Nations Bible

Lucas 14

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Jisọs agaa nʼụlọ onye Farisii

1Otu ụbọchị izuike, mgbe ọ gara iri ihe nʼụlọ otu onyendu ndị Farisii, ha nọ na-ele ya anya nke ọma. 2Ma lee, otu nwoke ahụ ya zara aza nọkwa nʼihu ya ebe ahụ. 3Jisọs jụrụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu sị, “O ziri ezi nʼiwu ịgwọ ọrịa nʼụbọchị izuike ka ọ bụ na o zighị?” 4Ma ha e kwughị okwu ọbụla. Ya mere ọ kpọrọ ya, gwọọ ya ma sị ya laa.

5Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na otu nʼime unu nwere nwa nwoke maọbụ oke ehi nke dabara nʼime olulu mmiri nʼụbọchị izuike, ọ bụ na ọ gaghị eme ngwangwa dọpụta ya?” 6Ma ha enweghị ike ịza ajụjụ a.

7Mgbe ọ hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri si họrọ naanị oche ndị a na-asọpụrụ, oche ndị a na-asọpụrụ, ọ tụrụ ha ilu sị, 8“Mgbe mmadụ ọbụla kpọrọ gị oriri nʼọlụlụ di na nwunye, abatala nọdụ nʼoche ndị a na-asọpụrụ, nʼihi na eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara onye ka gị nwe nsọpụrụ. 9Nʼihi na onye ahụ kpọrọ unu oriri nwere ike bịakwute gị sị gị, nye nwoke a ọnọdụ gị. Mgbe ahụ, ị ga-ebili nʼanya ihere gaa nọdụ nʼoche dịkarịsịrị ala. 10Ma mgbe a kpọrọ gị, nọdụ nʼoche dị ala, ka ọ ga-abụ na onye kpọrọ gị oriri bịa, ọ ga-asị gị ‘Enyi m, rigota nʼebe a ka elu.’ Mgbe ahụ, ị ga-enwekwa ugwu nʼanya ndị niile a kpọrọ gị na ha oriri. 11Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nʼala, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”

12Ọ gwara onye ahụ kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ị na-akpọ oriri nke nri ehihie maọbụ nke nri anyasị, akpọla naanị ndị enyi gị maọbụ ụmụnne gị ndị nwoke maọbụ ndị ikwu na ibe gị, maọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, nʼihi ma eleghị anya, ha pụrụ ịkpọkwa gị na mgbe nke ha, sị otu a kwụghachi gị ụgwọ. 13Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ọlụsị na ndị ngwụrọ na ndị ìsì. 14A ga-agọzikwa gị, nʼihi na ha enweghị ike ịkwụghachi gị, a ga-akwụghachikwa gị mgbe ndị ezi omume ga-ebili nʼọnwụ.”

Ilu banyere oke oriri

15Mgbe otu nʼime ndị a kpọrọ oriri nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Ngọzị ga-adịrị onye ga-eso rie oriri nʼalaeze Chineke.”

16Ma ọ sịrị ya, “Otu onye na-akwado oke oriri kpọkwa ọtụtụ mmadụ oku. 17Mgbe oge oriri ahụ ruru, o zipụrụ ohu ya ka ọ ga gwa ndị ahụ ọ kpọrọ sị, ‘Bịanụ, nʼihi na e dozichaala ihe niile.’

18“Ma ha niile nʼotu nʼotu malitere inye ọsịsa. Onye nke mbụ sịrị, ‘Azụrụ m iberibe ala ọhụrụ, ọ dịkwa mkpa na m ga-eje hụ ya, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’

19“Onye nke ọzọ sịrị, ‘Azụrụ m ehi e ji arụ ọrụ ubi, iri e jikọrọ abụọ abụọ. Ana m aga ugbu a ka m nwalee ha, biko gbaghara m, agaghị m abịa.’

20“Ma onye ọzọ sịkwara, ‘Alụrụ m nwunye ọhụrụ, nʼihi nke a agaghị m abịa.’

