Hechos 5
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Ananayas na Safaịra
1Ma otu nwoke a na-akpọ Ananayas na nwunye ya bụ Safaịra rekwara ala nke ha. 2Na nkwekọrịta ya na nwunye ya, o zoro ụfọdụ ego site nʼego ha retara nʼala ha ahụ, weta nke fọdụrụ bịa tọgbọ nʼụkwụ ndị ozi.
3Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị? 4Ọ bụghị gị nwe ala ahụ tupu e ree ya? Mgbe e rechara ya, ego e retara ya ọ bụghị nke gị, iji mee ka ị chọrọ? Gịnị mere i ji chee echiche ime ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghaara ụgha kama ọ bụ Chineke.”
5Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nʼala nwụọ, egwu jidekwara ndị niile nụrụ ihe mere. 6Ụmụ okorobịa ndị nọ ebe ahụ batara jiri akwa kee ozu ya bupụ ya ga lie.
7Mgbe ihe dịka awa atọ gasịrị, nwunye ya batakwara, ma ọ matabeghị ihe mere di ya. 8Pita jụrụ ya, gwa m, “ọ bụ ego ole a ka gị na di gị retara ala ahụ?”
Ọ sịrị, “E, ọ bụ ego ole ahụ ka anyị retara ya.”
9Pita sịrị ya, “Gịnị mere unu jiri kpebie ịnwa Mmụọ nke Onyenwe anyị ọnwụnwa? Gee ntị, nzọ ụkwụ ndị buuru di gị gaa lie nọ nʼọnụ ụzọ. Ha ga-ebupụkwa gị.”
10Nʼotu oge ahụ ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, nwụọ, ụmụ okorobịa ahụ liri di ya batakwara chọpụta na ọ nwụọla, buru ya pụọ gaa lie ya nʼakụkụ di ya. 11Oke egwu tụrụ nzukọ ahụ niile, tụọkwa ndị niile nụrụ akụkọ banyere ihe ndị a.
Ọrụ ebube na ọrụ ịtụnanya
12Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị ukwuu nʼetiti ndị mmadụ. Ha niile na-ezukọ na mgbe ụlọ Solomọn. 13O nweghị onye ọbụla kwere iso ha ọzọ, nʼagbanyeghị na ọtụtụ mmadụ na-asọpụrụ ha. 14Ma otu ọ dị, ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwanyị kwere nʼOnyenwe anyị sonyere ha. 15Nʼihi nke a, ndị mmadụ bupụtara ndị ọrịa nʼokporoụzọ nibe ha nʼute na ihe ndina, ka ọ ga-abụ mgbe Pita na-agafe onyinyo ya ga-adakwasị ụfọdụ nʼime ha. 16Igwe mmadụ zukọtara site nʼobodo ndị dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị nrịa nrịa, na ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu, a gwọkwara ha niile.
Mkpagbu nke ndị ozi
17Mgbe ahụ onyeisi nchụaja na ndị otu ya so nʼotu ndị Sadusii ka ekworo jupụtara obi. 18Ha jidere ndị ozi a tụba ha nʼụlọ mkpọrọ nke ọha mmadụ. 19Ma nʼoge abalị mmụọ ozi Onyenwe anyị meghere ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ kpọpụta ha sị, 20“Gaanụ, guzoronụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ gwa ndị mmadụ ozi niile nke ndụ ọhụrụ a.”
21Mgbe ha nụrụ nke a, nʼisi ụtụtụ, ha banyere nʼụlọnsọ ukwu malite izi ihe.
Ma mgbe onyeisi nchụaja na ndị soo ya bịarutere, ha kpọrọ nzukọ ndị Sanhedrin nke bụ ọgbakọ jikọtara ndị okenye Izrel niile. Ha zipụrụ ozi ka e site nʼụlọ mkpọrọ kpụta ha. 22Ma mgbe ndị ahụ ha zipụrụ ruru nʼụlọ mkpọrọ, ha ahụghị ndị ozi ahụ. Ha lọghachiri azụ kọọrọ ndị ọgbakọ ahụ ihe ha hụrụ, 23“Anyị hụrụ ka a kpọchiziri ụlọ mkpọrọ ahụ nke ọma, ndị nche guzokwa nʼọnụ ụzọ ya. Ma mgbe anyị meghere ụlọ mkpọrọ ahụ, anyị ahụghị onye ọbụla nʼime ya.” 24Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị, ha na-eche ihe nke a ga-apụta.
25Nʼotu oge ahụ, otu onye gbabatara gwa ha, “Leenụ! Ndị ahụ unu tụbara nʼụlọ mkpọrọ guzo ugbu a nʼime ụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe.” 26Ngwangwa, onyeisi agha na ndị agha ya gara nʼụlọnsọ ahụ jide ndị ozi ahụ ma kpụta ha, ma ha ejighị ike mee nke a nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume.
