Nations Bible

Lucas 1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

Acerca de este libro

Sobre Lucas

  • El Diccionario Bíblico de Easton (1897) presenta al evangelista Lucas como un gentil; se desconocen la fecha y las circunstancias de su conversión. Según su propia declaración, señala Easton, no fue testigo ocular ni ministro de la palabra desde el principio. Easton considera probable que fuera médico en Troas, convertido allí por Pablo, a quien luego se unió.Fuentes: Easton: Luke
  • Ese diccionario no fecha el Evangelio. Sitúa a Lucas con Pablo en Filipos, después como compañero en el viaje de Filipos a Jerusalén, ausente durante los encarcelamientos en Jerusalén y Cesarea, y de nuevo presente cuando Pablo partió hacia Roma, permaneciendo con él hasta el fin del primer encarcelamiento; la última mención del médico amado está en 2 Timoteo 4:11.Fuentes: Easton: Luke
  • Bajo los romanos, en tiempos de Jesús, Judea era la más meridional de las tres divisiones de Palestina y parte de la provincia de Siria. Poncio Pilato, sexto procurador de Judea del año 26 al 36 d.C., tenía su sede en Cesarea y subía a menudo a Jerusalén; su gobierno abarcó los ministerios de Juan el Bautista y de Jesús. Herodes Antipas, hijo de Herodes y Malthace, es nombrado en el relato de Lucas.Fuentes: Judea · Pontius Pilate · Herod Antipas
  • El relato inicial de Lucas trata de Juan el Bautista, de linaje sacerdotal: su padre, Zacarías, era sacerdote del turno de Abías, y su madre, Isabel, era de las hijas de Aarón; el nacimiento de Juan ocurrió seis meses antes que el de Jesús. María, esposa de José, de la tribu de Judá y del linaje de David, vivía en Nazaret cuando el ángel Gabriel anunció que ella sería la madre del Mesías; después visitó a su prima Isabel. La entrada sobre María afirma que su genealogía se da en Lucas 3.Fuentes: John the Baptist · Mary (Mother of Jesus) · Nazareth
  • Easton cita muchos pasajes en los escritos de Lucas y en las cartas de Pablo como muestra del alcance y la exactitud del conocimiento médico de Lucas. Después de que Jesús fue expulsado de Nazaret, Capernaúm, ciudad de Galilea no mencionada en el Antiguo Testamento, llegó a ser su propia ciudad y escenario de muchos hechos de su vida. Galilea era conocida desde hacía tiempo como Galilea de los gentiles.Fuentes: Easton: Luke · Capernaum · Galilee

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Mmalite

1Ebe ọ bụ nʼọtụtụ mmadụ agbalịala otu ha nwere ike i detu nʼusoro ihe niile mezuru nʼetiti anyị. 2Dị ka e nyefere ha nʼaka anyị idebe bụ ndị ahụ sitere na malite jiri anya ha hụ ihe niile, ndị jikwa okwu a eje ozi. 3Ekpebikwara m, ebe mụ onwe m nyocharala ihe niile nke ọma site na mmalite, ka m dere gị ihe niile nʼusoro, Tiofilọs, gị onye dị elu a na-asọpụrụ. 4Nke a ga-eme ka ị mata nke bụ eziokwu banyere ihe ndị ahụ e ziri gị.

Ozi banyere ọmụmụ Jọn omee baptizim

5Nʼoge Herọd bụ eze Judịa, ọ dị otu onyeisi nchụaja aha ya bụ Zekaraya, onye si nʼotu ndị nchụaja nke Abija. Elizabet bụ nwunye ya, site nʼagbụrụ Erọn. 6Ha abụọ bụ ndị ezi omume nʼihu Chineke. Ha debere iwu na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere na-enweghị ntụpọ ọbụla. 7Mana ha amụtaghị nwa, nʼihi na Elizabet bụ nwanyị agaa, ha abụọ emeela nnọọ agadi.

8O ruru mgbe ọ bụ ndị otu Zekaraya ga-eje ozi, ọ nọ dịka onye nchụaja na-eje ozi nʼihu Chineke. 9A họpụtara ya site nʼife nza dị ka omenaala ndị nchụaja si dị ka ọ bụrụ ya ga-abanye nʼime ime ụlọnsọ Onyenwe anyị ịchụ aja nsure ọkụ nke e ji ụda na-esi isi ụtọ achụ. 10Mgbe oge ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ ruru, igwe ndị mmadụ bịara nọ nʼezi na-ekpe ekpere.

