Nations Bible

Jueces 15

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Samsin egbuo ndị Filistia

1Mgbe oge nta gasịrị, nʼoge owuwe ihe ubi, mgbe a na-aghọ ọka, Samsin weere nwa ewu nta, gaa ileta nwunye ya. O gwara nna nwunye ya sị, “Ana m aga nʼọnụụlọ nwunye m.” Ma nna nwunye ya ekweghị ka ọ banye.

2Nna ya sịrị, “O doro m anya na ị kpọrọ nwa m nwanyị asị, ọ bụ nʼihi nke a ka m jiri kenye ya enyi gị nwoke ka ọ bụrụ nwunye ya. Nwanne ya nwanyị nke nta, ọ maghị mma karịa ya? Kpọrọ ya ka ọ nọchie anya ya.”

3Samsin sịrị ha, “Nʼoge a, o ziri m ezi ị bọkwara ọbọ nʼebe ndị Filistia nọ.” Aghaghị m imesi ha ike. 4Ya mere, Samsin pụrụ gaa jide narị nkịta ọhịa atọ, wetakwa ọwa ụfọdụ. O kekọtara ọdụdụ ha abụọ abụọ. O kenyere ọwa nʼagbata otu nkịta ọhịa na ibe ya. 5Emesịa, ọ mụnyere ọkụ nʼọwa ahụ niile. O mekwara ka nkịta ọhịa ndị ahụ dọkpụrụ ọwa a mụnyere ọkụ baa nʼubi ọka ndị Filistia, si otu a rechapụ ọka niile guzoro eguzo nʼubi, na ubi vaịnị niile, ha na osisi oliv niile ọkụ.

6Mgbe ndị Filistia chọpụtara ihe mere, ha jụrụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?” A gwara ha, “Ọ bụ Samsin ọgọ onye Timna, nʼihi na a kpọnyere enyi ya nwunye ya.”

Nʼihi nke a, ndị Filistia niile zukọtara kpọpụta nwaagbọghọ ahụ na nna ya kpọọ ha ọkụ. 7Ma Samsin gwara ha okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu mere ihe dị otu a, agaghị akwụsị tutu m bọrọ ọbọ ihe ọjọọ unu mere.” 8Ya mere, ọ pụkwuru ha ọzọ, site nʼoke iwe, gbuo ọtụtụ mmadụ nʼime ha. Mgbe nke a gasịrị, ọ gara biri nʼime otu ọgba nkume nke Etam.

9Ndị Filistia gara maa ụlọ ikwu ha nʼala Juda, gbasaa nʼala ahụ ruo obodo Lehi. 10Ndị Juda jụrụ ajụjụ sị ha; “Ọ bụ gịnị mere unu ji bịa nʼebe a ibuso anyị agha?”

Ha zara sị, “Anyị na-achọ ijide Samsin, ka anyị megwara ya ihe ọjọọ o mere anyị.”

11Nʼihi nke a, ndị Juda zipụrụ puku ndị agha ka ha gaa jide Samsin nʼọgba nkume ahụ nke Etam. Ndị a bịara jụọ Samsin ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Ọ bụ na ị maghị na ndị Filistia na-achị obodo anyị?”

Samsin zara sị ha, “Ihe m mere bụ imegwata ha ihe ha mere m.”

12Ha sịrị ya, “Anyị abịala ka anyị kee gị agbụ, dọkpụrụ gị, nye nʼaka ndị Filistia.”

Samsin sịrị ha, “Ṅụọrọnụ m iyi na unu agaghị eji aka unu gbuo m.”

13Ha zara sị ya, “Anyị agaghị egbu gị kama anyị ga-eke gị agbụ.” Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya jekwuru ndị Filistia. 14Mgbe ọ na-abịaru Lehi, ndị Filistia tiiri mkpu, bịa izute ya. Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼebe ọ dị ukwuu. Nke a mere ka eriri ahụ e kere ya nʼaka dịrị ka eriri ogho flakisi erere ọkụ, sitekwa nʼaka ya dapụsịa. 15Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia.

16Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị,

“E ji m agba ịnyịnya ibu

mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu.

E ji m agba ịnyịnya ibu

tigbuo puku ndị ikom.”

17Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi.

18Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?” 19Chineke gbawara olulu ahụ nke dị nʼime Lehi, mee ka mmiri si na ya nupụta. Mgbe Samsin ṅụrụ mmiri ahụ, ike ya lọghachiri, mmụọ ya bịaghachikwara. Ya mere, a kpọrọ isi iyi ahụ En-Hakkore. Mmiri ala ahụ ka dịkwa na Lehi nʼebe ahụ ruo taa.

20Ya mere, Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ nʼoge ndị Filistia.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

La Venganza de Sansón y la Fuente en Leji

  • El nombre Leji significa quijada en hebreo. Tras vencer a mil filisteos con una quijada fresca de asno, Sansón llamó al lugar Ramat-leji, que significa elevación de la quijada o altura de Leji.Fuentes: Lehi · Ramath-lehi · el propio texto bíblico
  • Cuando Sansón clamó en medio de una extrema sed y agotamiento tras la batalla, Dios abrió una hendidura en Leji para proveer agua. El manantial resultante fue llamado En-hacore, que significa fuente del que clama.Fuentes: En-hakkore · el propio texto bíblico
  • Durante esta época de cuarenta años de dominio filisteo, tres mil hombres de Judá prefirieron atar a Sansón antes que desafiar a los gobernantes filisteos. Sansón juzgó a Israel durante veinte años bajo este dominio.Fuentes: Philistine Dominion · Judgeship of Samson · el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Ramath-lehi · Hoy: Khirbet es Siyyagh · 31.749, 35.001 · versículo 17

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.