Nations Bible

Ezequiel 37

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Ndagwurugwu ọkpụkpụ kpọrọ nkụ

1Aka nke Onyenwe anyị dịkwasịrị m, o sitekwara nʼike Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bulie m, debe m nʼetiti ndagwurugwu nke jupụtara nʼọkpụkpụ. 2O mere ka m jegharịa nʼetiti ha. Ahụrụ m ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, nke dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, ka ha ghasa na ndagwurugwu ahụ. 3Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a ha pụrụ ịdị ndị ọzọ?”

Asịrị m, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ọ bụ naanị gị onwe gị maara.”

4Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ọkpụkpụ ndị ahụ, gwa ha, ‘Unu ọkpụkpụ niile kpọrọ nkụ, geenụ ntị nʼokwu nke Onyenwe anyị. 5Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa ọkpụkpụ ndị a. Lee, aga m eme ka ume baa nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. 6Aga m etinyekwasị unu akwara, na anụ ahụ, werekwa akpụkpọ ahụ kpuchie unu. Aga m etinye ume nʼime unu, unu ga-adịkwa ndụ. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

7Ya mere, eburu m amụma dịka e sị nye m nʼiwu. Mgbe m nọ na-ebu amụma ahụ, anụrụ m ụzụ, ụzụ mkpọtụ. Ma lee, ọkpụkpụ ndị ahụ niile bịara ibe ha nso; ọkpụkpụ malitekwara ijikọta onwe ha ọnụ. 8Mgbe m nọkwa na-ele anya, lee, ahụrụ m ka akwara na anụ ahụ malitere ịbịakwasị nʼelu ọkpụkpụ ndị ahụ, akpụkpọ ahụ kpuchikwara elu ha. Ma nʼoge a ume ọbụla adịghị nʼime ha.

9Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Buo amụma nye ifufe; buo amụma, nwa nke mmadụ, sị ifufe, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: site nʼakụkụ anọ nke ụwa bịa, gị ume na-enye ndụ, kukwasị ndị a e gburu egbu ka ha dịkwa ndụ ọzọ.’ ” 10Ya mere, eburu m amụma dịka o si nye m nʼiwu. Ume ndụ banyekwara nʼime ha. Ha niile dịịrị ndụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ ha, ghọọ usuu ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.

11Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ọkpụkpụ ndị a nọchiri anya ụlọ Izrel niile. Ha na-asị, ‘Anyị aghọọla ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, olileanya niile agwụkwala, anyị abụrụla ndị e bipụrụ.’ 12Nʼihi ya, buo amụma gwa ha, ‘otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ndị m, aga m emeghe ili unu, si nʼebe ahụ wepụta unu. Aga m eme ka unu lọghachitakwa nʼala Izrel. 13Nʼikpeazụ, mgbe m meghere ili unu mee ka unu si nʼime ya pụta, unu bụ ndị m ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 14Aga m etinye Mmụọ m nʼime unu, unu ga-adị ndụ, lọghachikwa nʼala unu ọzọ. Unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya, meekwa ya, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

Otu mba, otu eze

15Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 16“Nwa nke mmadụ, were osisi dee ihe ndị a nʼelu ya, ‘Osisi a nọchiri anya Juda na ndị Izrel e kekọtara ya na ha ọnụ.’ Werekwa osisi ọzọ deekwa okwu ndị a nʼelu ya. ‘Osisi a nọchiri anya Ifrem, na Josef, na ndị Izrel niile e jikọtara ha na ndị a ọnụ.’ 17Jidekọtaa osisi abụọ ndị a ọnụ, mee ka ha bụrụ otu osisi nʼaka gị.

18“Mgbe ndị gị jụrụ gị, ‘Ị gaghị egosi anyị ihe nke a pụtara?’ 19gwa ha, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, agaje m iwere osisi Josef, nke dị Ifrem nʼaka, nke bụkwa ihe nọchiri anya ebo ụfọdụ ndị Izrel, jidekọtaa ya na osisi nọchiri anya Juda, mee ha ka ha ghọọ otu osisi, bụrụkwa otu nʼaka m.’ 20Were mkpirisi osisi ndị ahụ i dere ihe nke dị nʼaka gị, gosi ha, 21ma gwakwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m esite na mba niile ndị Izrel jere biri kpọpụta ha. Aga m achịkọtakwa ha site nʼakụkụ niile, kpọbata ha nʼala nke aka ha. 22Aga m eme ha ka ha bụrụ otu mba nʼala ahụ, nʼugwu niile nke Izrel. Ha ga-enwe naanị otu eze nke ga-achị ha niile. Ha agaghị abụkwa mba abụọ maọbụ alaeze abụọ ọzọ. 23Ha agaghị ejikwa arụsị ha niile, maọbụ ihe a pịrị apị rụrụ arụ, maọbụ jiri ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche merụọ onwe ha ọzọ. Nʼihi na aga m azọpụta ha site na ịlaghachi azụ nʼụzọ mmehie ha niile, meekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha.

24“ ‘Ohu m, Devid, ga-abụ eze ga-achị ha, ha ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ha ga-edebezu iwu m niile, na ụkpụrụ m niile. 25Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi. 26Mụ na ha ga-agba ndụ udo, ọgbụgba ndụ nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m agọzi ha, mee ka ha baa ụba. Nʼetiti ha kwa ka ụlọnsọ m ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. 27Ebe obibi m ga-abụkwa nʼetiti ha. E, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m. 28Mgbe ụlọnsọ m ga-adị nʼetiti ha ruo ebighị ebi, mba niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-edo Izrel nsọ.’ ”

¿Sabías que…?

El valle de los huesos secos y la restauración de Israel

  • Ezequiel es llevado por el Espíritu a un valle lleno de huesos secos, a los cuales Dios identifica como toda la casa de Israel, que afirmaba haber perdido la esperanza. Por medio de las palabras del profeta, los huesos se unen, reciben carne y piel, y cobran vida con el aliento de los cuatro vientos, simbolizando cómo Dios sacaría a su pueblo del exilio para restaurarlo en su tierra.Fuentes: el propio texto bíblico
  • Dios le ordena a Ezequiel escribir en dos varas de madera separadas —una para Judá y otra para José y Efraín— y unirlas para que formen una sola en su mano. Esta señal representa la reunificación de los reinos divididos del norte y del sur en una sola nación, guiada por un único pastor llamado David.Fuentes: el propio texto bíblico · Ephraim · David
  • Al pueblo restaurado se le promete habitar para siempre en la tierra dada a Jacob, bajo un pacto eterno de paz. Dios declara que establecerá su santuario en medio de ellos para siempre, como testimonio de su santificación ante las naciones.Fuentes: el propio texto bíblico · Jacob (Israel)

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.