Lucas 10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Jisọs ezipu iri mmadụ asaa na abụọ
1Mgbe nke a gasịrị, Onyenwe anyị họpụtara iri mmadụ asaa na abụọ ndị ọzọ, zipụ ha mmadụ abụọ abụọ ka ha buru ya ụzọ gaa nʼobodo niile nakwa ebe niile ọ na-achọ ịga. 2Ọ sịrị ha, “Owuwe ihe ubi dị ukwuu ma ndị ọrụ dị naanị ole na ole. Ya mere, rịọọnụ Onyenwe owuwe ihe ubi ka o zite ndị ọrụ nʼowuwe ihe ubi ya. 3Gaanụ! Ma lee, ana m ezipu unu dị ka ụmụ atụrụ nʼetiti agụ. 4Unu ewerekwala ego maọbụ akpa maọbụ akpụkpọụkwụ. Unu ekelekwala onye ọbụla nʼụzọ.
5“Mgbe unu banyere nʼụlọ ọbụla, burunu ụzọ sị, ‘Udo dịrị nʼụlọ a.’ 6Ọ bụrụ na mmadụ udo bi nʼụlọ ahụ, udo unu ga-adịnyekwara ya. Ọ bụrụkwanụ na onye bi nʼụlọ ahụ abụghị onye udo, udo unu ji bịa ga-alọghachitekwara unu. 7Nọgidenụ nʼebe ahụ, na-erinụ ma na-aṅụkwanụ ihe ọbụla ha nyere unu, nʼihi na onye ọrụ kwesiri ịnata ụgwọ ọrụ ya. Unu esitela nʼotu ụlọ gaa nʼụlọ ọzọ.
8“Ọ bụrụ na ndị bi nʼobodo unu batara anabata unu, rienụ ihe ọbụla ha nyere unu. 9Gwọọnụ ndị ọrịa nọ nʼebe ahụ, gwakwanụ ha sị, ‘Alaeze Chineke adịla unu nso.’ 10Ma mgbe unu banyere nʼobodo ọbụla ha jụ ịnabata unu, pụọnụ gaa nʼokporoụzọ ya kwuo sị, 11‘Ọ bụladị aja si nʼobodo a nke nyapagidere nʼụkwụ anyị, anyị na-ehichapụ ya ka ọ bụrụ ihe ịdọ aka ntị nye gị. Otu ọ dị, matakwanụ nke a, na alaeze Chineke dị nso.’ 12Ana m agwa unu na nʼụbọchị ahụ, ga-akara Sọdọm mma karịa obodo ahụ.
13“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịrị gị Betsaida. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ebube a rụrụ nʼime unu ka a rụrụ na Taịa na Saịdọn ha gaara echegharị ogologo oge, nọdụ nʼakwa mkpe na ntụ. 14Ọ ga-akara Taịa na Saịdọn mma nʼụbọchị ikpe karịa unu. 15Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ!
16“Onye ọbụla gere unu ntị, ọ bụ mụ ka o gere ntị. Onye ọbụla jụrụ ịnabata unu, ọ bụ mụ ka ọ jụrụ ịnabata. Onye ọbụla jụrụ ịnabata m jụrụ ịnabata onye zitere m.”
17Iri mmadụ asaa na abụọ ahụ jiri ọṅụ lọta sị, “Onyenwe anyị, nʼaha gị, ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi.”
18Ọ sịrị ha, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nʼeluigwe daa dị ka amụma. 19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ. 20Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nʼihi na mmụọ ọjọọ rubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na e deela aha unu nʼeluigwe.”
21Nʼotu oge ahụ, o jupụtara nʼọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuo sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị nʼihi na ị zonarịrị ihe ndị a nʼebe ndị ọkachamara na ndị nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a niile nye ụmụntakịrị. E, Nna, otu a ka o si masị uche gị ime ya.
22“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara onye Ọkpara ahụ bụ, karịa Nna ahụ. Ọ dịkwaghị onye maara Nna ahụ karịa Ọkpara na ndị ahụ Ọkpara chọrọ igosi onye Nna ya bụ.”
23Mgbe ahụ ọ tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzị na-adịrị anya nke na-ahụ ihe unu na-ahụ ugbu a. 24Ana m asị unu, na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe unu na-ahụ ma ha ahụghị ya, na ịnụ ihe unu na-anụ, ma ha anụghị ya.”
