Nations Bible

Jeremías 28

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Hananaya onye amụma ụgha

1O ruo, nʼọnwa nke ise nke otu afọ ahụ, nke bụ afọ nke anọ, na mmalite ọchịchị Zedekaya eze Juda, Hananaya, nwa Azoa, onye amụma si Gibiọn, gwara m okwu nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ si m. 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Aga m agbaji agbụ nke eze Babilọn. 3Tupu afọ abụọ agabiga, aga m esi Babilọn bulata ihe ndị ahụ niile Nebukadneza eze Babilọn si nʼụlọnsọ Onyenwe anyị bupụ bulaa Babilọn. 4Aga m akpọlatakwa Jehoiakin nwa Jehoiakim, na ndị niile ọzọ e si na Juda dọta nʼagha bulaa Babilọn, nʼihi na aga m agbaji agbụ ahụ eze Babilọn nyanyere ha nʼolu.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

5Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma zara Hananaya onye amụma nʼihu ndị nchụaja na ndị mmadụ niile guzo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị 6Jeremaya onye amụma sịrị, “Amen! Ka Onyenwe anyị mezuo okwu amụma a i buru site na ibughachite ngwongwo ụlọ Onyenwe anyị na ịkpọghachite ndị niile e mere ka ha si nʼebe a gaa biri na Babilọn. 7Ma gee ntị nụrụ ihe m ga-ekwu nʼihu gị na nʼihu ndị a niile guzo nʼebe a. 8Site na mgbe ochie, ndị amụma ahụ bu mụ na gị ụzọ ebuola amụma banyere agha na mbibi na ọrịa na-efe efe megide ọtụtụ obodo dị iche iche, na ọtụtụ alaeze dị iche iche. 9Ma ihe e ji amata na ọ bụ Onyenwe anyị nʼezie, zitere onye amụma buru amụma kwuo na udo ga-adị, bụ naanị ma ọ bụrụ na amụma ya emezuo.”

10Mgbe ahụ, Hananaya bụ onye amụma yipụrụ Jeremaya agbụ ahụ o yikwasịrị onwe ya nʼolu gbajie ya. 11Ọ sịrị nʼihu ọha mmadụ ahụ niile, “Nke a ka Onyenwe anyị kwuru: ‘Ọ bụ nʼotu aka ahụ ka m ga-agbajipụkwa agbụ ịyagba Nebukadneza, eze Babilọn nyanyere nʼolu mba niile tupu afọ abụọ agabiga.’ ” Mgbe o kwuru otu a, Jeremaya onye amụma hapụrụ ebe ahụ laa.

12Mgbe Hananaya bụ onye amụma gbajisiri ịyagba ahụ Jeremaya, onye amụma nyanyere onwe ya nʼolu, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 13“Gaa gwa Hananaya okwu sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ị gbajiela agbụ e ji osisi mee, ma nʼọnọdụ ya ihe ị ga-enweta bụ agbụ igwe. 14Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru. Aga m anyanye mba ndị a niile agbụ igwe, i mee ka ha fee Nebukadneza eze Babilọn. Ha ga-efekwa ya. Aga m enyekwa ya ike ọ bụladị nʼebe ụmụ anụ ọhịa dị.’ ”

15Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma sịrị Hananaya onye amụma, “Gee ntị, Hananaya! Ọ bụghị Onyenwe anyị zitere gị, ma ị ghọgbuola mba a mee ka ha tụkwasị uche nʼokwu ụgha. 16Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ekpebiela m isite nʼụwa wepụ gị. Ị ga-anwụ nʼafọ a, nʼihi na i kwusaala nnupu isi megide Onyenwe anyị.’ ”

17Nʼọnwa asaa nke afọ ahụ Hananaya onye amụma nwụrụ.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

Jeremías y el falso profeta Hananías

  • Hananías, hijo de Azur de la ciudad benjamita de Gabaón, confrontó públicamente a Jeremías en el templo de Jerusalén durante el cuarto año del rey Sedequías. Profetizó que, en dos años, Dios rompería el yugo de Babilonia, devolvería los utensilios del templo y traería de vuelta al rey Jeconías y a los cautivos.Fuentes: el propio texto bíblico · Gibeon · Zedekiah · Jehoiachin
  • Jeremías llevaba un yugo de madera en el cuello como señal física de sumisión al rey Nabucodonosor de Babilonia. Después de que Hananías le quitó el yugo y lo quebró ante los sacerdotes y el pueblo, Dios declaró mediante Jeremías que el yugo de madera roto sería sustituido por un ineludible yugo de hierro sobre las naciones.Fuentes: el propio texto bíblico · Jeremiah · Nebuchadnezzar
  • Jeremías advirtió a Hananías que el Señor no lo había enviado y que había hecho confiar al pueblo en una mentira. Por haber predicado rebelión contra Dios, se le anunció que moriría ese mismo año, y falleció dos meses después, en el séptimo mes.Fuentes: el propio texto bíblico · Hananiah · Jeremiah

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Gibeon · Hoy: El Jib · 31.847, 35.183 · versículo 1
  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 2, 3, 4, 6, 11, 14

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.