Hebreos 3
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Jisọs dị ukwuu karịa Mosis
1Ya mere, ụmụnna m dị nsọ, ndị so keta oke nʼọkpụkpọ eluigwe ahụ, ka echiche unu dịgide naanị na Jisọs. Onyeisi ozi na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị. 2O kwesiri ntụkwasị obi nye onye ahụ họpụtara ya dịka Mosis si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼije ozi ya nʼụlọ Chineke. 3Ma Jisọs nwere ugwu na nsọpụrụ karịa Mosis, dịka onye na-ewu ụlọ si enwe ugwu na nsọpụrụ karịa ụlọ o wuru. 4Nʼihi na ụlọ ọbụla nwere onye wuru ya, maọbụ Chineke na-ewu ihe niile. 5Mosis kwesiri ntụkwasị obi dịka odibo nʼụlọ Chineke nʼihe niile, sịkwa otu a gbaa ama banyere ihe ndị a ga-ekwu nʼọdịnihu. 6Ma otu ọ dị, Kraịst kwesiri ntụkwasị obi dịka ọkpara nke na-elekọta ụlọ ya. Anyị gabụkwanụ ụlọ ya ma ọ bụrụ na anyị ejidesie okwukwe anyị ike ya na olileanya nke anyị ji anya isi.
Ịdọ aka na ntị banyere ekweghị ekwe
7Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị,
“Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,
8unu emela ka obi unu sie ike,
dị ka unu mere nʼoge nnupu isi
mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,
9ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa.
Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a.
10Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ.
Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile.
Ha amatabeghị ụzọ m niile.’
11Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị,
‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”
12Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa. 13Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. 14Anyị bụ ndị anyị na Kraịst ga-eso kekọrịta oke ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ya ike bụ ntụkwasị obi ahụ anyị nwere site na mmalite ruo ọgwụgwụ. 15Dị ka e kwuru ya,
“Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya.
Unu emela ka obi unu sie ike,
dịka unu mere nʼoge nnupu isi.”
16Olee ndị bụ ndị ahụ nụrụ ma nupu isi? Ọ bụ na ọ bụghị ndị niile ahụ Mosis dupụtara site nʼala Ijipt? 17Ọ bụkwa olee ndị ka o wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mehiere. Ndị ahụ ahụ ha dara nʼọzara? 18Olee ndị ahụ ọ ṅụụrụ iyi na ha agaghị aba nʼizuike ya? Ọ bụ na ha abụghị ndị ahụ nupuuru ya isi? 19Ugbu a, anyị maara na ha enweghị ike ịbanye, nʼihi na ha bụ ndị na-ekweghị ekwe.

¿Sabías que…?
Mayor gloria que Moisés
- Hebreos pide a sus lectores que fijen la atención en Jesús, el apóstol y sumo sacerdote que confiesan. Fue fiel a quien lo designó, así como Moisés fue fiel en toda la casa de Dios, pero Jesús es considerado digno de mayor gloria que Moisés, como el constructor de una casa tiene más honra que la casa misma. Moisés fue fiel como siervo; Cristo es fiel como Hijo sobre la casa de Dios.Fuentes: el propio texto bíblico
- La advertencia se vuelve hacia el pueblo que Moisés sacó de Egipto. Durante cuarenta años en el desierto pusieron a Dios a prueba; Dios estuvo enojado con aquella generación y juró que nunca entrarían en su descanso, y sus cuerpos cayeron en el desierto. El capítulo dice que la incredulidad les impidió entrar.Fuentes: el propio texto bíblico
- Egipto, la tierra que dejaron con Moisés, es la tierra del Nilo y de las pirámides. El diccionario bíblico de Easton (1897) explica el nombre Moisés como sacado, o lo vincula con la palabra egipcia mesu, que significa hijo.Fuentes: el propio texto bíblico · Egypt · Moses
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 16
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org