Nations Bible

Lucas 19

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Zakịọs ezute Jisọs

1Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe. 2Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya. 3Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ. 4Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ.

5Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.” 6Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya.

7Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, “Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie.”

8Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.”

9Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham. 10Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.”

Ilu banyere mkpụrụ ego iri

11Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe. 12Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa. 13Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’

14“Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’

15“Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru.

16“Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’

17“Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’

18“Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’

19“Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’

20“Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya. 21Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’

22“Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị? 23Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’

24“Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’

25“Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’

26“Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. 27Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’ ”

Jisọs abata Jerusalem

28Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem. 29Mgbe ọ na-abịaru Betfeji na Betani nso, nʼUgwu a na-akpọ Oliv, Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, 30sị, “Gaanụ nʼime obodo nta ahụ dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kenyere nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-anọkwasịbeghi nʼelu ya, tọpụnụ ya, kpụtara m ya. 31Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ unu, ‘Gịnị mere unu ji atọpụ ya?’ Gwanụ onye ahụ sị, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.’ ”

32Ndị ahụ o zipụrụ gara hụ ya dị ka ọ gwara ha. 33Mgbe ha bidoro ịtọpụ ya, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ nwa ịnyịnya ahụ?”

34Ha sịrị, “Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.”

35Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, nyere Jisọs aka ka ọ rigoro nʼelu ya. 36Dị ka ọ na-aga, ndị mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ.

37Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ, 38na-asị,

“Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.”

“Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu.”

39Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!”

40Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.”

41Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya, 42sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị. 43Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị. 44Ha ga-egwepịa gị nʼala, gị na ụmụ gị nọ nʼime mgbidi a, ọ dịkwaghị nkume ọbụla ha ga-ahapụ nʼelu ibe ya, nʼihi na ị mataghị oge nleta Chineke nye gị.”

Jisọs nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke

45Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ukwu bido ịchụpụ ndị nọ ebe ahụ na-ere ahịa. 46Ọ sị ha, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ ‘na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere’; ma unu emeela ya ‘ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike.’ ”

47Ụbọchị niile, ọ na-anọ na-akụzi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị ndu nʼetiti ndị mmadụ, nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. 48Ma ha achọtaghị ụzọ ọbụla ime ya, nʼihi na mmadụ niile sogidere ya kwenyekwara nʼokwu ya.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

De Jericó a Jerusalén

  • Zaqueo, jefe de los recaudadores de impuestos y hombre muy rico, es descrito como superintendente de aduanas en Jericó. La ciudad producía y exportaba entonces una cantidad considerable de bálsamo, de modo que el puesto de aduanas era importante y explicaría su riqueza. Jericó, “lugar de fragancia”, era una ciudad amurallada en un vasto bosque de palmeras en la llanura del Jordán, a unas cinco millas al oeste del río.Fuentes: Zacchaeus · Jericho · el propio texto bíblico
  • Al subir desde Jericó, Jesús se acercó a Betfagé y Betania, en el monte de los Olivos, en el camino entre las dos ciudades. Betania, a unas dos millas al este de Jerusalén, en la ladera sureste de la sierra, debía su nombre a las muchas palmeras que crecían allí; Betfagé, “casa del higo verde”, estaba cerca y marcaba el límite de un camino de sábado desde Jerusalén, dos mil codos. El monte de los Olivos toma su nombre de los olivos de sus laderas y se alza al este de Jerusalén, al otro lado del valle de Cedrón.Fuentes: Bethphage · Bethany · Mount of Olives · el propio texto bíblico
  • Al acercarse y ver la ciudad, Jesús lloró y lamentó que Jerusalén no hubiera conocido, aquel día, lo que le traería paz. El nombre se explica como “posesión de paz” o “fundamento de paz”; en el original tiene forma dual, probablemente en referencia a los dos montes sobre los que fue edificada la ciudad, Sion y Moria, o, como algunos suponen, a la ciudad alta y la ciudad baja. Se la describe como una ciudad de montaña entronizada en una fortaleza montañosa.Fuentes: Jerusalem · el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Jericho · Hoy: Tell el Alayiq · 31.852, 35.436 · versículo 1
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 11, 28, 41
  • Mount of Olives · 31.778, 35.246 · versículos 29, 37

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.