Nations Bible

Ester 2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Esta aghọọ eze nwanyị

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ka iwe eze Ahasuerọs dajụrụ, ọ malitere iche echiche banyere Vashti. O chetara ihe Vashti mere, chetakwa ihe e kpebiri banyere ya. 2Mgbe ahụ, ndị na-ejere eze ozi sịrị ya, “Ka anyị gaa chọtara eze ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke mara mma ile anya. 3Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi. 4Emesịa, nwaagbọghọ ahụ ihe ya masịrị eze karịa ga-abụ nwunye eze nʼọnọdụ Vashti.” Ntụpụta a tọrọ eze ụtọ nke ukwuu. O nyere ha ike ka ha malite na-atụfughị mgbe.

5Nʼoge a, enwere otu onye Juu nọ nʼobodo Susa nke ewusiri ike, a na-akpọ Mọdekai nwa Jaịa, nwa Shimei, nwa Kish, onye Benjamin. 6Ọ bụ onye a dọtara nʼagha mgbe Nebukadneza bibiri Jerusalem. Nʼoge ahụ, e mere ka ọ hapụ obodo ya gaa biri na Babilọn bụkwa oge a dọtakwara Jekonaya eze ndị Juda na ọtụtụ ndị ọzọ nʼagha. 7Mọdekai nwere nwa nwanne nna ya, aha ya bụ Hadasa, ma a na-akpọkwa ya Esta, onye mara mma nʼahụ dịkwa mma ile anya. Nne ya na nna ya anwụọla, ma Mọdekai kpọbatara ya nʼụlọ ya zụọ ya dịka nwa ya nwanyị.

8Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze nyere, e mere ka ọtụtụ ụmụ agbọghọbịa bịa na Susa, nʼime ụlọ ukwu eze. Ọ bụkwa Hegai na-elekọta ha niile. A kpọbatakwara Esta nʼụlọeze nyefee ya Hegai nʼaka, onye na-elekọta ebe obibi ndị iko nwanyị eze. 9Ọ masịrị ya, ọ natakwara ihuọma nʼebe ọ nọ. Ngwangwa ọ malitere inye ya nri pụrụ iche, na ihe ndị ahụ niile e ji edozi ahụ na ịchọ mma. O sitere nʼetiti ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọeze họpụta ụmụ agbọghọ asaa ndị na-ejere Esta ozi. O duuru ya na ndị na-ejere ya ozi dubaa nʼebe kachasị mma nʼogige ebe ndị inyom eze bi.

10Ma Esta agwabeghị onye ọbụla obodo ya maọbụ ihe banyere ezinaụlọ ya, nʼihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla. 11Ụbọchị niile, Mọdekai na-abịa nʼogige ụlọ ndị inyom na-ajụ ase otu Esta mere, nʼịchọpụta otu ihe si agara ya.

12Tupu o ruoro nwaagbọghọ ọbụla ibakwuru eze Sekses, ọ ga-anọzu ọnwa iri na abụọ nʼebe a na-achọ ya mma dịka iwu e nyere banyere ịchọ mma ndị inyom si dị. A ga-eji mmanụ máá chọọ ya mma ọnwa isii, werekwa mmanụ isi ụtọ dị iche iche, na ihe ịchọ mma ndị ọzọ kwadoo ya nʼime ọnwa isii nke ọzọ. 13Nʼụzọ dị otu a, ka nwaagbọghọ ọbụla ga-adị gakwuru eze, bụ Sekses. A na-enye ya ihe ọbụla ọ chọrọ site nʼebe obibi ha nke o ji aba nʼụlọeze. 14A na-eme ka ọ banye nʼụlọeze nʼanyasị, ma nʼụtụtụ, ọ na-alọghachi nʼụlọ ọzọ nke dị nʼebe ụmụ nwanyị eze bi. Nʼebe ahụ ka Shashgaz, onozi eze nọ na-elekọta ndị iko nwanyị eze. Ọ gakwaghị alọghachi nʼebe eze ọzọ karịakwa ma ihe ya ọ masịrị eze, eze akpọọ ya ka ọ bịaghachi ọzọ.

15Mgbe oge Esta (ada Abihail, onye bụ nwanne nna Mọdekai, onye kpọọrọ nwantakịrị nwaagbọghọ a ka ọ bụrụ nwa nke ya) ga-eji gaa nʼihu eze ruru, ọ nabatara ndụmọdụ Hegai, onozi ahụ na-elekọta ndị inyom. Ọ hụtara amara nʼihu mmadụ niile ndị hụrụ ya. 16E mere ka Esta bakwuru eze nʼọnwa nke iri nʼafọ nke asaa nke ọchịchị eze Ahasuerọs.

17Eze hụrụ Esta nʼanya karịa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ niile. Ọ natara amara na mmasị eze karịa ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ọzọ. Ya mere, o weere okpueze kpukwasị ya nʼisi mee ya eze nwanyị nʼọnọdụ Vashti. 18Eze kpọrọ oke oriri, nʼihi Esta, nye ndịisi ọchịchị ya niile na ndị ozi ya niile. Ọ kpọsara ezumike nye ndị ọrụ niile nʼalaeze ya, ma kesaakwa onyinye nye ọtụtụ ndị mmadụ dịka eze pụrụ ime.

Atụmatụ ọjọọ Mọdekai chọpụtara

19Mgbe a chịkọtara ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke nke ugboro abụọ, Mọdekai nọ ala nʼọnụ ụzọ ama eze. 20Ma Esta emebeghị ka onye ọbụla mara ihe banyere ezinaụlọ ya maọbụ obodo ya, dịka Mọdekai nyere ya nʼiwu, nke ọ na-emeri mgbe a na-azụlite ya.

21Otu ụbọchị, mgbe Mọdekai nọ nʼọrụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọ ukwu eze, ndị onozi abụọ eze nwere, aha ha bụ Bigtan na Teresh, ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọeze nche, were iwe megide eze. Ha gbara izu kpebie na ha ga-egbu eze Sekses. 22Ma Mọdekai chọpụtara nzube ọjọọ a gwa ya Esta, nwunye eze, onye gwara eze, meekwa ka eze mata na ọ bụ Mọdekai gwara ya. 23Mgbe e nyochara kwu a, chọpụta na ọ bụ eziokwu, e jidere mmadụ abụọ ahụ kwụgbuo ha nʼosisi. E dekwara ihe ndị a niile nʼihu eze nʼime akwụkwọ akụkọ ihe e mere.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

El ascenso de Ester como reina

  • Ester tenía originalmente el nombre hebreo Hadasa, que significa "mirto", pero pasó a llamarse Ester (derivado del vocablo persa para "estrella") en la corte persa. Huérfana de la tribu de Benjamín, fue criada por su primo Mardoqueo, quien le indicó guardar en secreto su origen judío.Fuentes: Esther · el propio texto bíblico
  • Las jóvenes llevadas a la ciudadela de Susa pasaban por una rigurosa preparación de doce meses bajo el cuidado del funcionario Hegai. El tratamiento requería seis meses con aceite de mirra y otros seis meses con perfumes y cosméticos antes de presentarse ante el rey.Fuentes: Hegai · el propio texto bíblico
  • Estando sentado a la puerta del palacio, Mardoqueo descubrió una conspiración de dos guardias, Bigtán y Teres, para asesinar al rey Asuero. La reina Ester informó sobre la traición en nombre de Mardoqueo, y el suceso quedó formalmente registrado en las crónicas reales.Fuentes: el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Susa · Hoy: Shush · 32.189, 48.258 · versículos 3, 5, 8
  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículo 6
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 6

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.