita ihu ụlọnsọ ukwu, Pita na Jemis, na Jọn na Andru bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, 4“Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama izi na o ruola mgbe ha niile ga-emezu?”

Mmalite nke ahụhụ

5Jisọs malitere ịgwa ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu. 6Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m sị, ‘Abụ m ya.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. 7Mgbe unu nụrụ maka agha na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu. Ihe ndị a aghaghị ime ma oge ọgwụgwụ ihe niile erubeghị. 8Mba ga-ebili megide mba ibe ya. Alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ibe ya. Ala ọma jijiji na ụnwụ ga-adị nʼebe dị iche iche. Ihe ndị a bụ mmalite nke oke ihe mgbu.

9“Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha. 10Aghaghị ibu ụzọ kwusaa oziọma a nye mba niile. 11Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nʼụlọikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu, kwuonụ naanị ihe batara unu nʼọnụ unu ikwu nʼoge ahụ. Nʼihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nʼọnụ unu kwuo okwu.

12“Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya. Nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha. 13Mmadụ niile ga-akpọ unu asị nʼihi m, ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.

14“Mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-eweta mbibi ka ọ na-eguzo nʼebe ọ na-ekwesighị (onye na-agụ ya nwee nghọta), mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judịa were ọsọ gbalaga nʼelu ugwu 15Onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ ya ghara ịrịdata maọbụ baa nʼime ụlọ ya iwepụta ihe ọbụla. 16Ka onye ọbụla nọ nʼubi ghara ịlọghachi ịchịrị uwe ya. 17Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ. 18Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nʼoge oke oyi. 19Nʼihi na oke mkpagbu nke ụbọchị ahụ ga-abụ nke na-adịbeghị na mbụ site na mgbe Chineke kere ụwa ruo ugbu a. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.

20“Ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ, ọ dịghị onye a ga-azọpụta. Ma nʼihi ndị ya, ndị ọ họpụtara, o meela ka ụbọchị ndị ahụ dị mkpụmkpụ. 21Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 22Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. 23Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị.

Ọbịbịa Onye nke nzọpụta

24“Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ,

“ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,

ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya;

25kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada,

ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’

26“Nʼoge ahụ, ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ, ka ọ na-abịa nʼigwe ojii nʼoke ike na ebube. 27Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe.

Ihe mmụta site nʼosisi fiig

28“Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso. 29Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ. 30Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. 31Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide.

Mmadụ ọbụla amaghị oge ahụ

32“Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya. 33Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya! 34Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche.

35“Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ. 36Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nʼụra. 37Ihe m gwara unu ka m na-agwakwa mmadụ niile. ‘Nọrọnụ na nche.’ ”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

La caída del templo y el llamado a velar

  • Cuando Jesús salía del templo, un discípulo señaló las magníficas piedras y edificios, y Jesús dijo que no quedaría piedra sobre piedra; todas serían derribadas. Estaba sentado en el monte de los Olivos, frente al templo. El monte de los Olivos es una sierra al este de Jerusalén, llamada así por los olivos que cubren sus laderas y separada de la ciudad por el valle de Cedrón.Fuentes: el propio texto bíblico · Mount of Olives
  • Pedro, Santiago, Juan y Andrés preguntaron a Jesús en privado cuándo serían derribados los grandes edificios y qué señal mostraría que eso estaba a punto de cumplirse. Andrés era el hermano menor de Pedro; ambos eran pescadores de Betsaida. Santiago, hermano mayor de Juan e hijo de Zebedeo y Salomé, era pescador en sociedad con Pedro.Fuentes: el propio texto bíblico · Simon Peter · Andrew · James (Son of Zebedee)
  • Jesús dijo que, cuando se viera la abominación de la desolación de pie donde no debía estar, los que estuvieran en Judea debían huir a los montes: nadie en la azotea debía volver a entrar a buscar algo, y nadie en el campo debía regresar por su manto. En el tiempo de Cristo, Judea era la más meridional de las tres divisiones de Palestina, distinta de Galilea y Samaria; bajo los romanos formaba parte de la provincia de Siria e incluía los territorios de Judá, Benjamín, Dan, Simeón y parte de Efraín.Fuentes: el propio texto bíblico · Judea

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Mount of Olives · 31.778, 35.246 · versículo 3
  • Judea · Hoy: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículo 14

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.