Hechos 27
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Pọl agaa Rom
1Mgbe e kpebiri na anyị ga-eso ụgbọ mmiri gaa Itali, e nyefere Pọl na ndị mkpọrọ ọzọ nʼaka onyeisi na-elekọta ndị mkpọrọ aha ya bụ Juliọs. Ọ bụ ọchịagha nke igwe ndị agha Ọgọstọs. 2Anyị banyere nʼụgbọ sitere Adramitiọm nke na-ejikere ịga nʼọnụ mmiri nke dị nʼakụkụ obodo Eshịa. Anyị nupuru nʼoke osimiri, Arịstakọs, onye Masidonia sitere na Tesalonaịka sokwa anyị nʼije a.
3Nʼechi ya, anyị rutere Saịdọn. Juliọs nwere obiọma nʼebe Pọl nọ. Ọ hapụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ọbịa nke ọma. 4Nʼịgakwa nʼihu na mmiri ahụ, anyị zutere ifufe mmiri nke mere na anyị gara nʼazụ ala Saiprọs. 5Anyị gafere ọnụ mmiri obodo Silisia na Pamfilia. Anyị bịaruru Mira nʼime obodo Lisia. 6Nʼebe ahụ ka onye ọchịagha hụrụ ụgbọ onye Alegzandria nke na-aga Itali. O mere ka anyị banye nʼime ya. 7Ụgbọ anyị ji, gara nwayọọ ọtụtụ ụbọchị na o siiri anyị ike irute Snidos. Ebe ọ bụ nʼoke ifufe ekweghị ka anyị gaa nʼihu, anyị enwekwaghị ike ịga nʼụzọ anyị, kama anyị si nʼazụ Kriit na ncherita ihu Salmone gafee. 8Anyị jikwa nwayọọ na-agba nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ tutu ruo mgbe anyị sitere nʼoke nsogbu rute ebe a na-akpọ ọnụ mmiri ọma, nke dị nso nʼobodo Lasia.
9Anyị tufuru oge nʼebe ahụ. Ije ụgbọ mmiri abụrụkwala nke jupụtakwara nʼihe ize ndụ ugbu a, nʼihi na mmemme Obubu ọnụ nke ndị Juu agafeela. Nʼihi nke a, Pọl dụrụ mmadụ niile ọdụ, 10na-asị, “Ndị nwe m, a na m ahụta na njem a ga-abụ nke ihe egwu nke ga-eweta oke ịla nʼiyi. Ọ bụghị naanị nke ụgbọ mmiri na ibu o bu, ma metụtakwa ndụ anyị.” 11Ma ọchịagha ahụ kwenyere nʼihe onyeisi ụgbọ na onye nwe ụgbọ kwuru karịa nke Pọl kwuru. 12Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda.
Oke ifufe nʼosimiri
13Mgbe ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda, ha chere na nke a bụ ohere dịrị ha. Nʼihi ya, ha kwọpụrụ ụgbọ nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri Kriit. 14Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata. 15Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku. 16Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ. 17Emesịa, anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nʼọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị na Satis. Ha wedatara akwa e kobere nʼelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga. 18Mgbe chi bọrọ, dịka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụbasị ngwongwo ndị dị nʼụgbọ ahụ nʼime osimiri. 19Nʼụbọchị nke atọ ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọbụla nke aka ha ghọtara nʼime osimiri. 20Mgbe ọtụtụ ụbọchị gara ma ọ dịghị anyanwụ maọbụ kpakpando wapụtaranụ, ma oke ifufe ọjọọ ahụ gara nʼihu na-amagharị, nʼikpeazụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị gwụsịrị.
21Nʼoge a niile, o nweghị onye ọbụla nri ọbụla bara ọnụ. Ma nʼikpeazụ. Pọl kwụụrụ ọtọ nʼetiti ha sị, “Ndị ikom ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nʼokwu m na mbụ, anyị agaraghị ahapụ Kriit. Anyị gara agbanarị mbibi na ịla nʼiyi nke a. 22Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu a ga-atụfu ndụ ya. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu. 23Nʼihi na nʼabalị gara aga, mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m, 24ọ sịrị, ‘Atụla egwu Pọl, nʼihi na ị ghaghị iguzo nʼihu Siza. Nke ọzọkwa, Chineke emeela amara nye gị ndụ ndị a niile gị na ha so nʼụgbọ eme njem.’ 25Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m. 26Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.”
Ụgbọ imikpu
27Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso. 28Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu. 29Ma egwu juru ha obi nʼihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara arịlịka anọ e ji ejide ụgbọ site nʼazụ ụgbọ ahụ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ. 30Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ. 31Ma Pọl gwara ndị agha na ọchịagha ha okwu, “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị nʼime ụgbọ a, agaghị azọpụta unu.” 32Nʼihi nke a, ndị agha ahụ gbubiri ụdọ e jiri kee ụgbọ epeepe ahụ hapụ ụgbọ epeepe ahụ ka ọ daba nʼime osimiri.
