Nations Bible

Hebreos 8

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Onyeisi nchụaja nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ

1Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe. 2Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya.

3A họpụtara onyeisi nchụaja ọbụla ka ọ na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nʼihi nke a, o kwesikwara ka ọ nwee ihe ọ ga-eji na-achụ aja. 4A sịkwarị na ọ nọ nʼụwa, o garaghị a bụ onye nchụaja nʼihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro iwu si dị. 5Ha na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ nke bụ oyiyi na onyinyo banyere ihe nke dị nʼeluigwe. Ọ bụ nke a mere e ji dọọ Mosis aka na ntị mgbe ọ na-akwado iwu ụlọ ikwu ahụ, “Lezie anya hụ na i mere ihe niile nʼusoro dị ka e si gosiri gị nʼelu ugwu.” 6Ma otu ọ dị, ọ natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka ọ dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.

7Ọ bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, ọ garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ. 8Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe ọ sịrị,

“Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara,

mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ

dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,

nakwa ụlọ Juda.

9Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ

mụ na nna nna ha gbara,

mgbe m jidere ha nʼaka

site nʼala Ijipt dupụta ha,

nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m.

Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ,

ka Onyenwe anyị kwupụtara.

10Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel,

mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Aga m etinye iwu m nʼime uche ha,

dekwasị ya nʼobi ha.

Aga m abụ Chineke ha,

ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

11Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,

maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’

nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,

site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.

12Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,

agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”

13Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ọ pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

El verdadero tabernáculo y un nuevo pacto

  • Hebreos 8 llama copia y sombra de lo que está en el cielo al lugar en el que sirven los sacerdotes. Por eso se advirtió a Moisés, cuando estaba por construir el tabernáculo, que hiciera todo conforme al modelo que se le mostró en el monte.Fuentes: el propio texto bíblico
  • El nuevo pacto prometido a la casa de Israel y a la casa de Judá se contrasta con el pacto hecho con sus padres, cuando fueron sacados de Egipto, la tierra del Nilo.Fuentes: el propio texto bíblico · Egypt
  • Al hablar de un nuevo pacto, el capítulo dice que el primero ha quedado anticuado y que lo anticuado y envejecido pronto desaparecerá.Fuentes: el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 9

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.