Ilu banyere ezi onye agbataobi
25Otu ụbọchị, otu onye ozizi iwu biliri ịnwale ya. Ọ jụrụ ya, “Onye ozizi, gịnị ka m kwesiri ime ka m keta ndụ ebighị ebi?”
26Ọ sịrị ya, “Gịnị ka e dere nʼiwu? Gịnị ka ị gụtara nʼime ya?”
27Ọ zara sị, “ ‘Ị ga-eji obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na ike gị niile, na uche gị niile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nʼanya’; ma ‘hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’”
28Ọ sịrị ya, “Ị zara nke ọma. Gaa mee nke a ị ga-adị ndụ.”
29Ma iji gosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ sịrị Jisọs, “Onye kwanụ bụ onye agbataobi m?”
30Jisọs sịrị ya, “Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, ọ dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa. 31Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee. 32Otu a kwa, otu onye Livayị bịarutekwara nʼebe ahụ, hụ ya, ma o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafeekwa. 33Ma otu onye Sameria na-aga njem, mgbe ọ bịarutere nso nʼebe ahụ; hụ ya, o nwere ọmịiko nʼahụ ya. 34Ọ gara nso nʼebe ọ nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. Ọ tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma. 35Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’
36“Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?”
37Ọ sịrị, “Ọ bụ onye ahụ meere ya ebere.”
Jisọs sịrị ya, “Laa, gaa mee otu ahụ.”
Nʼụlọ Mata na Meri
38Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ banyere nʼotu obodo nta ebe nwanyị a na-akpọ Mata nabatara ya nʼụlọ ya. 39O nwere nwanne nwanyị a na-akpọ Meri nke nọdụrụ ala nʼụkwụ Onyenwe anyị na-ege ntị nʼihe ọ na-ekwu. 40Ma uche Mata gbasasịrị agbasa ebe ọ na-akwado maka ile ọbịa. Ọ bịakwutere ya sị ya, “Onyenwe anyị, ọ bụ na o metụghị gị nʼobi na nwanne m nwanyị hapụrụ naanị m ije ozi niile? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.”
41Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị ma na-adọgbukwa onwe gị banyere ọtụtụ ihe, 42maọbụ naanị otu ihe dị mkpa, Meri ahọrọla nke ka mma, nke a na-agaghị anapụkwa ya.”

¿Sabías que…?
La misión, las ciudades y Marta y María
- El Diccionario Bíblico de Easton (1897) identifica Corazín, nombrada en los ayes de este capítulo junto con Betsaida y Capernaúm, con Kerazeh, a unas dos millas y media remontando el Wady Kerazeh desde Capernaúm. Dice que, después de que Jesús fue expulsado de Nazaret, Capernaúm pasó a ser su propia ciudad. El capítulo compara esas ciudades con Tiro y Sidón; el diccionario llama a Sidón el primer hogar de los fenicios en la costa de Palestina y la ciudad madre de Tiro, a unas veinticinco millas al norte de Tiro.Fuentes: el propio texto bíblico · Chorazin · Capernaum · Sidon
- El Diccionario Bíblico de Easton (1897) da al nombre Marta el sentido de amargura y dice que ella, su hermana María y su hermano Lázaro vivían en Betania, y que Marta era probablemente la mayor. Como este pasaje llama a la casa su casa, el diccionario señala que algunos han supuesto que era viuda y que su hermano y su hermana se alojaban con ella. La describe como ansiosa y ajetreada en el cuidado del huésped, a diferencia de María, que se sentó a los pies de Jesús y escuchó.Fuentes: el propio texto bíblico · Martha · Mary (sister of Lazarus)
- El Señor designa a otros setenta y dos y los envía de dos en dos delante de él, y una cronología de acontecimientos sitúa ese envío en el año 29 d.C. Cuando regresan, alegres de que hasta los demonios se someten en su nombre, él dice que vio a Satanás caer del cielo como un rayo. El Diccionario Bíblico de Easton (1897) explica el nombre Satanás como adversario o acusador, y señala que el Nuevo Testamento lo usa de manera intercambiable con el diablo más de treinta veces.Fuentes: el propio texto bíblico · 70 Sent Out · Satan
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Sidon · Hoy: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · versículos 13, 14
- Tyre · 33.271, 35.196 · versículos 13, 14
- Jericho · Hoy: Tell el Alayiq · 31.852, 35.436 · versículo 30
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 30, 38
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org