Nations Bible

Daniel 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Daniel nʼọgba ọdụm

1Ọ dị Daraiọs mma ịhọpụta ndịisi dị otu narị na iri abụọ, ndị ga-anọ nʼalaeze ahụ niile dịka ndị nnọchite anya eze. 2O họpụtakwara ndịisi atọ ọzọ dịka ndịisi ha, nke otu onye nʼime ha bụ Daniel. Ndị a bụ ndị ga na-agụkọrọ ha otu ihe si aga, ka ihe ọbụla ghara ifunarị eze. 3Ọ dịghị anya, ọ pụtara ihe nye eze na Daniel kwesiri ntụkwasị obi karịa ndịisi na ndị nlekọta ahụ niile. Nʼihi na amamihe ya, na ike ọrụ ya dị ukwuu. Nke a mere ka eze chee echiche kpebie ime ya onyeisi nʼalaeze niile. 4Nʼihi nke a, ndịisi ọkwa ha dị elu na ndịisi ndị ọzọ bidoro chọwa mkpesa ha ga-enye iji megide Daniel nʼihe gbasara ọchịchị. Ma ọ dịghị ihe ebubo ọbụla maọbụ omume ọjọọ ọbụla ha chọpụtara, nʼihi na ọ kwesiri ntụkwasị obi. Ọ dịghịkwa omume ọjọọ maọbụ nke aghụghọ ọbụla a chọpụtara nʼọrụ ya. 5Nʼikpeazụ, ndị ikom a sịrị, “O nweghị otu anyị ga-esi chọta ihe a ga-eji boo nwoke a bụ Daniel ebubo, karịakwa nʼihe metụtara iwu ofufe Chineke ya.”

6Ya mere, ndịisi ndị a na ndị ozi ndị ahụ kpebiri jekwuru eze ahụ sị ya, “Eze Daraiọs, dịrịkwa ndụ ruo mgbe niile! 7Ndịisi alaeze gị niile, ndị ukwu na ndị nta, ndị na-anọchi anya eze na ndị ndụmọdụ na ndị ị tinyere ka ha na-achị zukọtara kpebie na eze kwesiri inye iwu nke ga-ekwu na a chọghị ka onye ọbụla rịọọ ihe ọbụla nʼaka chi maọbụ nʼaka mmadụ ọbụla karịa gị eze, site nʼoge i nyere iwu a tutu iri ụbọchị atọ agafee. Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm. 8Anyị chọkwara ka gị bụ eze kwagide iwu a ma jirikwa aka gị dee aha gị nʼakwụkwọ iwu ahụ. Nʼihi na anyị chọrọ ka ọ bụrụ iwu nke na-agaghị enwe mgbanwe, nke a na-apụghị ịkagbukwa akagbu, dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị.” 9Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ.

10Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ. 11Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ. 12Ha jekwuru eze sị ya, “I chetakwara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla ekwesighị ịrịọ chi ọzọ maọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, tutu iri ụbọchị atọ agafee, na onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm?”

Eze sịrị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Midia na Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.”

13Mgbe ahụ, ha gwara eze, “Daniel, onye bụ otu nʼime ndị si Juda a dọtara nʼagha adịghị aṅa gị ntị, gị onye a na-asọpụrụ, maọbụ nye iwu ahụ i nyere bụ nke e dere nʼakwụkwọ. Ọ nọkwa na-ekpe ekpere ya ugbo atọ nʼụbọchị.” 14Obi jọrọ eze njọ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ndị a. O kpebiri nʼobi ya ime ihe niile ịhụ na Daniel ataghị ahụhụ. Ya mere, ụbọchị ahụ niile, site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, ọ nọ na-eche otu ọ ga-esi mee nke a.

15Mgbe ahụ, ndị ikom ndị a bịakwutere eze sị ya, “Chetakwa, gị eze, na dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị, ọ dịghị iwu ọbụla eze nyere maọbụ ụkpụrụ nke e mere ka o guzosie ike ga-agbanwe.”

16Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.”

17E wetara nkume dị ukwuu jiri mechie ọnụ olulu ọdụm ahụ. Eze jikwa mgbaaka akara ya na mgbaaka ndịisi ọzọ kaa akara e ji nyachie ọnụ olulu ahụ. E mere nke a ka ọnọdụ Daniel hapụ ịgbanwe. 18Mgbe eze lọbatara nʼụlọeze ya, o dinara nʼihe ndina ya buo ọnụ, onweghịkwa nri ebutere ya. Nʼabalị ahụ, o nweghị ike rahụ ụra.

19Nʼìhè mbụ nke ụtụtụ, mgbe chị na-abọ, eze biliri mee ngwangwa, gaa nʼolulu ọdụm ahụ. 20Mgbe ọ bịaruru nso olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel oku nʼolu obi ntiwa sị, “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị ahụ ị na-efe mgbe niile, o nwekwara ike ịzọpụta gị nʼaka ọdụm?”

21Ya mere, Daniel sịrị eze, “Eze, dịrị ndụ ruo mgbe niile! 22Chineke m zitere mmụọ ozi ka o mechie ọnụ ọdụm ndị a, ka ha si otu a hapụ inwe ike ịmetụ m aka, nʼihi na Chineke maara na aka m dị ọcha. Ọ makwaara na o nweghị ihe ọbụla m mere mejọọ gị.”

23Ọṅụ juru eze ahụ obi! O nyere iwu ka e si nʼime olulu ahụ dọpụta Daniel. Mgbe a kpọpụtara Daniel, o nweghị ihe ọbụla a hụrụ mere ya nʼahụ, nʼihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi.

24Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala.

25Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa.

“Ka ọ dịrị unu na mma.

26“Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel.

“Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ,

nke na-adịgide ebighị ebi.

E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi,

ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ.

27Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa.

Ọ na-eme ihe ịrịbama na-arụkwa ọrụ ebube

nʼeluigwe na nʼụwa.

Nʼihi na ọ gbapụtara Daniel

site nʼike ọdụm.”

28Ya mere, ihe gaara Daniel nke ọma nʼoge niile Daraiọs bụ eze, na nʼoge Sairọs onye Peshịa chịkwara dịka eze.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

Daniel en el foso de los leones

  • El capítulo destaca un principio característico conocido como la ley de los medos y de los persas, el cual establecía que un decreto u ordenanza real oficial, una vez firmado y sellado, no podía ser revocado ni modificado, ni siquiera por el propio rey.Fuentes: el propio texto bíblico
  • Incluso tras décadas en el exilio, Daniel mantuvo la costumbre de arrodillarse a orar tres veces al día en su aposento alto, con las ventanas abiertas hacia Jerusalén, la ciudad santa de Judá.Fuentes: el propio texto bíblico · Jerusalem
  • El relato describe una estructura administrativa imperial de 120 sátrapas supervisados por tres administradores principales, señalando que Daniel prosperó durante el reinado de Darío y hasta el reinado de Ciro el Persa, el conquistador de Babilonia.Fuentes: el propio texto bíblico · Cyrus

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 10

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.