Nations Bible

Jeremías 40

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Jeremaya enwere onwe ya

1Mgbe oge nta gasịrị site nʼoge Nebuzaradan ọchịagha ndị nche nọ na Rema mere ka Jeremaya nwere onwe ya, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị. Nebuzaradan hụrụ Jeremaya mgbe e kekọtara ya na ndị e si na Jerusalem na Juda dọta nʼagha agbụ, bụ ndị ahụ a na-ebula Babilọn. 2Mgbe ọchịagha ndị nche eze a hụrụ Jeremaya, ọ sịrị ya, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị nyere iwu na ihe ọjọọ ndị a ga-abịakwasị ala a. 3Ugbu a kwa Onyenwe anyị emeela ka ihe o kwuru mezuo. O wetarala ala a mbibi ahụ. Ma ihe ndị a niile mezuru nʼihi na ndị gị mehiere megide Onyenwe anyị, jụ irubere ya isi. 4Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.” 5Ma tupu Jeremaya atụgharịa ịhapụ ya pụọ, Nebuzaradan gwakwara ya ọzọ sị, “Laghachikwuru Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ na-elekọta obodo Juda niile. Gaa soro ya biri nʼetiti ndị gị, maọbụ i nwere ike gaa ebe ọbụla ọzọ dị gị mma.”

Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ nyere ya ihe oriri hiri nne. O nyekwara ya onyinye, hapụ ya ka ọ laa. 6Ya mere, Jeremaya jekwuuru Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa, soro ya na ndị fọdụrụ nʼala ahụ biri.

Ogbugbu e gburu Gedaliya nʼike

7Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ, 8ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha. 9Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn: birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma. 10Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.”

11Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile, 12ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ.

13Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa 14sị ya, “Ọ bụ na i maghị na Baalis eze ndị Amọn ezitela Ishmel nwa Netanaya ka ọ bịa gbuo gị?” Ma Gedaliya nwa Ahikam ekwetaghị na ọ bụ eziokwu ka ha na-ekwu.

15Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya pụrụ na nzuzo jekwuru Gedaliya na Mizpa sị ya, “Biko, kwere ka m gaa gbuo Ishmel nwa Netanaya. O nweghị onye ga-amata otu o si nwụọ. Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji gbuo gị, ime ka ndị Juu niile na-alọghachikwute gị gbasasịakwa ọzọ, na imekwa ka ndị Juda fọdụrụ laa nʼiyi?”

16Ma Gedaliya nwa Ahikam zara Johanan nwa Kariya sị ya, “Biko, emela ihe dị otu ahụ! Nʼihi na ihe ị na-ekwu banyere Ishmel abụghị eziokwu.”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

Gedalías y el remanente en Mizpa

  • En Ramá, el capitán de la guardia babilónica, Nabuzaradán, liberó a Jeremías de sus cadenas y le ofreció la opción de viajar protegido a Babilonia o quedarse en Judá. Jeremías decidió permanecer y se unió a Gedalías hijo de Ahicam en Mizpa.Fuentes: el propio texto bíblico · Nebuzar-adan · Ramah
  • Nabucodonosor nombró a Gedalías, cuya familia había protegido anteriormente a Jeremías, como gobernador sobre la gente más pobre que quedó en la tierra. Gedalías estableció su sede en Mizpa y animó a los refugiados y oficiales judíos a cultivar la tierra y vivir en paz bajo el dominio babilónico.Fuentes: el propio texto bíblico · Gedaliah · Ahikam · Mizpah
  • El comandante militar Johanán advirtió a Gedalías que Ismael hijo de Netanías había sido enviado por el rey amonita para asesinarlo. Gedalías se negó a creer el informe y rechazó la propuesta de Johanán de eliminar a Ismael en secreto.Fuentes: el propio texto bíblico · Johanan · Ishmael · Gedaliah

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 1, 4, 5, 7, 9, 11
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 1
  • Chaldea · 30.962, 46.104 · versículos 9, 10
  • Ammon · 31.955, 35.934 · versículos 11, 14
  • Edom · 30.746, 35.604 · versículo 11
  • Moab · Hoy: Moab 1 · 31.181, 35.701 · versículo 11

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.