Levítico 25
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Afọ izuike
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị sị ya, 2“Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ m ga-enye unu, unu ga-eme ka ala ahụ nwee afọ izuike nke ya nye Onyenwe anyị. 3Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu. 4Ma mgbe o ruru afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ala ubi unu ka o zuo ike, afọ izuike nye Onyenwe anyị. Unu akụla ihe ọbụla nʼubi unu maọbụ kwachaa osisi vaịnị unu. 5Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile. 6Ihe ubi puputara nʼala ahụ niile nʼafọ izuike ahụ bụ nri dịrị unu onwe unu, na ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, na onye i goro ọrụ, na onye ọbịa bi nʼetiti unu. 7Ihe ubi ahụ dịkwara anụ ụlọ gị, na anụ ọhịa bi nʼala gị. Ihe ọbụla puputara nʼala bụ ihe unu ga-eri.
Afọ iri ise nke inwere onwe
8“ ‘Gụpụta afọ izuike asaa, afọ asaa, ụzọ asaa. Ngụkọ afọ izuike ndị a niile ga-enye iri afọ anọ na itoolu. 9Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa, zipụ onye ga-egbu opi ike, ya bụ, nʼụbọchị mkpuchi mmehie, a ga-egbu opi ike nʼala Izrel niile. 10Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya. 11Afọ nke iri ise bụ afọ inwere onwe nye unu. A gaghị akụ ihe ọbụla nʼubi, a gakwaghị ewe ihe ubi ọbụla puputara nʼonwe ya, maọbụ mkpụrụ osisi vaịnị mịrị nʼonwe ya. 12Ọ bụ afọ inwere onwe, bụrụkwa afọ dị nsọ nye unu, nke onye ọbụla ga-eri naanị ihe e wetara nʼubi.
13“ ‘Onye ọbụla ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ya, nʼafọ inwere onwe a.
14“ ‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu. 15Ị ga-azụrụ ala site nʼaka onye agbataobi dịka ọnụọgụgụ afọ si dị site nʼafọ inwere onwe. Ha ga-eresi gị ya dịka ọnụọgụgụ afọ ole fọdụrụ maka ịkọ ihe nʼala ahụ. 16Ọ bụrụ na a zụrụ ala ahụ nso nso mmemme iri afọ ise a, ọnụahịa ala ahụ ga-adị ala, ọ bụrụkwanụ na ọ dị anya site na mmemme ahụ, ọnụahịa ya ga-adị elu, nʼihi na ụgwọ onye ahụ na-akwụ bụ ụgwọ ugboro ole ọ ga-akụ ihe nʼala ahụ. 17Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
18“ ‘Gbasoonụ ụkpụrụ m, ma lezie anya imezu ihe m nyere nʼiwu, ka unu nwee ike ibi obi udo nʼala ahụ. 19Mgbe ahụ, ala ga-amị mkpụrụ ya, unu ga-eriju afọ, birikwa nʼala ahụ nʼudo. 20Unu nwere ike jụọ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị ga-eri nʼafọ nke asaa ahụ ebe ọ bụ na anyị agaghị akụ ihe ọbụla, maọbụ wee ihe ubi ọbụla nʼafọ ahụ?” 21Aga m ezitere unu ngọzị dị ukwuu nʼafọ nke isii, nke ga-eme ka ala mee ihe omume nke ga-ezuru unu afọ atọ. 22Mgbe unu ga-akụ ihe ubi nʼafọ nke asatọ unu ga na-eri site nʼowuwe ihe ubi ochie unu tutu ruo nʼafọ nke itoolu mgbe unu ga-ewebata ihe ubi ọhụrụ.
23“ ‘Chetanụ na ala bụ nke m, nʼihi nke a, o kwesighị ka unu ree ala ọbụla kpamkpam. Unu bụ naanị ndị ọbịa na ndị nlekọta nye m. 24Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere.
25“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu aghọọ onye ogbenye si otu a ree ala ya, nwanna ya dị ya nso ga-abịa gbapụta ala ahụ. 26Ọ bụrụ na-enweghị onye ga-agbapụta ala ahụ nye ha, ma ha mesịa ghọọ ndị bara ụba nwekwa ihe ga-ezu ịgbapụta ala ahụ nʼonwe ha. 27A ga-agụ afọ ole gara site na mgbe o rere ala ahụ, nyeghachi ya ego ole o kwesiri inweta. Onye rere ala ga-alaghachikwa nʼala ya. 28Ọ bụrụ na onyenwe ya enweghị ike ịchọta ego ọ ga-eji gbara ya, ala ahụ ga-adị nʼaka onye ahụ zụrụ ya tutu ruo nʼafọ inwere onwe. Mgbe ahụ ọ ga-ewerekwa ala ahụ nyeghachi ya onye resiri ya.
29“ ‘Onye ọbụla rere ụlọ obibi dị nʼobodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nwere ikike mgbapụta ya naanị mgbe otu afọ zuru site na mgbe e rere ya. Nʼoge ahụ ka onye rere ya nwere ike ịgbaghachi ya. 30Ọ bụrụ na a gbapụtaghị ya tupu otu afọ agafee, ụlọ ahụ dị nʼime obodo nwere mgbidi ga-abụ nke onye ahụ zụrụ ya mgbe niile, bụrụkwa nke ụmụ ụmụ ya. A gaghị enyeghachikwa ya mgbe afọ inwere onwe ruru. 31Ma ụlọ ndị dị nʼobodo nta na-enweghị mgbidi a ga-agụ ha dịka ihe dị nʼọhịa. E nwere ike ịgbapụta ha, ha bụkwa nke a ga-eweghachite mgbe afọ inwere onwe ruru.
