Nations Bible

Jeremías 32

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Jeremaya azụọ ala ubi

1Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke rutere Jeremaya nʼafọ nke iri nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nke bụkwa afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Nebukadneza. 2Nʼoge a, ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. E tinyekwara Jeremaya, bụ onye amụma nʼogige ụlọ ndị nche nke dị nʼụlọeze Juda.

3Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha. 4Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ site nʼaka ndị Babilọn, nʼihi na a ga-enyefe ya nʼaka eze Babilọn, onye ya na ya ga-ekwurịtakwa okwu ihu na ihu. Zedekaya ga-ejikwa anya ya abụọ hụ eze Babilọn, 5onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ”

6Jeremaya sịrị, “Okwu Onyenwe anyị rutere m ntị, sị, 7Lee, Hanamel nwa Shalum, nwanne nna gị, ga-abịakwute gị, sị gị, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼihi na ebe ị bụ onye ikwu m ọ bụ gị ka o ruuru ịzụ ya.’

8“Mgbe ahụ, dịka Onyenwe anyị si kwuo ya, Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutere m nʼogige ndị nche sị m, ‘Zụrụ ala m dị nʼAnatot, nʼime ala ndị Benjamin. Ebe ọ bụ ihe ruuru gị ịgbapụta ya ime ka ọ bụrụ nke gị, ọ bụ gị kwesiri ịzụ ya.’

“Amaara m na nke a bụ okwu Onyenwe anyị. 9Ya mere, azụrụ m ala ahụ dị nʼAnatot site nʼaka nwanna m Hanamel. Atụpụtara m ọlaọcha shekel iri na asaa ọnụahịa ala ahụ, jiri ya kwụọ ya ụgwọ. 10Emesịa, etinyere m aka m nʼakwụkwọ ire ala ahụ, kaa ya akara, nyachie ya, nʼihu ndị akaebe. Atụkwara m ọlaọcha ahụ nʼihe ọtụtụ. 11Eweere m akwụkwọ ịzụta ala ahụ a kara akara, nke a nyachikwara anyachi, ebe e dere ihe banyere ọzụzụ na orire nke ala ahụ, werekwa ụdị akwụkwọ ahụ nke a na-anyachighị anyachi, 12nyefee ha nʼaka Baruk nwa Neraya, nwa Mahseia, nʼihu Hanamel nwanna m, na nʼihu ndị akaebe ndị ọzọ, ndị aka ha dị nʼakwụkwọ ahụ, na nʼihu ndị Juu ndị ọzọ, ndị nọ nʼogige ụlọ ndị agha ahụ.

13“Nʼihu ha, enyere m Baruk iwu ndị a sị ya, 14‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Were akwụkwọ ndị a, ma nke a nyachiri anyachi, ma nke a na-anyachighị anyachi, tinye ha nʼime ite e ji ụrọ kpụọ, ebe ha ga-adị ogologo oge. 15Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, a ga-emesịakwa zụọ ụlọ, ala ubi nakwa ubi vaịnị nʼala a.’

16“Mgbe m nyechasịrị Baruk nwa Neraya akwụkwọ ndị ahụ, ekpere m ekpere nye Onyenwe anyị sị,

17“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ gị sitere nʼike gị dị ukwuu, na aka gị e setịrị eseti mee eluigwe na ụwa. O nweghị ihe ọbụla ị na-enweghị ike ime. 18Ị na-egosi ịhụnanya nye ọtụtụ puku ndị mmadụ ma na-eweta ịta ahụhụ nye ụmụ site nʼihi mmehie nna ha. O Chineke dị ukwuu dịkwa ike, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha gị. 19Nzube gị dị ukwuu, otu a kwa akaọrụ gị dịkwa ukwuu. Anya gị ghere oghe nye ụzọ mmadụ niile. Ị na-akwụghachikwa onye ọbụla dịka ndụ ya na akaọrụ ya si dị. 20Ọ bụ gị mere ihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche nʼIjipt. Ị nọgidekwara na-arụ ha ruo taa, ma nʼala Izrel ma nʼetiti ndị niile nọ nʼụwa. Nʼihi ya, i meere onwe gị aha nke ka bụkwa nke gị nʼebe niile. 21Ọ bụ ihe ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche, nʼaka dị ike, na ogwe aka e setịpụrụ esetipụ, nʼihe oke egwu, ka i ji kpọpụta ndị gị Izrel site nʼIjipt. 22Ị nyere ha ala a, nke ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 23Ha batara nʼala a, nweta ya, ma ha jụrụ irubere gị isi, maọbụ jegharịa nʼiwu gị; ha emeghị ihe ndị i nyere ha nʼiwu mee. Nʼihi ya, i mere ka ihe ọjọọ ndị a bịakwasị ha.

24“Lee ka ndị iro si wuo ihe agha ha gburugburu mgbidi obodo a, ihe agha nke ha ga-eji lụta ya nʼagha. I werela obodo a nyefee ndị Babilọn na-ebuso ya agha nʼaka, nʼihi mma agha na ụnwụ, na oke ọrịa dị nʼime ya. Ihe i kwuru na ọ ga-eme emezuola, dịka i si ahụ ya ugbu a. 25Ma ọ bụ ezie na a ga-enyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, ma gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gwara m sị, ‘Were ọlaọcha zụta ala ahụ. Zụkwaa ya nʼihu ndị akaebe.’ ”

26Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 27“Abụ m Onyenwe anyị, Chineke nke anụ ahụ niile bụ mmadụ. Ọ dị ihe ọbụla karịrị m ime? 28Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ejikerela m ugbu a inyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, na nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, onye ga-alụta ya nʼagha. 29Ndị Babilọn ahụ na-ebuso obodo a agha, ga-abata nʼime ya, kpọọ ya ọkụ. Ha ga-akpọ ya ọkụ, ya na ụlọ niile dị nʼime ya, bụ ụlọ niile ahụ ndị bi nʼime ya nọ kpasuo m iwe, site nʼisure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi Baal nʼelu ụlọ ha niile, na site nʼịwụsara chi ndị ọzọ onyinye ihe ọṅụṅụ.

