Ezequiel 35
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Amụma megide Edọm
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, chee ihu imegide nʼugwu Sia, buo amụma megide ya, 3sị ya, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Mụ onwe m na-emegide gị, gị ugwu Sia. Aga m esetikwa aka m imegide gị, mee gị ka ị ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. 4Obodo gị niile ka m ga-eme ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe, gị onwe gị ga-abụkwa ebe tọgbọrọ nʼefu. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
5“ ‘Nʼihi na i sitere nʼiro ahụ dị gị nʼobi siterịị na mgbe ochie rara ụmụ Izrel nye nʼaka mma agha, nʼoge ha nọ na-ahụju anya, nʼoge ahụ ịta ahụhụ nke ajọ omume ruru nʼogo dị ukwuu. 6Nʼihi nke a, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m enyefe gị nʼaka ndị na-awụsi ọbara. Ọbara ga-achụkwa gị ọsọ. Ebe ọ bụ na ị kpọghị iwusi ọbara asị, ọbara a ga-awụsị nʼime gị ga-achụ gị ọsọ. 7Aga m eme ka ugwu Sia ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Aga m esitekwa nʼime ya bipụ ndị na-abata abata, na ndị na-apụ apụ. 8Ugwu ukwu gị niile ga-ejupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ, ugwu nta niile, na ndagwurugwu niile na mgbawara niile dị nʼala ga-ejupụta nʼozu ndị e ji mma agha gbuo. 9Ị gaghị ebulitekwa isi gị ọzọ. Ebe tọgbọrọ nʼefu ka ị ga-abụ ruo ebighị ebi. A gaghị ewuzikwa obodo gị ọzọ. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
10“ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Mba abụọ ndị a, na ala abụọ ndị a ga-abụ nke anyị, anyị ga-enweta ha,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ. 11Nʼihi ya, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m emeso gị mmeso dịka ịba ụba nke iwe gị na ekworo gị si dị, bụ nke i gosiri mgbe ị kpọrọ ha asị. Aga m emekwa ka ha mata onye m bụ, mgbe m kpesịrị gị ikpe. 12Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nụrụ okwu ọjọọ ndị ahụ niile i kwuru megide ugwu Izrel niile, na-asị, “E meela ha ebe tọgbọrọ nʼefu, ewerela ha nyefee anyị nʼaka ka anyị dọgbuo ha.” 13Unu nyakwara isi megide m, kwuo okwu kwugide m dịka o si dị unu mma. Anụkwara m ihe niile unu kwuru. 14Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Mgbe ụwa niile na-aṅụrị ọṅụ ka m ga-eme ka ị ghọọ mkpọmkpọ ebe. 15Dịka ị ṅụrịrị ọṅụ mgbe ihe nketa Izrel ghọrọ mkpọmkpọ ebe, otu a ka m ga-esi mesoo gị mmeso. Ị ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu, gị ugwu Sia, gị na ndị Edọm niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

¿Sabías que…?
Profecía Contra el Monte Seír
- En la geografía bíblica, el monte Seír es sinónimo de la escarpada región montañosa de Edom, situada al este del Arabá y extendiéndose hacia el sur en dirección al golfo de Áqaba. Ezequiel se dirige directamente al monte Seír como la personificación poética de toda la nación edomita.Fuentes: Mount Seir · Edom · el propio texto bíblico
- El oráculo reprende a Edom por albergar una antigua hostilidad contra Israel y aprovecharse de su ruina para intentar adueñarse de Israel y de Judá. Debido a que Edom se burló y se regocijó con la devastación de Israel, la profecía declara que sus propios montes, valles y ciudades quedarán convertidos en desolación perpetua.Fuentes: el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Edom · 30.746, 35.604 · versículo 15
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org