Lucas 7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Okwukwe onye ọchịagha
1Mgbe o kwusiri okwu ndị a nye ndị na-ege ya ntị, ọ banyere na Kapanọm. 2Ma e nwere otu ọchịagha nke nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nʼanya. Onye nọ nʼọrịa na nʼọnụ ọnwụ. 3Mgbe ọ nụrụ ihe banyere Jisọs, o zipụrụ ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọrọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya. 4Mgbe ha bịakwutere Jisọs, ha rịọsiri ya arịrịọ ike sị, “O kwesiri ka i mere ya ihe a. 5Nʼihi na ọ hụrụ obodo anyị nʼanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.” 6Jisọs sooro ha gawa.
Ma mgbe ọ nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, “Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. 7Ọ bụ ya mere na-echeghị m na m toruru ịpụta bịa zute gị. Ma kwuo okwu, ọ ga-agwọkwa odibo m. 8Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a ‘gaa,’ ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ ‘bịa,’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a,’ ọ na-emekwa ya.”
9Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị, “Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ọ bụladị nʼIzrel.” 10Mgbe ndị ozi ahụ laghachiri nʼụlọ, ha chọpụtara na ahụ adịla ohu ahụ mma.
Jisọs akpọlite nwa nwoke nwanyị di ya nwụrụ
11O ruo mgbe nwa oge gasịrị, ọ gara nʼobodo a na-akpọ Nain. Ndị na-eso ụzọ ya na ọtụtụ igwe mmadụ ndị ọzọ sooro ya gaa. 12Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya. 13Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meere ya obi ebere ma sị ya, “Ebela akwa.”
14Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!” 15Nwoke ahụ nwụrụ anwụ biliri, nọdụ ala, bido ikwu okwu, ọ kpọnyere ya nne ya.
16Egwu tụrụ ha niile, ha tokwara Chineke sị, “Onye amụma dị ukwuu apụtala nʼetiti anyị, Chineke abịala inyere ndị ya aka!” 17Akụkọ a banyere ya ruru Judịa niile na obodo nta niile gbara ya gburugburu.
Jisọs na Jọn omee baptizim
18Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya maka ihe ndị a niile. Jọn kpọrọ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, 19zie ha ka ha jekwuru Onyenwe anyị jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa. Ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?”
20Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị, “Jọn omee baptizim ziri anyị ka anyị jụọ gị sị, ‘Ọ bụ gị bụ onye ahụ ga-abịa ka anyị ga-ele anya ọbịbịa onye ọzọ?’ ”
21Mgbe ahụ ọ gwọrọ ọtụtụ ndị nwere ọrịa, na nrịa nrịa dị iche iche, na mmụọ ọjọọ. O mekwara ka ọtụtụ ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ. 22Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma. 23Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-enweghị ihe mkpasu iwe nʼihi m.”
24Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn pụrụ, Jisọs bidoro ịgwa igwe mmadụ ahụ okwu banyere Jọn sị, “Gịnị ka unu gara nʼọzara ịhụ? Ọ bụ ahịhịa achara nke ikuku na-ebugharị? 25Ma gịnị ka unu pụrụ ịga ịhụ? Ọ bụ nwoke yi uwe mara mma? E e, ndị na-eyi uwe dị oke ọnụahịa, ndị na-ebikwa nʼoke oriri na oke ọṅụṅụ bi nʼụlọeze. 26Ma gịnị ka unu pụrụ ka unu ga-ahụ? Ọ bụ onye amụma? E, ana m a gwa unu, unu hụrụ onye karịrị onye amụma. 27Ọ bụ onye a bụ onye ahụ e dere ihe banyere ya sị,
“ ‘Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị,
onye ga-edozi ụzọ gị nʼihu gị.’
28Agwa m unu, nʼetiti ndị nwanyị mụrụ, ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Jọn, ma onye dịkarịsịrị nta nʼalaeze Chineke dị ukwuu karịa ya.”
29(Ndị mmadụ niile nụrụ nke a, tinyekwara ndị ọna ụtụ, nabatara nʼụzọ Chineke bụ nke ziri ezi, nʼihi na Jọn emela ha baptizim. 30Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ imezu ebumnobi Chineke nye ha onwe ha, nʼihi na ha anabataghị ka Jọn mee ha baptizim.)
31Ọ gara nʼihu sị ha, “Ma gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nʼọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? 32Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị,
“ ‘Anyị gburu unu ọja,
ma unu adịghị ete egwu.
Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu,
ma unu ebeghị akwa.’
33Nʼihi na Jọn omee baptizim bịara na-erighị achịcha maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ma unu sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’ 34Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ma unu sịrị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ 35Ma e sitela nʼụmụ ya niile nwapụta amamihe nʼonye ziri ezi.”
Nwanyị onye mmehie etee Jisọs mmanụ
36Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri. 37Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ. 38Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha.
39Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri hụrụ ihe nke a, o kwuru nʼobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, na ọ bụ onye mmehie.”
40Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.”
Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.”
41“Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise. 42Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?”
43Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.”
Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.”
44Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha. 45Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ. 46Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ. 47Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.”
48Mgbe ahụ ọ gwara ya sị, “A gbagharala gị mmehie gị.”
49Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?”
50Ọ sịrị nwanyị ahụ, “Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.”

¿Sabías que…?
Fe, compasión y la pregunta de un profeta
- El Easton's Bible Dictionary (1897) describe Capernaúm como una ciudad de Galilea que no se menciona en el Antiguo Testamento y que llegó a ser la ciudad que Jesús trataba como suya después de ser expulsado de Nazaret, escenario de muchos episodios de su vida. En este capítulo llega allí y encuentra al siervo muy estimado de un centurión a punto de morir; unos ancianos judíos ruegan, diciendo que el oficial ama a su nación y ha construido su sinagoga.Fuentes: Capernaum · el propio texto bíblico
- El Easton's Bible Dictionary (1897) relaciona el nombre Naín con una palabra hebrea que significa pastos verdes o hermoso, e identifica el pueblo con la aldea de Nein, en la ladera noroeste del Jebel ed-Duhy, llamado también la colina de Moré o el Pequeño Hermón, a unas cuatro millas de Tabor y veinticinco millas al suroeste de Capernaúm, sobre la llanura de Esdraelón. A la puerta del pueblo, Jesús se encontró con el funeral del hijo único de una viuda, y el asombro se extendió por la multitud.Fuentes: Nain · el propio texto bíblico
- Juan el Bautista es presentado como el precursor del Señor y como hombre de linaje sacerdotal: su padre, Zacarías, era sacerdote del turno de Abías, y su madre, Elisabet, era una de las hijas de Aarón. Su misión se describe como objeto de profecía, y en este capítulo Jesús dice a las multitudes que Juan es más que un profeta, el mensajero enviado por delante para preparar el camino, mientras los discípulos de Juan preguntan si Jesús es el que había de venir.Fuentes: John the Baptist · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Nain · Hoy: Nein · 32.631, 35.350 · versículo 11
- Judea · Hoy: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículo 17
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org