Jeremías 52
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ndọta nʼagha a dọtara Jerusalem
1Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị dị ka eze na Jerusalem afọ iri na otu. Aha nne ya bụ Hamutal nwa Jeremaya, onye Libna. 2O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere. 3Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha.
Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn.
4Nʼihi ya, nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya, nʼụbọchị nke iri nʼọnwa nke iri, nke afọ ahụ, Nebukadneza, eze Babilọn, duuru usuu ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ha mara ụlọ ikwu ndị agha nʼazụ obodo ahụ, wuokwa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ. 5Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.
6Nʼabalị nke itoolu, nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri. 7Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Babilọn nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba. 8Ma usuu ndị agha Babilọn chụsoro Zedekaya bụ eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya, 9e jide ya.
Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe a nọ maa ya ikpe. 10Na Ribla ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile, nʼihu ya, o gbukwara ndịisi ọchịchị Juda niile. 11Ọ ghụpụrụ anya Zedekaya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpụrụ ya gaa Babilọn, ebe o tinyere ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ya.
12Nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke ise, nke afọ iri na itoolu, nke ọchịchị Nebukadneza eze Babilọn, Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze, onye na-ejere eze Babilọn ozi, bịarutere Jerusalem. 13O sunyere ụlọnsọ Onyenwe anyị ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ. 14Usuu ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze ahụ, kwaturu mgbidi ahụ niile gbara Jerusalem gburugburu. 15Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buru ụfọdụ nʼime ndị dakarịsịrị nʼogbenye na ndị fọdụrụ nʼime obodo ahụ, ha na ndị ǹka niile fọdụrụ, na ndị ahụ ji aka ha gbakwuru eze Babilọn, bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ. 16Ma Nebuzaradan, hapụrụ ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile.
17Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na Oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, buru bronz ahụ niile bulaa Babilọn. 18Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji ukwu niile, na ihe bronz niile, bụ nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ. 19Ọchịagha ndị nche eze ahụ sikwa nʼụlọnsọ ahụ chịrị ihe ndị a: efere ukwu niile, ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ite niile, ihe ịdọkwasị oriọna niile, ngaji ukwu niile na iko e ji enye onyinye ihe ọṅụṅụ, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ.
20O burukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ehi iri na abụọ e ji bronz kpụọ, bụ nke dị nʼokpuru ya, na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ. 21Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Ị dị gburugburu ya bụkwa mita ise na ụma anọ, nke ọbụla nʼime ha bụ mkpịsịaka anọ. Oghere dịkwa nʼime ha. 22Isi bronz nke e kpụkwasịrị nʼotu ogidi dị mita abụọ na ụma atọ nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya. 23Pomegranet ndị ahụ dị iri itoolu na isii, ọ bụkwa nʼakụkụ ọbụla ka ọ dị. Ọnụọgụgụ pomegranet niile dị nʼelu ihe ahụ a kpụrụ akpụ dị otu narị.
24Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ. 25O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom asaa na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii bụ ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ. 26Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla. 27Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile.
Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ.
28Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ahụ Nebukadneza mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.
Nʼafọ nke asaa nke ọchịchị ya,
puku atọ ndị Juu na iri abụọ na atọ, 3,023.
29Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza,
ka o mere ka narị mmadụ asatọ na iri atọ na abụọ, 832 si na Jerusalem gaa biri nʼala ọzọ.
30Nʼafọ nke iri abụọ na atọ,
Nebuzaradan, onyeisi ndị nche alaeze Babilọn bulara ndị dị narị ndị Juu asaa na iri anọ na ise, 745 ka ha ga biri nʼala ọzọ.
Jehoiakin enwere onwe ya
31Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn. Mgbe ahụ, o mere ka Jehoiakin eze Juda, si nʼụlọ mkpọrọ pụta, nwere onwe ya. O mere nke a nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ. 32Ọ gwara ya okwu ọma, nyekwa ya ọnọdụ ugwu dị elu karịa ọnọdụ ndị eze ndị ọzọ niile ha na ya nọ na Babilọn. 33Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri. 34Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ, ruokwa nʼụbọchị ọnwụ ya.

¿Sabías que…?
La caída de Jerusalén y el destino de los reyes
- Ribla, en la tierra de Hamat, sirvió como cuartel militar del rey Nabucodonosor durante su campaña contra Judá. Allí, el rey Sedequías fue juzgado y cegado tras presenciar la muerte de sus hijos, y líderes judíos, incluidos los sacerdotes Seraías y Sofonías, fueron ejecutados.Fuentes: el propio texto bíblico · Riblah · Zedekiah · Zephaniah
- El capítulo detalla el desmantelamiento de los utensilios sagrados de bronce del templo, incluidas las dos grandes columnas y el Mar de bronce hechos en tiempos del rey Salomón. Nabuzaradán, capitán de la guardia, llevó este bronce junto con objetos de oro y plata a Babilonia.Fuentes: el propio texto bíblico · Solomon · Nebuzar-adan
- El libro concluye con la liberación del rey Joaquín tras treinta y siete años de prisión en Babilonia. El rey Evil-merodac lo trató con bondad, le otorgó ropas reales y le asignó una porción diaria a su mesa por el resto de su vida.Fuentes: el propio texto bíblico · Jehoiachin
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 3, 4, 5, 12, 13, 14, 29
- Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 3, 4, 9, 10, 11, 12, 15, 17, 26, 27, 28, 31, 32, 33, 34
- Arabah · 30.417, 35.151 · versículo 7
- Chaldea · 30.962, 46.104 · versículos 7, 8, 14, 17
- Jericho · Hoy: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · versículo 8
- Hamath · Hoy: Hama · 35.136, 36.750 · versículos 9, 27
- Riblah · Hoy: Rableh · 34.460, 36.573 · versículos 9, 10, 26, 27
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org