Mateo 22
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ilu banyere oriri ọlụlụ nwunye
1Jisọs gwara ha okwu ọzọ nʼilu sị, 2“Alaeze eluigwe dị ka otu eze, nke kwadoro oke oriri ọlụlụ di na nwunye, nʼihi nwa ya nwoke. 3O zipụrụ ndị ohu ya ka ha gaa chetara ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa. Ma ha niile achọghị ịbịa.
4“O zipụkwara ndị ohu ya ọzọ na-ejere ya ozi ka ha gaa gwa ndị ahụ a kpọrọ oriri sị, ‘E dozichaala ihe oriri ugbu a, egburu m oke ehi, na anụ ọzọ gbara abụba. Edoziela ihe niile. Bịanụ nʼoriri ọlụlụ di na nwunye.’
5“Ma ndị ahụ niile a kpọrọ oriri gawaara mkpa ha nʼihi na ha akpọghị ya ihe ọbụla. Otu onye gara nʼala ubi ya, nke ọzọ nʼụlọ ahịa ya. 6Ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbukwaa ha. 7Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ.
8“Mgbe ahụ ọ gwara ndị ohu ya sị, ‘E doziela m oriri ọlụlụ di na nwunye, ma ndị a kpọrọ oku ekwesighị ekwesi. 9Ugbu a, gaanụ nʼakụkụ ụzọ niile, kpọbatanụ ndị niile unu hụrụ, ka ha bịa nʼoriri ọlụlụ di na nwunye a.’ 10Ndị ohu ahụ pụrụ gaa nʼokporoụzọ niile kpọbata mmadụ niile ha hụrụ. Ha kpọbatara ndị bụ ezi mmadụ na ndị bụ ajọ mmadụ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ.
11“Ma mgbe eze ahụ batara ileta ndị niile nọ na nri, ọ hụrụ otu nwoke nke na-eyighị uwe ọlụlụ nwunye. 12Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, ‘Enyi m, i si aṅaa bata nʼebe a mgbe ị na-eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ O mechiri ọnụ ya nʼihi na o nweghị ihe ọ ga-asa.
13“Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
14“Nʼihi na akpọrọ ọtụtụ mmadụ oku, maọbụ mmadụ ole na ole ka a họọrọ.”
Ịtụ ụtụ nye Siza
15Mgbe ahụ ndị Farisii zukọtara na-achọ ụzọ ha ga-esi mee ka o kwuhie ọnụ ka ha site na ya jide ya. 16Ha zigara ndị na-eso ụzọ ha na ndị nʼotu Herọd ka ha jụọ ya sị, “Onye ozizi, anyị maara nke ọma na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke nʼeziokwu. Ị dịghị asọkwa onye ọbụla anya, nʼihi na ị dịghị ele mmadụ anya nʼihu nʼagbanyeghị ndị ha bụ. 17Ugbu a gwa anyị, gịnị bụ uche gị? O ziri ezi nʼiwu ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?”
18Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nʼobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa? 19Gosinụ m ego e ji akwụ ụgwọ ụtụ.” Ha wetaara ya otu mkpụrụ ego. 20Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka e sekwasịrị onyinyo ya nʼelu ego a? Aha onye kwa dị nʼokpuru onyinyo a?”
21Ha zara sị ya, “Ọ bụ nke Siza.”
Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma. Nyenụ Siza ihe ruuru Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.”
22Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbagwojuru ha anya, nʼihi ya, ha hapụrụ ya pụọ.
Ọlụlụ nwunye na mbilite nʼọnwụ
23Nʼụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya ịghụ ya ọnụ. 24Onye ozizi, “Mosis kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ, ka ọ mụtara nwanne ya nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwa. 25Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa nʼetiti anyị. Onye nke mbụ lụrụ nwunye, nwụọ, ma ebe ọ dịghị ụmụ ọ mụtara, ọ hapụrụ nwanne ya nwunye ya. 26Otu a ka nke abụọ mekwara, ma nke atọ, ruo na nke asaa. 27Nʼikpeazụ, nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 28Ugbu a, nʼoge mbilite nʼọnwụ, nwunye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a lụtụchara ya mgbe ọ nọ nʼụwa?”
