Nations Bible

Josué 7

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Mmehie Ekan

1Ma ụmụ Izrel ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe gbasara ihe ndị ahụ e debere iche nye Onyenwe anyị. Nʼihi na Ekan nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera, onye si nʼebo Juda gara were ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu megide ụmụ Izrel.

2Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai.

3Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.” 4Nʼihi nke a, ihe dịka puku ndị agha atọ ka e zigara imeri obodo Ai. Ma ngwangwa, ndị agha obodo Ai meriri ndị agha ụmụ Izrel, chụọ ha ọsọ. 5Ihe dịka iri mmadụ atọ na isii nʼetiti ndị agha Izrel ka e gburu nʼagha ahụ. Ndị Ai chụrụ ha ọsọ site nʼụzọ ama obodo ruo nʼebe a na-awa nkume, gbuo ha na mgbada ugwu ahụ. Nʼihi nke a, ndị agha Izrel dara mba, obi lọkwara ha mmiri.

6Mgbe ahụ, Joshua na ndị okenye Izrel sitere nʼobi mwute dọwaa uwe ha, daa nʼala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha wekwara ntụ wụkwasị onwe ha nʼisi igosi obi mwute ha. 7Mgbe ahụ kwa, Joshua sịrị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Nʼihi gịnị ka i ji mee ka ndị a gabiga osimiri Jọdan, inyefe anyị nʼaka ndị Amọrait, ime ka ha tigbuo anyị? Ọ gaara adị anyị mma nke ọma ma ọ bụrụ na anyị nọdụrụ nʼofe ọzọ nke Jọdan. 8Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ? 9Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?”

10Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala? 11Izrel emehiela. Ha emebiela ọgbụgba ndụ m nyere ha nʼiwu idebe, ha ewerela ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ e doro iche nye Onyenwe anyị. Ọ bụghị naanị na ha zuru ohi, ha nọkwa nʼelu ya ghaa ụgha banyere ya. Ha ewerekwala ihe ndị ahụ tinyekọta nʼihe nke aka ha. 12Ọ bụ nʼihi nke a mere na ụmụ Izrel enwekwaghị ike iguzo nʼihu ndị iro ha. Ọ bụkwa nke a mere ha ji tụgharịa gbaa ọsọ, nʼihi na ha aghọọla ndị kwesiri ka e bibie. Ya mere, agaghị m anọnyere unu ọzọ, tutu ruo mgbe unu wezugara ma mebie site nʼetiti onwe unu, ihe ọbụla e debere iche maka mbibi.

13“Bilie! Doo Izrel nsọ. Gwa ndị m okwu sị ha, ‘Onye ọbụla nʼetiti unu ga-ejikere doo onwe ya nsọ maka echi. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu sị, Ihe ndị e doro nsọ dị nʼetiti unu, Izrel. Unu apụghịkwa iguzosi ike nʼihu ndị iro unu, tutu ruo mgbe unu ga-esite nʼetiti onwe unu wezuga ihe ndị ahụ.’

14“ ‘Nʼụtụtụ echi, unu ga-apụta nʼebo nʼebo. Ebo ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta nʼikwu nʼikwu, ikwu ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta bịa nʼezinaụlọ nʼezinaụlọ, ụlọ ọbụla nke Onyenwe anyị họọrọ, ndị ikom ya ga-apụta nʼotu nʼotu. 15Ma onye ọbụla e jidere ji ihe ndị ahụ e doro nsọ ka a ga-akpọ ọkụ, ya onwe ya, na ihe niile ọ nwere, nʼihi o mebiela iwu ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, meekwa ihe jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel.’ ”

16Nʼihi nke a, Joshua biliri nʼisi ụtụtụ. O mere ka ebo niile dị nʼIzrel bịaruo nso nʼebo nʼebo, ebo Juda ka a họọrọ. 17Mgbe ahụ, e mere ka ikwu niile dị nʼebo Juda bịaruo nso, ikwu Zera ka ahọpụtara. Mgbe e mere ka ikwu Zera pụta nʼezinaụlọ ha niile nʼotu nʼotu, ezinaụlọ Zimri bụ nke ahọpụtara. 18Joshua mere ka ndị ikom niile dị nʼezinaụlọ Zimri pụta nʼotu nʼotu, ma e jidere Ekan, nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera onye ebo Juda.

19Mgbe ahụ, Joshua sịrị Ekan, “Nwa m, nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel otuto, nyekwa ya nsọpụrụ. Gwa m ihe i mere. Ezonarịkwala m ihe ọjọọ i mere.”

20Mgbe ahụ, Ekan zara Joshua sị ya, “Ọ bụ eziokwu! Emehiela m megide Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Lee ihe m mere. 21Mgbe m hụrụ nʼetiti ihe ndị a kwatara nʼagha, otu uwe mwụda Babilọn mara mma, na narị Shekel ọlaọcha abụọ, na mkpirisi ọlaedo ịdị arọ ya ruru iri shekel ise. E nwere m anya ukwu nʼebe ihe ndị a dị, chịrị ha. Lee, ezoro m ha nʼime ala nʼụlọ ikwu m, ọlaọcha ahụ dịkwa nʼokpuru ya.”

22Ya mere, Joshua zigara ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa chọọ ihe ahụ Ekan zoro. Ndị a gara nʼụlọ ikwu ahụ, chọpụta ihe ahụ ezuru nʼohi. Dịka Ekan kwuru, ihe ikpeazụ ha hụrụ bụ ọlaọcha ahụ. 23Ha chịkọtara ha niile chịtara ha Joshua. Mgbe ha bịaruru ebe Joshua na ndị Izrel niile nọ, ha chịsara ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.

24Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ. 25Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.”

Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ. 26Ha tụkọtara ọtụtụ nkume tụkwasị ya nʼelu Ekan. Nkume ndị a dị nʼebe ahụ ruo taa. Ọ bụkwa nʼụzọ dị otu a ka iwe ọkụ Onyenwe anyị ji dajụọ. Ya mere, e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Akọ ruo taa.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

La derrota en Hai y el pecado de Acán

  • Hai era una ciudad real cananea situada al este de Betel y cerca de Bet-avén. Tras la toma de Jericó, fue la segunda ciudad a la que se dirigieron los israelitas, aunque una fuerza inicial de unos tres mil soldados fue inesperadamente derrotada en las laderas fuera de la ciudad.Fuentes: Ai · el propio texto bíblico
  • Para descubrir la causa de la derrota de Israel en Hai, Josué presentó a la comunidad por etapas de tribu, clan, familia e individuo hasta que Acán, de la tribu de Judá, fue señalado. Acán confesó haber robado y escondido oro, plata y un manto babilónico que estaban consagrados a la destrucción.Fuentes: Achan · el propio texto bíblico
  • El nombre del valle de Acor significa aflicción o desgracia, lo que refleja las palabras de Josué de que Acán había acarreado calamidad a Israel. Escritores bíblicos posteriores, como Oseas e Isaías, hicieron referencia a este valle de manera simbólica como un lugar donde el desastre se transforma en esperanza y bendición.Fuentes: Achan · Valley of Achor · el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Jericho · Hoy: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · versículo 2
  • Jordan · Hoy: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículo 7
  • Shinar · Hoy: Babylonia · 32.543, 44.422 · versículo 21

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.