Nations Bible

Jueces 1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

Acerca de este libro

Sobre Jueces

  • El libro se llama Jueces porque contiene la historia de la liberación y del gobierno de Israel por los hombres que llevaban ese título. El diccionario bíblico de Easton (1897) sitúa esa historia en repetidos tiempos de servidumbre bajo pueblos vecinos y de liberación por los jueces, y afirma que la cronología de todo el período es incierta.Fuentes: Easton: Judges, Book of
  • El diccionario bíblico de Easton (1897) sostiene que el autor fue muy probablemente Samuel y que el libro se compuso probablemente durante el reinado de Saúl o al comienzo mismo del reinado de David. Easton señala que las palabras de Jueces 18:30–31 implican una fecha posterior a la toma del arca por los filisteos y a su colocación en Nob, mientras que en el reinado de David el arca estaba en Gabaón.Fuentes: Easton: Judges, Book of
  • Según el esquema de Easton, el libro tiene una introducción (1–3:6) que lo enlaza con el relato de Josué, la historia de trece jueces (3:7–16:31) en cuatro períodos y un apéndice (capítulos 17–21) sin conexión formal con lo anterior. Si se incluyen Elí y Samuel, Easton cuenta quince jueces.Fuentes: Easton: Judges, Book of
  • El esquema de Easton presenta el marco histórico como una sucesión de servidumbres: bajo Cusan-risataim de Mesopotamia, bajo Eglón de Moab, bajo Jabín de Hazor en Canaán, bajo Madián con Amalec y los hijos del oriente, bajo los amonitas junto con los filisteos, y de nuevo bajo los filisteos. Gedeón, llamado también Jerobaal, abre lo que Easton llama el segundo período; Jefté, traído de Tob por los ancianos de Galaad, juzgó a Israel seis años después de librar al pueblo de los amonitas; Sansón, hijo de Manoa, de Zora, fue nazareo de Dios desde su nacimiento.Fuentes: Easton: Judges, Book of · Gideon · Jephthah · Samson
  • El apéndice registra la conquista de Lais por una parte de la tribu de Dan y la casi extinción de Benjamín a manos de las demás tribus, porque Benjamín había ayudado a los hombres de Gabaa. Easton sitúa estos hechos apenas unos años después de la muerte de Josué y dice que muestran la degeneración religiosa y moral del pueblo. Easton también señala que Rut formaba originalmente parte de Jueces y fue separada hacia el año 450 d.C., para quedar en las Escrituras hebreas inmediatamente después del Cantar de los Cantares.Fuentes: Easton: Judges, Book of · Gibeah

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Agha ndị Izrel lụrụ

1Mgbe Joshua nwụrụ, ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị sị, “Olee ebo ga-ebu ụzọ gaa lụso ndị Kenan agha nʼihi anyị?”

2Onyenwe anyị zara, “Ọ bụ ebo Juda. Enyefeela m ala ahụ nʼaka ha.”

3Ndị Juda gwara ụmụ nwanne ha ndị ebo Simiọn sị, “Soronụ anyị banye nʼala ahụ anyị ketara site nʼife nza, ka anyị ga lụso ndị Kenan agha. Anyị ga-esokwara unu banye nʼala nke unu.” Ya mere, ndị ebo Simiọn soro ha gaa.

4Mgbe Juda busoro ha agha, Onyenwe anyị nyefere ndị Kenan, na ndị Periz nʼaka ha, mee ka ha gbuo puku ndị agha iri nʼime obodo Bezek. 5Nʼebe ahụ ka ha zutere Adoni-Bezek, buso ya agha, tigbukwaa ndị Kenan na ndị Periz. 6Ma Adoni-Bezek gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya, ma ha chụgidere ya, jide ya, gbupụ ya isi mkpụrụ aka ya abụọ na isi mkpụrụ ụkwụ ya abụọ.

7Mgbe ahụ, Adoni-Bezek sịrị, “Iri ndị eze asaa ka m mesoro ụdị mmeso a unu mesoro m, ọ bụkwa nri si na tebul m dapụ ka ha riri. Ugbu a Chineke akwụghachila m ụgwọ ọrụ ọjọọ m.” Ha kpụụrụ ya gaa Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ.

8Ndị Juda busoro obodo Jerusalem agha, were mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi nʼime ya, ma gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ.

9Mgbe nke a gasịrị, ndị agha Juda busoro ndị Kenan bi na ndịda ala ugwu ugwu ahụ, bụ Negev, ya na akụkụ ọdịda anyanwụ nʼebe dị ala ala. 10Ha jekwuru ndị Kenan bi nʼobodo Hebrọn (nke a na-akpọ Kiriat Aaba na mbụ) merie Sheshai, na Ahiman, na Talmai. 11Site nʼebe ahụ, ha jekwuru ndị bi na Debịa (nke a na-akpọ Kiriat Sefa, nʼoge mbụ).

12Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.” 13Otniel nwa Kenaz, nwanne nta Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.

14Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”

15Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.

16Ụmụnna nwunye Mosis, onye Ken, si nʼobodo nkwụ nkwụ soro ndị Juda, gaa biri nʼetiti ndị ahụ bi nʼọzara Juda, na Negev, nke dị nso nʼArad.