29Jisọs zara ha sị, “Unu na-ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu. Unu aghọtakwaghị ụdị ike Chineke nwere. 30Nʼihi na mbilite nʼọnwụ, ịlụ di na nwunye agaghị adịkwa, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nʼeluigwe. 31Ma nʼihe banyere mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ọ bụ na unu agụtabeghị ihe Chineke gwara unu sị, 32Mụ onwe m bụ Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.”
33Mgbe igwe mmadụ ahụ nụrụ nke a, ozizi ya juru ha anya.
Iwu kachasị mkpa
34Ma mgbe ndị Farisii nụrụ na ọ emeela ka ndị Sadusii mechie ọnụ ha, ha gbakọtara otu ebe. 35Otu onye nʼime ha, bụ onye ozizi iwu bịara jụọ ya ajụjụ iji nwaa ya: 36“Onye ozizi, olee iwu nke kachasị mkpa nʼime iwu niile?”
37Ọ zara sị ya, “ ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nʼanya site nʼobi gị niile na site na mkpụrụobi gị niile, na site nʼuche gị niile.’ 38Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu niile. 39Iwu ọzọ na-eso nke a nʼịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbataobi gị nʼanya dị ka i si hụ onwe gị nʼanya.’ 40Iwu ndị ọzọ niile na ihe niile ndị amụma kwuru dabeere nʼebe iwu abụọ ndị a nọ.”
Ajụjụ Jisọs jụrụ ndị Farisii
41Mgbe ndị Farisii gbakọrọ nʼotu ebe, Jisọs jụrụ ha, 42“Gịnị ka unu na-eche banyere Kraịst? Nwa onye ka ọ bụ?”
Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devid.”
43Ọ sịrị ha, “Gịnị mekwaranụ Devid site na ntụziaka nke Mmụọ Nsọ jiri kpọọ ya ‘Onyenwe m’? Nʼihi na ọ sịrị,
44“ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị ya,
“Nọdụ ala nʼaka nri m
ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị
nʼokpuru ụkwụ gị abụọ.” ’
45Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị,’ oleekwanụ otu o si bụrụkwa nwa ya?” 46Ọ dịghị onye pụrụ ịsa ya okwu. Sitekwa nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị onye ọbụla nwere anya ike ịjụ ya ajụjụ ọzọ.

¿Sabías que…?
Un banquete y un día de preguntas
- Los desafíos de este capítulo ocurren todos en un mismo día: fariseos y herodianos preguntan si es lícito pagar impuestos al César, saduceos que dicen que no hay resurrección cuentan el caso de siete hermanos y una viuda, y un experto en la Ley pregunta cuál es el mandamiento mayor. Una lista del episodio lo llama Debates en el Templo y le asigna una duración de un día; el relato añade que desde ese día nadie se atrevió a interrogar más a Jesús.Fuentes: el propio texto bíblico · Debates in the Temple
- Al responder a los saduceos, Jesús cita las palabras “Yo soy el Dios de Abraham, el Dios de Isaac y el Dios de Jacob” y dice que Dios no es Dios de muertos, sino de vivos. Un diccionario bíblico llama a Abraham, hijo de Taré, padre de una multitud; describe a Isaac como el único hijo de Abraham y Sara y el más longevo de los tres patriarcas; e identifica a Jacob, también llamado Israel, como el menor de los hijos gemelos de Isaac y Rebeca.Fuentes: el propio texto bíblico · Abraham · Isaac · Jacob (Israel)
- Al preguntárseles de quién es hijo el Cristo, los fariseos responden que de David. Una entrada de diccionario explica el nombre David como Amado y lo identifica como el octavo y más joven hijo de Isaí, ciudadano de Belén. Jesús pregunta entonces cómo David, hablando en el Espíritu, puede llamar Señor al Cristo, y nadie logra responder.Fuentes: el propio texto bíblico · David
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org