Josué 13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ala fọdụrụ
1Nʼoge a, Joshua aghọọla agadi nwoke, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị ya, “Ugbu a, ị ghọọla agadi, ụbọchị ọgwụgwụ ndụ gị abịala nso, ma ọtụtụ ala fọdụrụ ndị a ga-emeri.
2“Ndị a bụ ala nke fọdụrụ unu ga-enweta:
“ala ndị Filistia niile na ala ndị Geshua niile, 3site nʼosimiri Shaịho dị nʼọnụ Ijipt ruo nʼoke ala Ekrọn, nʼakụkụ ugwu ya, nke a gụnyere ndị Kenan, na ndịisi ise ndị Filistia: ndị Gaza, ndị Ashdọd, ndị Ashkelọn, ndị Gat, na ndị Ekrọn;
nakwa ala ndị Ava, 4site na ndịda ala ahụ niile dị nʼugwu;
nʼala ndị Kenan, na Meara, nke bụ ala ndị Saịdọn, ruo nʼAfek, na oke ala ndị Amọrait;
5na ala ndị Gebal niile;
na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat.
6“Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu. 7Ya mere, kere ebo itoolu, na ọkara Manase, ala ndị a niile, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.”
Ala dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan
8Ọkara ebo Manase, na ebo Ruben, na Gad, enwetala ihe nketa ha nʼofe ọzọ nke Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha.
9Ala ha gbatịrị site nʼAroea nke dị na ndagwurugwu Anọn, na site nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ, ruo nʼala dị larịị nke gbatịrị site na Medeba ruo Dibọn. 10Ọ gbatịkwara ruo nʼoke ala ndị Amọn, tinyere obodo niile nke Saịhọn, eze ndị Amọrait na-achị mgbe o bi na Heshbọn.
11Ọ gụnyekwara Gilead, nʼoke ala ndị Geshua, na ndị Maaka, na ugwu Hemon niile, na Bashan niile, ruokwa Saleka. 12Ya bụ, obodo niile nke Ọg eze ndị Bashan na-achị, mgbe isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. (Ọ bụ eze ikpeazụ nʼagbụrụ ndị Refaim.) Mosis busoro Saịhọn na Ọg agha, tigbuo ha, napụkwa ha ala ha. 13Ma ndị Izrel achụpụghị ndị Geshua na ndị Maaka, ya mere, ha nọgidere na-ebi nʼetiti ụmụ Izrel ruo taa.
14O nweghị ala o kenyere ebo Livayị. Nʼihi na Onyenwe anyị kwere ha nkwa na ihe nketa ha ga-abụ ihe aja onyinye niile e si nʼọkụ na-ewetara Onyenwe anyị Chineke Izrel.
15Nke a bụ ala Mosis nyere ebo Ruben dịka agbụrụ ha si dị, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.
16Ala ha gbatịrị site nʼAroea, na ndagwurugwu iyi Anọn, sitekwa nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ na ala dị larịị gabiga gafee Medeba, 17ruo Heshbọn, na obodo ndị ọzọ dị nʼala larịị ahụ, tinyere obodo Dibọn, na Bamot Baal, na Bet-Baal-Meon, 18na Jahaz, na Kedemot, na Mefaat, 19na Kiriatem, na Sibma, na Zeret Shaha, nke dị nʼugwu nta dị na ndagwurugwu ahụ; 20na Bet-Peoa, na Bet-Jeshimọt, nke dị nʼebe dị na mgbada ugwu Pisga; 21na obodo niile dị nʼala larịị ahụ, na ala Saịhọn niile, onye bụ eze ndị Amọrị nke chịrị na Heshbọn. Mosis lụgburu ya, lụgbukwaa ndịisi Midia bụ Evi, na nke Rekem, na nke Zua, na nke Hua, na nke Reba, ụmụ ndị eze ha na Saịhọn jikọtara aka buo agha. 22Tinyere ndị ha gburu nʼọgbọ agha, ụmụ Izrel ji mma agha gbuo Belam nwa Beoa, onye na-agba aja. 23Ya mere, oke ala ebo Ruben dị nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Obodo ukwu na obodo nta ndị a bụ ihe ha nwetara dịka ihe nketa ha. Ezinaụlọ ọbụla nwetakwara oke nke ha dịka ikwu ha si dị.
24Mosis nyekwara ebo Gad ala nke ha site nʼala ahụ ha lụgburu, dịka ikwu ha si dị.