17Ndị ikom Juda sooro ndị ikom Simiọn, ụmụnna ha, lụso ndị Kenan bi na Zefat agha, bibie obodo ahụ kpamkpam. Nʼihi nke a, a gụgharịrị obodo ahụ, kpọọ ya Homa. 18Ndị agha Juda lụgbukwara obodo Gaza, na Ashkelọn, na Ekrọn, tinyere ala niile gbara ha gburugburu.

19Onyenwe anyị nọnyeekwara ndị Juda mee ka ha kpochapụ ndị niile bi nʼobodo niile dị nʼala ugwu ugwu ahụ. Ma ha enweghị ike ịchụpụ ndị bi nʼala ndagwurugwu ahụ, nʼihi na ndị ahụ nwere ụgbọ agha igwe dị iche iche. 20E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ. 21Ndị ebo Benjamin enweghị ike chụpụ ndị Jebus bi na Jerusalem. Nʼihi nke a, ha soro ụmụ Benjamin biri ruo taa.

22Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. Onyenwe anyị nọnyeere ha. 23Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz, 24ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.” 25Ya mere, nwoke ahụ gosiri ha ụzọ, ha ji mma agha gbuo mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ, ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinaụlọ ya ndụ. 26Emesịa, nwoke ahụ kpọọrọ ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Het wuoro onwe ya otu obodo nʼebe ahụ. Ọ kpọrọ aha obodo ahụ Luz, nke bụkwa aha obodo ahụ ruo taa.

27Manase achụpụghị ndị Bet-Shan na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Teanak na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Doa, maọbụ Ibleam, maọbụ Megido, tinyere obodo nta niile ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Nʼihi na ndị Kenan bigidere nʼebe ahụ. 28Mgbe ụmụ Izrel dịrị ike karịa, ha manyere ndị Kenan ị rụrụ ha ọrụ, ma ha achụpụghị ha site nʼala ahụ. 29Ifrem enwekwaghị ike chụpụ ndị Kenan bi na Gaza. Ndị Kenan gara nʼihu biri nʼetiti ha nʼebe ahụ. 30Otu a kwa, ebo Zebụlọn achụpụghị ndị Kenan bi nʼala Kitrọn, maọbụ na Nahalol, kama ha mere ha ndị ohu na-arụ ọrụ ike. 31Ọzọkwa, ndị ebo Asha achụpụghị ndị niile bi nʼAkọ, na Saịdọn, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, maọbụ Rehob. 32Ndị Asha binyere nʼetiti ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ, nʼihi na ha achụpụghị ha. 33Ndị ebo Naftalị achụpụghịkwa ndị bi na Bet-Shemesh, maọbụ ndị bi na Bet-Anat. Kama ndị Naftalị binyere ndị Kenan bi nʼala ahụ. Ma ndị bi na Bet-Shemesh, na Bet-Anat ghọrọ ndị ohu ndị Naftalị. 34Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ. 35Ma ndị Amọrait nọgidesịrị ike nʼugwu Heres, na Aijalon, na Shaalbim, ma mgbe ike ebo Josef bara ụba, ha meriri ha, mee ha ndị ohu ha. 36Oke ala ụmụ ndị Amọrait malitere na mgbago Akrabim ruo, ma gafeekwa ebe a na-akpọ Sela.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

Las primeras conquistas y desafíos de Israel

  • Como el Neguev era una región árida en el sur, Acsa, la hija de Caleb, le pidió a su padre manantiales de agua además de la tierra que le había asignado, recibiendo tanto las fuentes de arriba como las de abajo.Fuentes: el propio texto bíblico · Achsah · Negeb
  • La narración registra los antiguos nombres cananeos de varios lugares conquistados, incluidos Hebrón (antes Quiriat-arba), Debir (antes Quiriat-séfer) y Betel (originalmente Luz).Fuentes: el propio texto bíblico · Hebron · Bethel (of Palestine)
  • Aunque la tribu de Judá tomó el control de la región montañosa, no pudo expulsar a los habitantes de los llanos porque aquellos defensores contaban con carros de hierro.Fuentes: el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 7, 8, 21
  • Negeb · 31.245, 34.841 · versículos 9, 15, 16
  • Shephelah · 31.692, 34.875 · versículo 9
  • Hebron · Hoy: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · versículos 10, 20
  • Gulloth-mayim · Hoy: within 5 km of Khirbet Rabud · 31.432, 35.015 · versículo 15
  • Lower Gulloth · Hoy: within 5 km of Khirbet Rabud · 31.432, 35.015 · versículo 15
  • Upper Gulloth · Hoy: within 5 km of Khirbet Rabud · 31.432, 35.015 · versículo 15
  • Jericho · Hoy: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · versículo 16
  • Zephath · Hoy: Tel Masos · 31.212, 34.958 · versículo 17
  • Ashkelon · Hoy: Tel Ashkelon · 31.664, 34.546 · versículo 18
  • Ekron · Hoy: Tel Miqne · 31.777, 34.852 · versículo 18
  • Gaza · Hoy: Tell Harube · 31.504, 34.464 · versículo 18
  • Luz · Hoy: Beitin · 31.923, 35.241 · versículo 23
  • Megiddo · Hoy: Tel Megiddo · 32.585, 35.184 · versículo 27
  • Taanach · Hoy: Tell Ta’anakh · 32.522, 35.219 · versículo 27
  • Gezer · Hoy: Tel Gezer · 31.859, 34.919 · versículo 29
  • Acco · Hoy: Tel Akko · 32.921, 35.088 · versículo 31
  • Sidon · Hoy: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · versículo 31

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.