Ezequiel 31
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Fero dịka osisi sida nke Lebanọn
1O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha,
“ ‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?
3Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa,
nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya.
Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn,
nke jupụtara nʼalaka mara mma,
nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo,
nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
4O nwetara mmiri mere ka o buo ibu,
na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo.
Iyi ha niile
na-asọ nʼokpuru ya.
Ebe ahụ ka ha si ezipu
ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
5Nʼihi ya, o toro tokarịa
osisi niile nʼogologo.
Ngalaba ya bara ụba,
alaka ya topụkwara ogologo
nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
6Nʼalaka ya niile
ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ,
nʼokpuru ndo nke alaka ya niile
ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ,
oke mba niile dị iche iche
bikwara nʼokpuru ndo ya.
7Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya,
nʼogologo nke alaka ya nʼawasa,
nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba
nʼebe mmiri dị ukwuu.
8Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige
erughị ya nʼọtụtụ.
Ọ dịghị osisi junipa niile
nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya,
osisi plenụ niile
adịghịkwa ka alaka ya,
ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige,
nke yiri ya nʼịma mma ya
9Emere m ya ka ọ maa mma
site nʼịba ụba nke alaka o nwere,
ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden
nʼubi Chineke a gbara ogige.
10“ ‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ, 11Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ. 12Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha. 13Ụmụ nnụnụ niile bere nʼelu ukwu osisi ahụ dara ada, nʼetiti alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa bịara biri. 14Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ.
15“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya. 16Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma. 17Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche.
18“ ‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo.
“ ‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”

¿Sabías que…?
El cedro caído del Líbano
- Ezequiel emplea la metáfora de un imponente cedro del Líbano —una célebre cordillera en Siria— para ilustrar la grandeza y el repentino colapso del imperio asirio como advertencia directa al faraón y a Egipto.Fuentes: el propio texto bíblico · Lebanon · Assyria · Pharaoh
- La alegoría describe el majestuoso árbol como superior en altura y esplendor a todos los árboles del jardín de Dios, o Edén, una antigua región fértil situada a lo largo de los grandes ríos de Asia occidental.Fuentes: el propio texto bíblico · Eden
- A causa de su orgullo, el gran árbol es talado por despiadados conquistadores extranjeros y arrojado al Seol, demostrando que ningún imperio o gobernante terrenal está exento de la mortalidad y del juicio.Fuentes: el propio texto bíblico · Pharaoh
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 2, 10, 18
- Assyria · 36.359, 43.153 · versículos 3, 15
- Lebanon · 33.540, 35.584 · versículos 3, 15, 16
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org