Juan 21
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Jisọs na ọrụ ebube nke igbute azụ
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ọzọ. O mere nke a nʼakụkụ osimiri nke Tiberịas, lee otu o si mee. 2Ụfọdụ nʼime ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ otu ebe. Ndị a bụ Saimọn Pita na Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), na Nataniel, onye Kena nke Galili na ụmụ Zebedi, na mmadụ abụọ ndị ọzọ bụkwa ndị ozi ya. 3Saimọn Pita sịrị ha, “Ana m aga igbu azụ.” Ha sịrị, “Anyị ga-eso gị.” Ha biliri gaa, banye nʼime ụgbọ mmiri. Ma nʼabalị ahụ niile ha egbuteghị ihe ọbụla.
4Mgbe chi na-abọ Jisọs guzoro nʼakụkụ mmiri. Ma ndị na-eso ụzọ ya amataghị na ọ bụ Jisọs.
5Jisọs sịrị ha, “Ụmụntakịrị, unu gbutere azụ ọbụla?”
Ha zara ya, “Mba.”
6Ọ gwara ha, “Wụnyenụ ụgbụ unu nʼakụkụ aka nri nke ụgbọ. Unu ga-egbutekwa azụ.” Mgbe ha mere nke a, ha enwekwaghị ike ịdọpụta ụgbụ ha, nʼihi ọtụtụ azụ nke dị nʼime ya.
7Mgbe ahụ onye ahụ na-eso ụzọ ya Jisọs hụrụ nʼanya gwara Pita, “Ọ bụ Onyenwe anyị!” Ngwangwa Saimọn Pita nụrụ na “ọ bụ Onyenwe anyị,” ọ yiiri uwe ya (nʼihi na ọ gba ọtọ), wụba nʼime mmiri ahụ. 8Ndị ọzọ ndị na-eso ụzọ ya bịara nʼụgbọ mmiri nta ahụ, na-adọpụta ụgbụ ha nke azụ juru nʼime ya, nʼihi na ha nọ nso nʼala ihe dị ka narị nzọ ụkwụ na ise. 9Mgbe ha pụtara nʼelu ala, ha hụrụ ọkụ a kwanyere, nke a hụkwasịrị azụ nʼelu ya na ogbe achịcha.
10Jisọs gwara ha, “Wetanụ ụfọdụ nʼime azụ ndị ahụ unu gbutere ugbu a.” 11Saimọn Pita pụrụ gaa dọgota ụgbụ azụ ahụ nʼelu ala. Ihe juru ya bụ azụ ndị ukwuu nke ọnụọgụgụ ya dị narị na iri ise na atọ. Ma ụgbụ ahụ adọwaghị nʼagbanyeghị na azụ juru nʼime ya. 12Jisọs sịrị ha, “Bịanụ rie nri ụtụtụ.” Ọ dịghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ na-eso ụzọ ya jụrụ ya, “Ị bụ onye?” Nʼihi na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị. 13Jisọs bịara were achịcha ahụ nye ha. Otu ahụ ka o mekwara azụ ahụ. 14Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya mgbe e mere ka o si nʼọnwụ bilie.
Jisọs akpọghachite Pita
15Mgbe ha risiri nri ụtụtụ, Jisọs sịrị Saimọn Pita, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya karịa ndị a niile?”
Ọ sịrị ya, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.”
Jisọs sịrị ya, “Na-azụ ụmụ atụrụ m.”
16Jisọs sịrị ya nke ugboro abụọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?”
Ọ sịrị, “E, Onyenwe anyị, ị maara na m hụrụ gị nʼanya.”
Ọ sịrị ya, “Na-elekọta atụrụ m.”
17Ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “Saimọn nwa Jọn, ị hụrụ m nʼanya?”
O wutere Pita na ọ sịrị ya nke ugboro atọ, “ị hụrụ m nʼanya?” Ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị mazuru ihe niile, ị makwaara na m hụrụ gị nʼanya.”
Jisọs sịrị ya, “Na-azụ atụrụ m. 18Nʼezie, nʼezie asị m gị, mgbe ị bụ okorobịa ị na-eke ajị nʼukwu, gaa ebe ị chọrọ ịga. Ma mgbe ị ghọrọ agadi, ị ga-esetipụ aka gị, onye ọzọ ga-ekee gị ihe okike nʼukwu ma duru gị gaa ebe ị na-achọghị ịga.” 19O kwuru nke a iji gosi ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji nye Chineke otuto. Mgbe nke a mesịrị, ọ sịrị ya, “Soro m.”
20Pita chigharịrị hụ onye ahụ na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya ka ọ na-esokwa ha nʼazụ. (Ọ bụ onyeozi ahụ dabeere ya nʼobi na nri anyasị, nke sịrị, “Onyenwe anyị, onye ga-arara gị nye?”) 21Mgbe Pita hụrụ ya, ọ sịrị Jisọs, “Onyenwe anyị kedụ maka onye a?”
22Jisọs sịrị ya, “Ọ bụrụ na m achọọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-alọghachi gịnị ka nke a bụ nye gị? Soro m.” 23Ya mere, akụkọ a gbasara nʼetiti ụmụnna na onye a na-eso ụzọ ya agaghị anwụ. Ma Jisọs asịghị ya na ọ gaghị anwụ anwụ, kama, “Ọ bụrụ na m chọrọ ka ọ nọgide ruo mgbe m ga-abịa, ọ gbasara gị?”
24Nke a bụ onye ahụ na-eso ụzọ ya onye na-agba ama ihe ndị a niile, ma deekwa ha nʼakwụkwọ. Anyị makwaara na ama ya bụ eziokwu.
25Ma ọ dị ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jisọs mere. Ọ bụrụ na e dee ha niile nʼakwụkwọ, ọ dịghị m ka ụwa niile ọ ga-aba akwụkwọ a ga-ede banyere ha.

¿Sabías que…?
El desayuno junto al mar de Tiberíades
- Entre los reunidos junto al mar de Tiberíades estaban Tomás, llamado también Dídimo —el equivalente griego de su nombre hebreo, que significa “gemelo”— y Natanael, de Caná de Galilea, cuyo nombre significa “don de Dios”. Natanael solo es nombrado en el Evangelio de Juan, que nunca incluye a Bartolomé en la lista, y a los dos se los ha identificado entre sí. También estaban los hijos de Zebedeo, Santiago y Juan, cuyo padre era un pescador galileo, con dos barcas y siervos asalariados.Fuentes: el propio texto bíblico · Thomas · Nathanael · Zebedee
- Simón Pedro, que invita a los demás a ir a pescar, había sido entrenado en ese oficio. Tres veces Jesús se dirige a él como “Simón, hijo de Juan”. El Easton's Bible Dictionary (1897) dice que el nombre del padre debe leerse “Juan”, como en la Revised Version, y no “Jonas”.Fuentes: el propio texto bíblico · Simon Peter · Jonas
- Caná, una ciudad de Galilea cerca de Cafarnaúm y lugar de nacimiento de Natanael, no se menciona en el Antiguo Testamento. Algunos la han identificado con Kana el-Jelil, a ocho o nueve millas al norte de Nazaret; otros, con Kefr Kenna, a unas cinco millas al noreste de Nazaret y a doce millas en línea recta de Tiberíades. Natanael estaba entre aquellos a quienes Jesús se mostró vivo después de la resurrección, en el mar de Tiberíades, y el capítulo llama a esta la tercera aparición de ese tipo a los discípulos.Fuentes: el propio texto bíblico · Cana · Nathanael
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org