27Mgbe a kpụtara ha, e mere ka ha guzoro nʼihu ọgbakọ ndị Sanhedrin, onyeisi nchụaja jụrụ ha ajụjụ, 28sị, “Ọ bụ anyị adọghị unu aka na ntị ka unu kwụsị ikuzi ihe nʼaha a; ma unu emeela ka ozizi unu jupụta Jerusalem niile kpebiekwa ime ka ọbara nwoke a dịrị anyị nʼisi.”
29Pita na ndị ozi ndị ọzọ zara sị, “Anyị ga-erubere Chineke isi ọ bụghị mmadụ. 30Chineke nna nna anyị a kpọlitela Jisọs site nʼọnwụ bụ onye ahụ unu gburu site nʼịkpọgide ya nʼelu osisi. 31Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie. 32Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.”
33Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbawara ha obi, ha chọọ igbu ha. 34Ma otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, bụrụkwa onye ozizi iwu a na-asọpụrụ, aha ya bụ Gamaliel, biliri ọtọ nʼetiti ọgbakọ ahụ, nye iwu ka a kpọpụ ndị ozi ahụ nʼezi nwa oge nta. 35Ọ sịrị ha, “Ndị Izrel, leziekwanụ anya nke ọma ihe unu na-achọ ime ndị a. 36Nʼoge gara aga Teodas pụtara na-egosi na ya bụ onye pụrụ iche, ihe dịka narị mmadụ anọ sokwara ya, mgbe e gburu ya, ndị niile sooro ya gbasasịrị ihe niile a kwụsịkwa. 37Mgbe nke ya gasịrị, Judas onye Galili pụtakwara gosi onwe ya nʼoge a na-agụ ọnụọgụgụ mmadụ, o nwetakwara ndị sooro ya. Mgbe e gbukwara ya, ndị niile na-eso ya gbasasịrị. 38Ya mere, agwa m unu, hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, ọ ga-akwụsị mgbe na-adịghị anya. 39Ma ọ bụrụ na o sitere nʼaka Chineke, unu agaghị enwe ike ịkwụsị ndị ikom ndị a, unu ga-achọpụta naanị na unu na-alụso Chineke ọgụ.”
40Ọgbakọ ahụ nabatara ndụmọdụ ya. Ha kpọrọ ndị ozi ahụ pịa ha ihe, nyekwa ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu nʼaha Jisọs, hapụkwa ha ka ha laa.
41Mgbe ha hapụrụ ọgbakọ ahụ, ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na-agụnyere ha na ndị kwesiri ịnara mkparị nʼihi aha ya. 42Ụbọchị niile, nʼime ụlọnsọ ukwu ma nʼụlọ ndị mmadụ ha na-akụzi ma na-ekwusa oziọma na Jisọs bụ Kraịst ahụ.

¿Sabías que…?
Engaño, prodigios y el Sanedrín
- Ananías, miembro de la iglesia de Jerusalén, y su esposa Safira, cuyo nombre significa hermosa, vendieron un terreno y, con conocimiento de ella, se quedaron con parte del precio mientras llevaban el resto a los apóstoles. Él podría haber conservado la propiedad; Pedro le recordó que seguía a su disposición tanto antes como después de la venta. La falta fue la mentira: él afirmó haberlo entregado todo, Safira confirmó el precio falso, y ambos murieron; ella compartió su culpa y su castigo.Fuentes: Ananias (Husband of Sapphira) · Sapphira · el propio texto bíblico
- Los creyentes se reunían de común acuerdo en el Pórtico de Salomón, donde los apóstoles realizaban muchas señales y prodigios. Esa columnata estaba probablemente en el lado oriental del templo. No se menciona en relación con el primer templo, aunque Josefo se refiere a un pórtico de ese nombre en el templo de Herodes.Fuentes: Solomon's Portico · el propio texto bíblico
- Cuando el sumo sacerdote y sus compañeros, que pertenecían al partido de los saduceos, hicieron arrestar a los apóstoles, un fariseo llamado Gamaliel se levantó en el Sanedrín. Es descrito como maestro de la ley, honrado por todo el pueblo, hijo del rabino Simeón y nieto del famoso rabino Hilel, y como adversario de los saduceos; instó al consejo a dejar en paz a esos hombres. Señaló a Teudas, que había encabezado una insurrección contra la autoridad romana y, según el relato de Gamaliel, reunió a unos cuatrocientos hombres antes de que el levantamiento quedara en nada —fuera de eso, no se sabe nada más de Teudas— y a Judas el galileo, que pereció en los días del censo.Fuentes: Gamaliel · Theudas · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Solomon’s Portico · Hoy: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 12
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 16, 28
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículo 37
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org