25Ndị a bụ ala ebo Gad nwetara: ala ahụ niile dị na Jeza, na obodo Gilead niile, na ọkara ala ndị Amọn nke ruru Areoa, nʼakụkụ Raba. 26Na ala sitere Heshbọn ruo Ramat Mizpa, na Betonim, na sitekwa Mahanaim ruo oke ala Debịa. 27Nʼime ndagwurugwu ala ha bụ Bet-Haram, na Bet-Nimra, na Sukọt, na Zafọn, na ala fọdụrụ nʼalaeze Saịhọn eze Heshbọn, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼoke ala ya ruokwa nsọtụ osimiri Galili. 28Obodo ndị a na obodo nta ndị ọzọ bụ ihe nketa ụmụ Gad dịka agbụrụ ha si dị.
29Mosis nyekwara ikwu ọbụla dị nʼọkara ebo Manase ala nke ha, dịka mkpa ha si dị.
30Ala ha ketara gbatịrị ruo Mahanaim. Ọ bụ ha nwekwa ala Bashan niile, na ala niile Ọg, eze Bashan, na-achị, tinyere iri obodo nta isii dị na Bashan, nke Jaịa wuru. Ha nwetakwara 31ọkara Gilead, na Ashtarọt, na Edrei bụ isi obodo alaeze Ọg nʼime Bashan.
32Ndị a bụ otu Mosis si keere ụmụ Izrel ala dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼobosara ala Moab, na ncherita ihu obodo Jeriko. 33Ma Mosis enyeghị ebo Livayị ala ọbụla, nʼihi na ọ gwara ha na Onyenwe anyị, Chineke Izrel bụ ihe nketa ha nwere, dịka o kwere ha na nkwa.
¿Sabías que…?
La repartición de la tierra al oriente del Jordán
- Aunque Josué era ya de edad avanzada y quedaba mucho territorio por conquistar —incluyendo las fortalezas filisteas y las regiones del norte hacia el Líbano—, Dios le ordenó repartir la tierra al oeste del Jordán entre las nueve tribus y media restantes.Fuentes: el propio texto bíblico
- El capítulo detalla la distribución previa realizada por Moisés al oriente del Jordán, donde las tierras arrebatadas a los reyes Sehón de Hesbón y Og de Basán fueron otorgadas a las tribus de Rubén, Gad y a la media tribu de Manasés.Fuentes: el propio texto bíblico · Sihon · Og
- La tribu de Leví fue la única que no recibió una asignación de territorio. En lugar de tierras, su porción consistía en las ofrendas quemadas presentadas al SEÑOR, siendo Dios mismo su heredad.Fuentes: el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Ashdod · Hoy: Tel Ashdod · 31.757, 34.658 · versículo 3
- Ashkelon · Hoy: Tel Ashkelon · 31.664, 34.546 · versículo 3
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 3
- Ekron · Hoy: Tel Miqne · 31.777, 34.852 · versículo 3
- Gaza · Hoy: Tell Harube · 31.504, 34.464 · versículo 3
- Sidon · Hoy: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · versículo 4
- Gebal · Hoy: Byblos · 34.119, 35.646 · versículo 5
- Lebanon · 33.540, 35.584 · versículos 5, 6
- Mount Hermon · 33.400, 35.850 · versículos 5, 11
- Jordan · Hoy: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículos 8, 23, 27, 32
- Dibon · Hoy: Tall Dhiban · 31.502, 35.777 · versículos 9, 17
- Medeba · Hoy: Madaba · 31.716, 35.795 · versículos 9, 16
- Valley of the Arnon · Hoy: Wadi Mujib · 31.466, 35.573 · versículos 9, 16
- Ammon · 31.955, 35.934 · versículos 10, 25
- Bashan · 32.781, 35.935 · versículos 11, 12, 30, 31
- Geshur · 32.767, 35.700 · versículos 11, 13
- Gilead · Hoy: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · versículos 11, 25, 31
- Maacah · 33.258, 35.581 · versículos 11, 13
- Bamoth-baal · Hoy: Khirbet el Quweiqiyeh · 31.732, 35.741 · versículo 17
- Midian · 28.495, 35.012 · versículo 21
- Rabbah · Hoy: Amman · 31.955, 35.934 · versículo 25
- Sea of Galilee · 32.819, 35.590 · versículo 27
- Havvoth-jair · 32.588, 35.726 · versículo 30
- Jericho · Hoy: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · versículo 32
- Moab · Hoy: Moab 2 · 31.840, 35.674 · versículo 32
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org