Daniel 10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ọhụ Daniel hụrụ banyere otu nwoke
1Nʼafọ atọ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, e nyere Daniel (onye aha ya bụkwa Belteshaza mkpughe). Ozi ahụ bụ eziokwu, ọ gbasakwara oke ọgbaaghara. Ọ ghọtara ozi ahụ, nwetakwa nkọwa banyere ọhụ ahụ.
2Nʼoge ahụ, mụ onwe m, bụ Daniel, ruru ụjụ izu ụka atọ. 3Erighị m nri ọma ọbụla, erikwaghị m anụ, aṅụkwaghị m mmanya, eteghị m mmanụ otite ọbụla nʼahụ m nʼime izu ụka atọ a niile.
4Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ, eguzo m nʼakụkụ osimiri ukwu ahụ, bụ Taịgris, 5eleliri m anya m elu, hụ nʼihu m otu nwoke yi uwe akwa ọcha, onye e kekwasịrị belịt e ji ọlaedo sitere Ụfaz mee nʼukwu ya. 6Ahụ ya na-egbukwa maramara dịka nkume beril, ìhè si nʼihu ya dị ka ìhè nke amụma eluigwe. Mkpụrụ anya ya na-enwukwa dịka ire ọkụ. Ụkwụ ya na aka ya na-acha dịka bronz e hichara nke ọma. Okwu si ya nʼọnụ na-ada ụda dịka ụzụ nke ọtụtụ mmadụ.
7Ọ bụ naanị m Daniel hụrụ ọhụ a. Ndị mụ na ha nọ ahụghị ya, kama na mberede, e mere ka oke egwu tụọ ha, nke mere ka ha gbara ọsọ gaa zoo onwe ha. 8Ọ bụkwa naanị m nọ, mgbe m hụrụ oke ọhụ a. Mgbe m hụkwara ya, ike niile dị m nʼahụ si m nʼahụ pụọ. Ihu m gbanwere nke ukwuu, ike afọdụkwaghị m nʼahụ. 9Mgbe ahụ, anụrụ m ụda olu ya, ma mgbe m nụrụ ụda olu ya, adara m nʼala kpudo ihu nʼala nʼọnọdụ ịda nʼoke ụra.
10Ma otu aka metụrụ m, welite m mee ka m maa jijiji nʼelu ikpere m na aka m abụọ. 11Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji.
12Ọ sịrị m, “Egwu atụla gị, Daniel. Nʼihi na site nʼụbọchị mbụ i kpebiri inwe nghọta na iweda onwe gị ala nʼihu Chineke gị, ka a nụrụ okwu gị niile, a bịakwara m nʼihi ọsịsa ha. 13Ma onyeisi ndị na-achị alaeze Peshịa gbochiri m, kemgbe iri ụbọchị abụọ na otu. Ya mere, Maikel, otu nʼime ndịisi ọchịchị bịara nyere m aka, nʼihi na mụ onwe m fọdụrụ nʼebe ahụ mụ na eze Peshịa. 14Ugbu a, abịala m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị nʼoge ikpeazụ nʼụbọchị dị nʼihu. Nʼihi na ọhụ ndị a dịrị oge ndị na-abịa nʼihu.”
15Mgbe ọ na-agwa m okwu ndị a, ekpunyere m ihu m nʼala enwekwaghị m ike ikwu okwu ọbụla. 16Mgbe ahụ, otu onye, nke yiri mmadụ, bịara metụ egbugbere ọnụ m aka, mee ka m nwee ike ikwukwa okwu ọzọ. Mgbe ahụ agwara m onye ahụ nke guzo m nʼihu, “Anọ m nʼoke ihe mgbu; Onyenwe m, enwekwaghị m ike ọbụla, nʼihi ọhụ m hụrụ. 17Olee otu mụ bụ ohu gị ga-esi gwa gị okwu, Onyenwe m? Nʼihi na ike adịghịkwa nʼime m, enwekwaghị m ike iku ume.”
18Mgbe ahụ, otu onye yiri mmadụ bịara metụkwa m aka ọzọ nye m ike. 19Ọ sịrị, “Onye a hụrụ nʼanya nke ukwu, atụkwala ụjọ, udo dịrị gị, ya mere dịrị ike, obi sie gị ike.”
Mgbe ọ gwara m okwu a, ike m lọghachitere, asịrị m, “Ka onyenwe m kwuo okwu, ebe i nyeghachila m ike.”
20Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ị maara ihe mere m ji bịakwute gị? Aga m alaghachi azụ ịlụso onyeisi na-achị alaeze Peshịa ọgụ, mgbe mụ ga-apụ, eze na-achị Griis ga-abịa; 21ma otu ọ dị, aga m agwa gị ihe e dere nʼakwụkwọ nke eziokwu. (Ọ dịghị onye na-enyere m aka imegide ha ma ọ bụghị naanị Maikel onyeisi unu.

¿Sabías que…?
Una Visión Junto al Río Tigris
- La visión tiene lugar en el tercer año de Ciro, el gobernante persa que conquistó Babilonia y promulgó el decreto que permitió el regreso de los exiliados judíos. Daniel recibe la revelación junto al río Tigris, conocido antiguamente en hebreo como Hidekel.Fuentes: el propio texto bíblico · Cyrus · Hiddekel
- El mensajero celestial lleva un cinto de oro refinado de Ufaz. Los comentaristas bíblicos suelen identificar Ufaz con Ofir o la relacionan con regiones célebres en la antigüedad por el comercio de oro.Fuentes: el propio texto bíblico · Uphaz
- El mensajero menciona a Miguel, señalándolo como uno de los principales príncipes y el protector del pueblo de Daniel. En la tradición bíblica, Miguel es un líder angélico encargado del cuidado especial de la nación de Israel.Fuentes: el propio texto bíblico · Michael
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Persia · 34.806, 48.516 · versículos 1, 13, 20
- Tigris · Hoy: Tigris River · 31.004, 47.442 · versículo 4
- Greece · 37.972, 23.727 · versículo 20
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org