32“ ‘Ma banyere obodo niile nke ndị Livayị dị iche iche. Ha nwere ikike ịgbapụta ụlọ ha dị nʼime nketa ha mgbe ọbụla. 33Ihe onwunwe ndị Livayị bụ nke e nwere ike ịgbapụta, bụ ndị a, ụlọ niile e rere nke dị nʼobodo ha nwere. Ọ ga-abụ nʼafọ inwere onwe ka aga enwetaghachi ha, nʼihi na ụlọ ndị ahụ dị nʼobodo ndị Livayị bụ naanị oke ha nwere nʼetiti ụmụ Izrel. 34Ma a gaghị ere ala ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara obodo ha gburugburu ere, nʼihi ọ bụ ihe ha nwee nʼọha ruo ebighị ebi.
35“ ‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu. 36Tụọ egwu Chineke, kwerekwa ka nwanna gị soro gị biri nʼala ahụ. A nakwala ụma maọbụ ọmụrụnwa ọbụla. 37Ị gaghị ana ọmụrụnwa nʼego i gbazinyere ha, maọbụ rie uru site na nri i resiri ha. 38Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, inye unu ala Kenan, na ị bụ Chineke unu.
39“ ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọbụla adaa ogbenye, resi gị onwe ya, emela ka o jere gị ozi dịka onye ohu. 40Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe. 41Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha. 42Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu. 43A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ. Tụọnụ egwu Chineke unu.
44“ ‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu. 45Unu nwere ike ịzụ ndị ohu site nʼetiti ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, maọbụ site nʼetiti ndị agbụrụ ha a mụrụ nʼala Izrel. Ndị dị otu a ga-abụkwa ihe onwunwe unu. 46Unu nwere ike kenye ha ụmụ unu dịka ihe nketa, ma mee ha ndị ohu unu ụbọchị ndụ ha niile. Ma unu agaghị eji aka ike chịa onye Izrel ibe unu.
47“ ‘Ọ bụrụ na onye ọbịa bi nʼetiti unu aghọọ ọgaranya, ma otu nʼime ụmụnna unu adaa ogbenye were onwe ya resi onye ọbịa ahụ bi nʼetiti unu, maọbụ were onwe ya resi nwanna ndị ikwu onye ọbịa ahụ, 48ha nwere ikike ịgbapụta ya mgbe ha resiri onwe ha. Otu nʼime ụmụnna ya nwere ike gbapụta ha. 49Nwanne nne ya, maọbụ nwanne nna ya, maọbụ nwanna nʼikwu ha ọbụla nwere ike ịgbapụta ya. Ọ nwekwara ike ịgbapụta onwe ya ma ọ bụrụ na ọ kpata ego. 50Ya na onye ahụ o resiri onwe ya ga-agụ afọ ole ọ bụ site na mgbe o rere onwe ya ruo nʼafọ inwere onwe. Ego a ga-akwụ nʼihi ịgbapụta ya ga-abụ ego ọ ga-efu ịkwụ ohu ọzọ ụgwọ ịrụ ọrụ ọnụọgụgụ afọ ndị ahụ niile. 51Ọ bụrụ nʼọtụtụ afọ fọdụrụ, ọ ga-esite nʼọnụ ego e rere ha kwụọ nke dị ukwu dịka ego mgbapụta ha. Naanị ihe ntakịrị ga-apụ nʼime ego ahụ. 52Ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ inwere onwe eruo, ọ ga-agụkọ ihe ego ahụ pụtara, kwụọ ya maka ịgbara onwe ya dịka o kwesiri. 53A ga-emeso ha dịka ndị ọrụ e goro ego kwa afọ, ma ị ga-ahụ na onye ha nọ nʼokpuru ya agaghị eji aka ike chịa ha.
54“ ‘Ma ọ bụrụ na e nweghị ike gbapụta ya site nʼụzọ ndị a niile, ya na ụmụ ya ga-enwere onwe ha mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru. 55Nʼihi na mụ ka ụmụ Izrel bụ ndị ohu nye. Ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara site nʼala Ijipt. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.

¿Sabías que…?
El Año Sabático y el Año del Jubileo
- La ley dada en el monte Sinaí estableció un ciclo agrícola de siete años en el que la tierra descansaba cada séptimo año, seguido por un quincuagésimo Año del Jubileo tras siete ciclos de siete años. Comenzando en el Día de la Expiación con el toque de una trompeta, el Jubileo proclamaba libertad, daba descanso a la tierra y devolvía las tierras ancestrales a sus familias originales.Fuentes: el propio texto bíblico · Mount Sinai
- La tierra no podía venderse a perpetuidad porque los israelitas eran considerados forasteros y residentes en una tierra que pertenecía a Dios. En consecuencia, las transacciones inmobiliarias funcionaban como arrendamientos, con precios calculados según el número de cosechas restantes hasta el siguiente Jubileo.Fuentes: el propio texto bíblico
- El capítulo incluye protecciones para los israelitas empobrecidos, prohibiendo el cobro de intereses en préstamos y la servidumbre perpetua de compatriotas. Puesto que Dios los había librado de Egipto, cualquier israelita obligado por deudas a servir debía ser tratado como jornalero y liberado en el Jubileo.Fuentes: el propio texto bíblico · Egypt
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org