Ezequiel 21
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Babilọn, mma agha Chineke
1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel 3sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume. 4Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda. 5Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’
6“Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa. 7Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba, ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”
8Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 9“Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha,
a mụọla ya, hichakwaa ya.
10Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị,
hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma.
“ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.
11“ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ,
ka e jidekwa ya nʼaka.
A mụọla ya, hichazie ya.
E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.
12Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike,
nʼihi na ọ bụ megide ndị m
ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile.
A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha,
ha na ndị m.
Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.
13“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
14“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ.
Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ,
ka mma agha gbuo ugboro abụọ
e, ọ bụladị ugboro atọ.
Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu,
nke e debere maka oke ogbugbu
nke ga-abịachibido ha gburugburu.
15Ka obi ha gbazee site nʼegwu,
ka ndị na-ada ada hie nne,
nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile
maka oke ogbugbu.
Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma,
etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.
16Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla,
ma ọ nọ gị nʼaka nri
ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.
17Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m,
ime ka iwe m jụrụ.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”
18Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 19“Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ. 20Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike. 21Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ, nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ. 22Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha. 23Ọ ga-adị ha dịka ọjụjụ ase nke na-abaghị uru, nye ndị ahụ ṅụrụ ha iyi, ma ọ ga-echetara ha ihe ọjọọ ha mere, dọkpụrụ ha nʼike.
24“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha.
25“ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula, 26ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu. 27Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’
28“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha:
“ ‘Lee mma agha, lee mma agha,
nke a mịpụtara maka oke ogbugbu.
E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa,
ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.
29Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu,
na a jụtakwala ase ụgha banyere unu,
a ga-etinye ya nʼolu
ndị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu,
bụ ndị ụbọchị ha rurula,
ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.
30“ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya.
Nʼebe ahụ e kere unu
nʼala nna nna unu ha,
Aga m ekpe unu ikpe.
31Aga m awụkwasị unu ọnụma m,
kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m.
Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike,
ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.
32Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ.
A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu.
Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ,
nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’ ”
¿Sabías que…?
La Espada Desenvainada y la Adivinación en la Encrucijada
- Ezequiel describe al rey de Babilonia en una encrucijada decidiendo si atacar Rabá, la principal ciudad de los amonitas al este del Jordán, o Jerusalén. Para tomar su decisión, el rey recurre a tres prácticas de adivinación antiguas: echar suertes agitando flechas, consultar ídolos e inspeccionar el hígado de un animal.Fuentes: el propio texto bíblico · Rabbah
- El capítulo emplea la imagen poética de una espada afilada y pulida que brilla como un relámpago para retratar el inminente juicio. Ezequiel acompaña este mensaje con acciones físicas dramáticas, siendo instruido a gemir amargamente, golpearse el muslo y aplaudir con las manos.Fuentes: el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 20, 21, 22, 23
- Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 19, 21, 23
- Ammon · 31.955, 35.934 · versículos 20, 28
- Rabbah · Hoy: Amman · 31.955, 35.934 · versículos 20, 21
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org