11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị, onye guzo nʼaka nri nke ebe ịchụ aja nke ihe na-esi isi ụtọ mere ka ọ hụ ya anya. 12Mgbe Zekaraya hụrụ ya, obi fepụrụ ya, ọ tụkwara oke egwu. 13Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya sị, “Zekaraya atụla egwu, Chineke anụla ekpere gị. Elizabet nwunye gị ga-atụrụ ime mụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jọn. 14Ọ ga-abụrụ gị ihe oke ọṅụ na obi ụtọ, ọtụtụ mmadụ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ọmụmụ ya. 15Nʼihi na ọ ga-abụ onye dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gaghị aṅụkwa mmanya ọbụla, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-egbu egbu nʼihi na site nʼafọ nne ya ọ ga-abụ onye emejupụtara na Mmụọ Nsọ. 16Ọ ga-akpọghachite ọtụtụ ụmụ Izrel nye Onyenwe ha bụ Chineke ha. 17Ma ọ ga-aga nʼihu Onyenwe anyị nʼike mmụọ na ike nke Ịlaịja, tụgharịa obi ndị bụ nna nʼebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isiike tụgharịa obi, lekwasị anya nʼamamihe nke ndị ezi omume, na ijikere ụmụ mmadụ nʼihi Onyenwe anyị.”

18Zekaraya sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu m ga-esi mata na nke a ga-adị otu a? Abụrụla m agadi. Nwunye m akakwaala nka.”

19Mmụọ ozi zara ya sị, “Abụ m Gebrel. Ana m eguzo nʼihu Chineke. Ezitere m ka m bịa gwa gị okwu ma wetara gị oziọma a. 20Ma lee, ị ga-ada ogbi, ị gaghị ekwukwa okwu ọbụla, tutu ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu nʼihi na i kwenyeghị nʼokwu m, nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.”

21Mgbe ihe ndị a niile na-eme, mmadụ ndị ahụ nọkwa na-eche Zekaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nʼime ime ụlọnsọ ukwu ahụ. 22Mgbe o mesịrị pụta, o nwekwaghị ike ikwuru ha okwu. Ha ghọtara na ọ hụrụ ọhụ nʼime ụlọnsọ ahụ nʼihi na ọ bụ aka ka o ji gwa ha okwu.

23Mgbe oge ịrụ ọrụ ya gwụsịrị, ọ laghachiri nʼụlọ ya. 24Mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, Elizabet bụ nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya nʼime ụlọ ọnwa ise. 25Ọ sịrị, “Onyenwe anyị emeerela m nke a. O gosila m ihuọma ya nʼụbọchị ndị a, ma wepụkwara m ihere nʼetiti ndị nke m.”

Ozi banyere ọmụmụ Jisọs

26Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili. 27Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri. 28O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.”

29Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara. 30Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. 31Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs. 32Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. 33Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.”

34Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?”

35Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke. 36Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga. 37Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.”

38Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.

Meri agaa ileta Elizabet

39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.”

Abụ Meri bụrụ

46Ma Meri sịrị,

“Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu

47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m,

48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m,

bụ odibo ya dị ala.

Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi.

49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu.

Aha ya dịkwa nsọ.

50Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya

site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

51O gosila ike aka ya;

ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha.

52O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha,

buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu.

53O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ

ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu.

54O nyerela odibo ya bụ Izrel aka,

ọ na-echetakwa imere ya ebere.

55Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha,

nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.”

56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.

Ọmụmụ Jọn omee baptizim

57Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. 58Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.

59Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya, 60ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.”

61Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.”

62Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ. 63Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya. 64Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke. 65Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa. 66Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya.

Abụ Zekaraya

67E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị,

68“Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel,

nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya.

69O welielara anyị Onye nzọpụta

site nʼụlọ odibo ya bụ Devid.

70(Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ).

71Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị

na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị.

72O meere ndị nna nna anyị ha ebere

site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ.

73Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa:

74Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị,

nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu.

75Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị.

76“Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu;

nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ.

77Ime ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta

site na ịgbaghara mmehie ha.

78Nʼihi oke obi ebere Chineke anyị,

nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe.

79Ka ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị

na nʼonyinyo nke ọnwụ,

na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo.”

80Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

Los anuncios de Juan y de Jesús

  • Zacarías servía en la división sacerdotal de Abías, la octava de las veinticuatro clases en que David había repartido a los sacerdotes. Solo cuatro de esos grupos volvieron del exilio y luego fueron redistribuidos bajo los nombres antiguos. Los sacerdotes servían en el templo dos veces al año, una semana cada vez, y cada día se echaban suertes para la solemne ofrenda del incienso.Fuentes: Zacharias · el propio texto bíblico
  • El ángel que estaba a la derecha del altar del incienso dijo llamarse Gabriel y afirmó que está en la presencia de Dios. El mismo nombre designa al ángel enviado a Daniel para explicar la visión del carnero y del macho cabrío y comunicar la predicción de las setenta semanas, y fue Gabriel quien también anunció a María que tendría un hijo.Fuentes: Gabriel · el propio texto bíblico
  • Elisabet era descendiente de Aarón. María, de la tribu de Judá y del linaje de David, estaba unida a ella por matrimonio y fue desde Nazaret, en Galilea, una ciudad que no se menciona en el Antiguo Testamento, a visitarla en la región montañosa de Judá.Fuentes: Elisabeth · Mary (Mother of Jesus) · Nazareth · el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Judea · Hoy: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículos 5, 39, 65
  • Holy Place · Hoy: on Mount Moriah · 31.778, 35.236 · versículos 9, 21, 22
  • Galilee · 32.760, 35.527 · versículo 26
  • Nazareth · 32.702, 35.298 · versículo 26

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.