21“Ohu ahụ lọtara, kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị ahụ a kpọrọ oriri kwuru. Mgbe ahụ, iwe dị ukwuu were nna ya ukwu, nke a mere ka o zipụ ohu ya sị ya, ‘Gaa ngwangwa nʼokporoụzọ ukwu na nʼokporoụzọ nta dị nʼobodo a, kpọbata ndị ogbenye, na ndị ụkwụ rụrụ, na ndị ìsì na ndị ngwụrọ.’

22“Ohu ahụ sịrị, ‘Nna m ukwu, emeela m ihe i kwuru, ma ohere ka fọdụrụ.’

23“Nna ukwu ahụ sịrị ohu ahụ, ‘Gaakwa nʼokporoụzọ ukwu na okporoụzọ nta, mee ka ndị mmadụ bata nʼụlọ m, ka ụlọ m jupụta na mmadụ. 24Nʼihi na agwa m unu, ọ dịghị otu onye nʼime ndị ahụ a kpọrọ oriri ga-edetụ nri m ọnụ.’ ”

Ihe ọ na-efu iso Jisọs

25Ugbu a, oke igwe mmadụ na-eso ya ma ọ tụgharịrị sị ha: 26“Onye ọbụla chọrọ iso m, ma o bụghị ụzọ kpọ nne na nna ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị tinyekwara ndụ nke ya onwe ya asị, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. 27Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, enweghị ike ịbụ onye na-eso ụzọ m.

28“Ọ dị onye ọbụla nʼime unu chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, gbakọọ ihe ọ ga-efu ya, iji chọpụta ma o nwekwara ego ga-ezu iwucha ya? 29Nʼihi na ọ bụrụ na ọ tọọ ntọala ma o nwekwaghị ike wuchaa ya, onye ọbụla hụrụ ya ga-achị ya ọchị, 30na-asị, ‘Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike wuchaa ya.’

31“Maọbụ olee eze chọrọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala tulee ma puku ndị agha iri ya ọ ga-ezuru ya iji lụso onye ji iri puku ndị agha abụọ abịakwute ya ọgụ? 32Ọ bụrụ na o nweghị ike, ọ ga-ezipụ ozi rịọ ka e kpee udo mgbe onye nke ọzọ ka nọ nʼebe dị anya. 33Nʼụzọ dị otu a, onye ọbụla na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.

34“Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, a ga-eji gịnị mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? 35Ọ bakwaghị uru nye ala maọbụ iji mee nri ala. Kama ọ bụ itufu ya.

“Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

Curación en sábado, banquetes y el costo del discipulado

  • Un registro de acontecimientos titula este episodio “Enseñanza y sanidad, de Perea a Jerusalén”, con inicio en el año 30 d. C. y una duración de un día. El capítulo comienza en una comida de sábado y, más adelante, muestra a grandes multitudes que viajan con Jesús mientras él habla de cargar la cruz, calcular el costo y dejarlo todo para ser su discípulo.Fuentes: Teaching and Healing in Perea to Jerusalem · el propio texto bíblico
  • Un sábado, Jesús fue a comer en la casa de uno de los principales fariseos, mientras los presentes lo observaban de cerca. Justo delante de él había un hombre con hidropesía; Jesús preguntó a los expertos en la ley y a los fariseos si era lícito sanar en sábado y, como ellos guardaron silencio, sanó al hombre y comparó el acto con sacar a un hijo o a un buey de un pozo ese mismo día.Fuentes: el propio texto bíblico
  • Al notar que los invitados escogían los lugares de honor, Jesús contó una parábola sobre los asientos en un banquete de bodas y exhortó al anfitrión a invitar a los pobres, a los lisiados, a los cojos y a los ciegos, que no podrían corresponderle. Cuando alguien allí declaró bienaventurados a quienes comerían en el banquete del reino de Dios, Jesús describió un gran banquete cuyos invitados se excusaron —uno para ver un campo, otro para probar cinco yuntas de bueyes y otro porque se había casado—, y el dueño envió a su siervo a las calles y callejones y después a los caminos y setos.Fuentes: el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.