Ezequiel 10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ebube Chineke apụọ
1Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị. 2Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, “Baa nʼetiti ụkwụ ụgbọala ahụ dị nʼokpuru cherubim ndị ahụ. Site nʼetiti cherubim ndị ahụ kpojuo icheku ọkụ nke na-ere ere nʼaka gị, fesachaa ha nʼime obodo ahụ niile.” Ọ bara nʼime ka m nʼele ya anya.
3Cherubim ndị ahụ na-eguzo nʼakụkụ ndịda nke ụlọnsọ ahụ mgbe nwoke ahụ banyere. Igwe ojii jupụtakwara nʼogige ime ụlọnsọ ahụ. 4Mgbe ahụ, ebube Onyenwe anyị sitere nʼelu cherubim bilie, bịa guzo nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Ụlọnsọ ahụ jupụtakwara nʼigwe ojii, ihe nke ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼogige ụlọnsọ ahụ. 5Ụzụ nke nku cherubim ndị ahụ na-eme dịkwa ka olu Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. A na-anụkwa ụzụ nku ndị ahụ nʼogige ụlọnsọ ahụ dị nʼezi.
6Mgbe Onyenwe anyị nyere nwoke ahụ yi uwe ezi akwa ọcha iwu, sị, “Gaa nʼetiti cherubim ahụ gụta ụfọdụ icheku ọkụ dị nʼetiti wịịlu ụgbọala ahụ,” nwoke ahụ banyere guzo nʼakụkụ otu wịịlu ahụ. 7Mgbe ahụ, otu nʼime ndị cherubim ahụ setịpụrụ aka ya nʼebe ọkụ ahụ dị nʼetiti ha. Ọ gụtara ụfọdụ icheku ọkụ tinye nʼaka nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha onye weere ya pụọ. 8Nʼokpuru nku ndị cherubim ahụ ka a na-ahụta ihe yiri aka mmadụ.
9Elere m anya hụ wịịlu anọ, nke dị nʼakụkụ cherubim ndị ahụ. Cherubim ọbụla nwere otu wịịlu nʼakụkụ ya. Wịịlu ndị a niile na-egbu maramara dịka nkume beril. 10Wịịlu anọ ndị ahụ yiri onwe ha. Nke ọbụla nʼime ha dịka wịịlu a rụnyere nʼetiti wịịlu ọzọ. 11Mgbe ha na-aga, ha niile na-eche ihu nʼakụkụ ọbụla nke cherubim ndị ahụ chere ihu. Wịịlu ndị a adịghị echigharị echigharị mgbe cherubim ndị a na-agagharị. Kama ebe isi cherubim ndị ahụ chere ihu ka wịịlu ndị ahụ na-aga. Ha adịghị elekwa anya nʼazụ dịka ha na-aga. 12Gburugburu ha, nʼanụ ahụ ha niile, ma nʼazụ ha, ma nʼaka ha, ma na nku ha, ma na wịịlu ndị ahụ, ihe jupụtara ha bụ anya. Anya dị nʼakụkụ ha niile. 13Aha m nụrụ a na-akpọ wịịlu ndị ahụ bụ, Ọgba gburugburu. 14Nke ọbụla nʼime cherubim ndị a nwere ihu anọ. Ihu nke mbụ dịka ihu cherub. Nke abụọ dịka ihu mmadụ; nke atọ dịka ihu ọdụm, ma nke anọ dịka ihu ugo.
15Mgbe ahụ, Cherubim ndị ahụ buliri onwe ha elu. Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ nke m hụrụ na mbụ nʼakụkụ osimiri Keba. 16Mgbe cherubim ndị ahụ na-aga, wịịlu ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha na-aga. Mgbe ha na-achili nku ha i si nʼala bulie onwe ha elu, wịịlu ha na-anọgidekwa nʼakụkụ ha. 17Mgbe cherubim ndị ahụ guzoro nʼotu ebe, wịịlu ahụ na-eguzokwa. Mgbe ha na-ebuli onwe ha elu, wịịlu ndị ahụ na-ebulikwa onwe ha elu, nʼihi na mmụọ nke ihe ahụ dị ndụ dị nʼime ha.
18Emesịa, ebube nke Onyenwe anyị sitere na mbata ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ pụọ, gaa guzo nʼelu cherubim ndị ahụ. 19Mgbe m nọ na-ele anya, cherubim ahụ gbasapụrụ nku ha felie, wịịlu ha niile dịkwa nʼakụkụ ha. Ha guzoro na mbata ọnụ ụzọ nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọ Onyenwe anyị, na ebube nke Chineke nke Izrel dịkwa nʼelu ha.
20Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ, nke m hụrụ nʼokpuru Chineke Izrel nʼakụkụ osimiri Keba, amatara m na ha bụ cherubim. 21Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ na nku anọ, na ihe yiri aka mmadụ nʼokpuru nku ha. 22Ihu ha yikwara ihu ihe ndị ahụ m hụrụ nʼakụkụ osimiri Keba. Nke ọbụla na-agakwa ije nʼihu ihu na-eleghị anya nʼazụ.

¿Sabías que…?
La gloria del Señor y los querubines
- Ezequiel identifica de manera explícita a los seres alados y las complejas ruedas de esta visión del templo con los seres vivientes que había visto antes junto al río Quebar en Babilonia, donde residía una comunidad de exiliados judíos.Fuentes: el propio texto bíblico · Chebar
- En la visión, un hombre vestido de lino recibe carbones encendidos de entre las ruedas situadas bajo los querubines para esparcirlos sobre la ciudad, mientras la gloria del SEÑOR se aparta del umbral del templo y se sitúa sobre los querubines hacia la puerta oriental.Fuentes: el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org