Nations Bible

Jeremías 37

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Jeremaya nʼụlọ mkpọrọ

1Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn mere Zedekaya nwa Josaya eze Juda, nʼọnọdụ Konaya nwa Jehoiakim. 2Ma Zedekaya na ndị ozi ya, na ndị Juda niile egeghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị nke o si nʼọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.

3Zedekaya bụ eze, ziri Jehukal nwa Shelemaya, na Zefanaya onye nchụaja, bụ nwa Maaseia ozi sị ha, jekwuru Jeremaya onye amụma gwa ya okwu sị, “Biko, kpeere anyị ekpere, rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ.”

4Nʼoge a, Jeremaya nweere onwe ya ijegharị nʼetiti ndị Izrel, nʼihi na ha etinyebeghị ya nʼụlọ mkpọrọ. 5Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha.

6Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya onye amụma ntị sị ya, 7“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel kwuru, Ihe ndị a ka ị ga-agwa eze Juda onye zitere ozi sị gị rịọọ m arịrịọ, ‘Ndị agha Fero ahụ si nʼIjipt pụta bịa inyere unu aka ga-emesịa laghachi nʼala ha bụ Ijipt. 8Mgbe ahụ, ndị agha Babilọn ga-alọghachikwa ibuso obodo a agha. Ha ga-emeri ya, dọta ya nʼagha, kpọọkwa ya ọkụ.’

9“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu arafula onwe unu site nʼiche echiche sị, ‘Ndị Babilọn agaghị abịakwa ibuso anyị agha.’ E, ha agaghị abịakwa ọzọ. 10A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.”

11Mgbe ndị agha Babilọn si na gburugburu Jerusalem wezuga onwe ha nʼihi ọbịbịa ndị agha Fero na-abịa, 12Jeremaya sitekwara na Jerusalem pụọ malite ịgawa nʼala ndị Benjamin, nʼihi iketa oke ruuru ya site nʼaka ndị bi nʼebe ahụ. 13Ma mgbe o ruru nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, onyeisi ndị agha aha ya bụ Irija nwa Shelemaya, nwa Hananaya jidere ya, boo ya ebubo sị ya, “Ọ bụ ọsọ ka ị na-agba! Ị na-achọ ịgbakwuru ndị Babilọn!”

14Ma Jeremaya zara sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka ị na-ekwu. Anaghị m agba ọsọ ịgbakwuru ndị Babilọn.” Ma Irija egeghị ya ntị, kama o jidere Jeremaya kpụta ya nʼihu ndịisi ọchịchị. 15Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a.

16E tinyere Jeremaya nʼime ụlọ mkpọrọ olulu, ebe ọ nọrọ ogologo oge. 17Emesịa, Zedekaya bụ eze nyere iwu ka a kpọta ya nʼụlọeze. Mgbe a kpọtara ya, Zedekaya jụrụ ya ajụjụ na nzuzo sị ya, “I nwere okwu site nʼaka Onyenwe anyị?”

Jeremaya zara sị ya, “E, lee, a ga-arara gị nyefee gị nʼaka eze Babilọn.”

18Mgbe ahụ, Jeremaya gwara Zedekaya, bụ eze okwu ọzọ sị ya, “Ihe ọjọọ dị aṅaa ka m mere megide gị, maọbụ megide ndị ọrụ gị, maọbụ megide ndị a, unu ji tinye m nʼụlọ mkpọrọ? 19Ebee ka ndị amụma unu nọ, bụ ndị ahụ na-eburu unu amụma na-asị unu, ‘Eze Babilọn agaghị ebuso unu agha, ọ gaghị ebusokwa ala a agha?’ 20Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.”

21Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche.

¿Sabías que…?

La advertencia y el arresto de Jeremías durante el asedio

  • Durante el asedio babilónico a Jerusalén, el avance del ejército egipcio del faraón provocó la retirada temporal de los caldeos. Aunque esta retirada despertó falsas esperanzas en Judá, Jeremías advirtió al rey Sedequías que las tropas egipcias regresarían a su tierra y los babilonios volverían para conquistar y quemar la ciudad.Fuentes: el propio texto bíblico · Zedekiah
  • Jeremías fue arrestado en la Puerta de Benjamín por el capitán de la guardia, Irías, quien lo acusó de desertar al bando babilónico cuando el profeta solo se dirigía al territorio de Benjamín para atender asuntos de su propiedad. A pesar de negar la acusación, los oficiales lo golpearon y lo encerraron en una celda dentro de la casa del escriba Jonatán.Fuentes: el propio texto bíblico · Gate of Benjamin · Jeremiah
  • El rey Sedequías interrogó a Jeremías en secreto en el palacio y, tras escuchar la súplica del profeta de no ser devuelto a la mazmorra del escriba, ordenó su traslado al patio de la guardia y le asignó una ración diaria de pan de la calle de los panaderos.Fuentes: el propio texto bíblico · Zedekiah

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 1, 17, 19
  • Chaldea · 30.962, 46.104 · versículos 5, 8, 9, 10, 13, 14
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 5, 7
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 5, 11, 12
  • Benjamin Gate · Hoy: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 13

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.