30“Ọ bụ naanị ihe ọjọọ ka ndị Izrel na ndị Juda mere nʼihu m site na mgbe ha bụ nwantakịrị. Nʼezie, ha esitela nʼihe ha ji aka mee kpasuo m iwe, ka Onyenwe anyị kwuru. 31Site nʼoge e wuru ya ruo ugbu a, ndị bi nʼobodo a akpaliela iwe m na ọnụma m. Ya mere, aga m esite nʼihu m wezuga ha. 32Ndị Izrel na Juda, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, na ndị nchụaja ha, na ndị amụma ha, na ndị ikom Juda, ma ndị bi na Jerusalem, akpasuola m iwe site nʼihe ọjọọ niile ha mere. 33Ha gbakụtara m azụ, jụ ilenye anya nʼebe m nọ. Ọ bụ ezie na m ziri ha ihe mgbe mgbe, ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ịnabata ịdọ aka na ntị m. 34Ha doro oyiyi ihe arụ nʼụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m, si otu a merụọ ya. 35Ha wuru ebe dị elu dị iche iche na Ndagwurugwu nke Ben Hinom nye Baal, ebe ha nọ jiri ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọ aja nye Molek. O nweghị mgbe m nyere ha iwu ime ihe dị otu a, o nweghị mgbe ajọ ihe dị otu a batara m nʼobi, nke i nye ha iwu ime ihe arụ dị otu a, nke ime ka Juda mehie.

36“Ihe i kwuru banyere obodo a bụ, ‘A ga-esite na mma agha, na nʼụnwụ, na nʼoke ọrịa, nyefee ha nʼaka eze Babilọn,’ ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, 37Lee, aghaghị m ịchịkọta ha site na mba ndị ahụ niile m sitere nʼiwe m, na nʼoke ọnụma m chụga ha. Aga m akpọghachite ha nʼebe a, mee ka ha biri nʼudo. 38Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 39Aga m enye ha otu obi na otu ụzọ, ime ka ha na-atụ egwu m, nʼihi ọdịmma nke ha, na ọdịmma nke ụmụ ha ndị ga-eso ha. 40Aga m eme ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ha. Agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma, aga m akwalikwa obi ha ịtụ egwu m. Nʼụzọ dị otu a, ha agaghị esitekwa nʼiso m wezuga onwe ha. 41Obi ga-atọkwa m ụtọ ime ha mma; m ga-ejikwa obi m niile, na mkpụrụobi m niile kụọ ha nʼala a.

42“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Dịka m mere ka ihe ọjọọ ukwuu a niile bịakwasị ndị a, otu a ka m ga-esikwa mee ka ezi ihe ahụ niile m kwere ha na nkwa bịakwasị ha. 43A ga-azụkwa ọhịa nʼala a unu na-asị na ọ bụ ala tọgbọrọ nʼefu, nke mmadụ na anụmanụ na-adịghị nʼime ya, ala nke e nyefere nʼaka ndị Babilọn. 44A ga-ejikwa ọlaọcha zụọ ala ubi, deekwa ihe banyere orire na ọzụzụ ya nʼakwụkwọ. A ga-aka akwụkwọ ndị ahụ akara nʼihu ndị akaebe, nʼala Benjamin, na nʼobodo nta niile dị gburugburu Jerusalem, ma nʼala Juda, na nʼobodo dị nʼala ugwu ugwu, na nke dị na mgbada ugwu niile dị nʼọdịda anyanwụ, na nke dị na Negev, nʼihi na aga m esite nʼobodo ndị ahụ dọtara ha nʼagha buuru ha gaa kpọlata ha. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

La compra de un campo durante el asedio de Jerusalén

  • Los sucesos de este capítulo tuvieron lugar durante el asedio babilónico a Jerusalén en el décimo año del rey Sedequías. Jeremías había sido confinado por el rey en el patio de la guardia del palacio porque profetizaba que la ciudad caería ante el rey Nabucodonosor y que Sedequías sería llevado a Babilonia.Fuentes: el propio texto bíblico · Zedekiah · Nebuchadnezzar
  • Aun estando detenido, Jeremías ejerció su derecho familiar de rescate para comprar un campo en su ciudad natal de Anatot a su primo Hanameel por diecisiete siclos de plata. Siguiendo las costumbres legales de la época, firmó escrituras selladas y abiertas ante testigos y se las entregó a su escriba Baruc para que las guardara en una vasija de barro.Fuentes: el propio texto bíblico · Hanameel · Baruch · Anathoth
  • Esta compra funcionó como una señal profética en medio de una crisis militar desesperada. Aunque la ciudad enfrentaba una inminente destrucción y el destierro debido a su idolatría, Dios aseguró a Jeremías que los campos, casas y viñas volverían a comprarse y venderse en aquella tierra.Fuentes: el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 2, 3, 4, 5, 28, 36
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 32, 44
  • Chaldea · 30.962, 46.104 · versículos 4, 5, 24, 25, 28, 29, 43
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 20, 21
  • Valley of Hinnom · Hoy: Hinnom Valley · 31.769, 35.228 · versículo 35
  • Negeb · 31.245, 34.841 · versículo 44
  • Shephelah · 31.692, 34.875 · versículo 44

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.