Nations Bible

Josué 17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Ọkara ebo Manase

1Nke a bụ oke e kenyere ndị ebo Manase, bụ ọkpara Josef, ya bụ Makia ọkpara Manase, onye bụ nna nna ndị Gilead. Onye natara ala Gilead na Bashan, nʼihi na ndị agbụrụ Makia bụ dike nʼagha. 2Ya mere, oke a dịịrị ndị fọdụrụ nʼebo Manase dịka ezinaụlọ ha si dị. Agbụrụ Abieza, Helek, Asriel, Shekem, Hefa na Shemida. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom agbụrụ Manase, nwa Josef, dịka ikwu ha si dị.

3Ma Zelofehad, nwa Hefa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, amụtaghị ụmụ ndị ikom kama ọ mụtara naanị ụmụ ndị inyom, ndị aha ha bụ nke a: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. 4Ndị inyom ndị a bịakwutere Elieza, onye nchụaja na Joshua nwa Nun, nʼihu ndị ndu ụmụ Izrel niile sị ha, “ Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya kenye anyị ala nke anyị, dịka o si kenye ụmụ ndị ikom ikwu anyị.” Ya mere, dịka Onyenwe anyị nyere ya Mosis nʼiwu, Joshua nyere ha ihe nketa ruuru ha nʼetiti ụmụnne nna ha, dịka ndị ọzọ si keta. 5Manase chịtara ala oke iri, tinyere Gilead, na Bashan nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan, 6nʼihi na e mere ka ndị inyom Manase keta oke nʼetiti ndị ikom ebo Manase. Ala fọdụrụ na Gilead bụ ndị ikom ebo Manase nwe ya.

7Oke ala ebo Manase gbatịrị site nʼAsha ruo na Mikmetat, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Shekem. Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ndịda site nʼebe ahụ tinyere ndị bi nʼala En-Tapụọa. 8Ala dị gburugburu Tapụọa bụ ala ebo Manase, ma obodo Tapụọa nʼonwe ya, nke dị nʼoke ala ebo Manase, bụ obodo ebo Ifrem. 9Oke ala ụmụ Manase gbatịrị ga ndịda ruo na mmiri iyi Kana. Ụfọdụ obodo ndị Ifrem dị nʼebe ahụ, nʼetiti obodo ndị Manase, kama oke ala ndị Manase nʼakụkụ ugwu iyi ahụ kwụsịrị nʼosimiri Mediterenịa. 10Ala dị na ndịda bụ nke e kenyere Ifrem, ma ala mgbago ugwu bụ nke Manase. Ala ndị Manase gbatịrị ruo nʼosimiri Mediterenịa ma ha na ndị Asha nwekọrọ oke ala nʼakụkụ ugwu, ebe ha na ndị Isaka nwere oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.

11Manase ka e nyere obodo ndị a, nke dị nʼala e nyere Isaka na Asha: obodo Bet-Shan, na Ibleam, na Doa, na Endoa, na Teanak, na Megido, na obodo nta niile gbara ha gburugburu. Obodo nke atọ bụ Nafọt.

12Ma ụmụ Manase enweghị ike ịchụpụ ndị Kenan bi nʼobodo ndị ahụ, nʼihi na ndị Kenan nọgidere bichie obodo ndị a. 13Ma nʼikpeazụ, mgbe ụmụ Izrel ghọrọ ndị dị ike, ha achụpụghị ndị Kenan niile bi nʼobodo ndị a kpamkpam, kama ha mere ka ha bụrụ ndị na-ejere ụmụ Izrel ozi, dịka ndị ohu ha.

14Ma ụmụ ụmụ Josef sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na Onyenwe anyị gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.”

15Joshua zara sị ha: “Ọ bụrụ na ala ugwu ugwu Ifrem agaghị ezuru unu nʼihi na unu bara ụba nʼọnụọgụgụ, gaanụ nʼoke ọhịa sụchasịa ala, nʼime ala ndị Periz, na nke ndị Refaim.”

16Ụmụ Josef zara Joshua sị, “Ala ugwu ugwu a agaghị ezuru anyị. Ọzọ, ndị Kenan niile bi nʼala dị larịị nwere ụgbọala igwe, ma ndị niile bi na Bet-Shan, na ụmụ obodo nta ha na ndị bikwa na Ndagwurugwu Jezril.”

17Ma Joshua zara ụmụ Josef, ya bụ, Ifrem na Manase, sị ha, “Unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, bụrụkwa ndị dị ike, ọ bụghị naanị otu oke ka unu ga-eketa, 18nʼihi na ala ugwu ugwu oke ọhịa ahụ bụkwa nke unu. Sụchaanụ ya, ruo na nsọtụ ya, ka ọ bụrụ nke unu. Ọ bụ ezie na ndị Kenan bi nʼime ya nwere ụgbọ agha igwe, bụrụkwa ndị sịrị ike, unu nwere ike ịchụpụ ha.”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

La heredad de Manasés y la casa de José

  • La tribu de Manasés quedó dividida geográficamente a ambos lados del río Jordán. Debido a que el clan de Maquir era reconocido en la guerra, ya había recibido los territorios orientales de Galaad y Basán, mientras que el resto de los clanes recibió diez porciones al oeste del Jordán.Fuentes: el propio texto bíblico · Machir · Gilead · Bashan
  • Las hijas de Zelofejad —Maala, Noa, Hogla, Milca y Tirsa— se presentaron ante Josué y el sacerdote Eleazar para reclamar el derecho de propiedad ordenado por el Señor a través de Moisés. Así, recibieron una herencia de tierras junto con los hermanos de su padre.Fuentes: el propio texto bíblico · Hepher · Machir
  • Cuando las tribus de la casa de José se quejaron de que su territorio era insuficiente, Josué les ordenó desmontar y ocupar la zona boscosa de las colinas en lugar de temer a los cananeos de los valles, quienes contaban con carros de hierro en ciudades como Bet-sán.Fuentes: el propio texto bíblico · Joshua · Beth-shean

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Bashan · 32.781, 35.935 · versículos 1, 5
  • Gilead · Hoy: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · versículos 1, 5, 6
  • Jordan · Hoy: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículos 1, 2, 5
  • Shechem · Hoy: Tell Balatah · 32.214, 35.282 · versículo 7
  • Great Sea · Hoy: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · versículos 9, 10
  • Megiddo · Hoy: Tel Megiddo · 32.585, 35.184 · versículo 11
  • Taanach · Hoy: Tell Ta’anakh · 32.522, 35.219 · versículo 11
  • Valley of Jezreel · Hoy: Jezreel Valley · 32.596, 35.242 · versículo 16

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.