33Mgbe chi bidoro ịbọ, Pọl rịọrọ mmadụ niile ka ha rie nri, na-asị, “Taa mere ya ụbọchị iri na anọ unu nọ na nche, nọgidekwa nʼibu ọnụ, nʼerighị ihe ọbụla. 34Nʼihi ọdịmma nke ndụ unu, ana m arịọ unu ka unu rie ihe. Nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼime unu otu agịrị isi ya ga-ala nʼiyi.” 35Mgbe o kwuchara nke a, o weere achịcha nye Chineke ekele nʼihu ha niile, nyawaa ya, malitekwa iri ya. 36Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ niile nʼobi, ha bidokwara iri nri. 37Anyị niile nọ nʼụgbọ ahụ dị narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii. 38Mgbe anyị richara nri, ha buuru akpa ọka niile dị nʼụgbọ ahụ tụba ha nʼime osimiri ime ka ụgbọ ahụ gbaa mfe.
Omimi nke ụgbọ mmiri ahụ
39Mgbe chi bọrọ, ha enwekwaghị ike ịghọta akụkụ mmiri nke ha nọ nʼime ya. Ma ha hụrụ obosara ala nta nke nwere ọnụ mmiri. Ha gbara izu ịchọpụta ma ọ ga-ekwe mee ka ụgbọ mmiri ahụ site nʼebe ahụ gafee. 40Ha chabisiri arịlịka niile ji ụgbọ ahụ, hapụ ha nʼime osimiri. Otu aka ahụkwa, ha tọpụrụ ụdọ ji ụmara e ji anyagharị ụgbọ. Mgbe ahụ, ha weliri akwa ifufe nke ọnụ ụgbọ nye ifufe, mekwa ka ụgbọ mmiri chee ihu nʼelu ala. 41Ma ụgbọ mmiri ahụ gara maa isi na mkpumkpu aja mmiri, mikpuo nʼaja. Ọnụ ụgbọ ahụ mikpuru nke ukwuu mee ka isi ụgbọ ahụ laa elu, nke a nyere ebili mmiri a ohere iji ike tiwasịa azụ ụgbọ ahụ.
42Ndị agha zubere igbu ndị mkpọrọ niile, ka onye ọbụla ghara igwuru mmiri site ya gbafuo. 43Ma onye ọchịagha ahụ na-ezube ịzọpụta ndụ Pọl, nʼihi ya, o gbochiri ha nʼizuzu ha. Mgbe ahụ o nyere iwu ka ndị niile maara igwu mmiri buru ụzọ si nʼụgbọ ahụ wụba nʼime mmiri, gwuru mmiri gaa nʼelu ala. 44Ma ndị fọdụrụ ga-eru nʼelu ala site nʼịghọnye aka na obodobo osisi maọbụ nʼihe ndị ọzọ dị iche iche si nʼahụ ụgbọ ahụ dapụta. Nʼụzọ dị otu ka mmadụ niile ji bụrụ ndị rutere nʼelu ala nʼudo.

¿Sabías que…?
Tormenta y naufragio camino a Roma
- Pablo y los demás prisioneros no navegaron directo a Italia. En Cesarea abordaron un barco de Adramitio, ciudad de la costa de Misia, en Asia Menor, con rumbo a puertos a lo largo de la costa de Asia, nombre que el Easton's Bible Dictionary entiende en este versículo probablemente como Asia Menor, y ese barco los llevó solo hasta Mira, en Licia. Allí el centurión los hizo subir a un barco alejandrino que navegaba hacia Italia; el diccionario señala que era raro que un barco zarpara de cualquier puerto de Palestina directo a Italia.Fuentes: Adramyttium · Asia · el propio texto bíblico
- Los prisioneros fueron entregados a Julio, centurión del Regimiento Imperial. El Easton's Bible Dictionary lo identifica como centurión de la cohorte Augusta, o de la guardia personal del emperador, y describe el trato cortés que tuvo con Pablo. En Sidón, a unas veinticinco millas al norte de Tiro, le permitió visitar a sus amigos y recibir atención; más tarde impidió el plan de los soldados de matar a los prisioneros, para que se salvara la vida de Pablo.Fuentes: Julius · Sidon · el propio texto bíblico
- Después de Gnido, el barco avanzó a lo largo de Creta, una de las islas más grandes del Mediterráneo, de unas 140 millas de largo y 35 de ancho, que Pablo visitó en este viaje a Roma. El relato dice que el viaje ya se había vuelto peligroso porque era después del Ayuno, y que Buenos Puertos no era adecuado para invernar. Una cronología fecha el inicio del viaje a Roma en el año 56 d.C. y el naufragio en la tormenta en el 57 d.C.Fuentes: Crete · Journey to Rome begins · Paul is shipwrecked by a storm · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Italy · 41.892, 12.485 · versículos 1, 6
- Adramyttium · Hoy: Oren · 39.501, 26.933 · versículo 2
- Asia · 38.400, 28.300 · versículo 2
- Thessalonica · Hoy: Thessaloniki · 40.638, 22.946 · versículo 2
- Sidon · Hoy: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · versículo 3
- Cyprus · 35.000, 33.000 · versículo 4
- Cilicia · 36.913, 34.892 · versículo 5
- Lycia · 36.733, 29.900 · versículo 5
- Myra · 36.259, 29.985 · versículo 5
- Pamphylia · 37.000, 31.000 · versículo 5
- Alexandria · 31.183, 29.896 · versículo 6
- Cnidus · 36.686, 27.375 · versículo 7
- Crete · 35.310, 24.893 · versículos 7, 8, 12, 13, 14, 21
- Salmone · Hoy: Cape Sideros · 35.316, 26.312 · versículo 7
- Fair Havens · Hoy: Kaloi Limenes · 34.930, 24.800 · versículos 8, 12
- Lasea · Hoy: Lasaea · 34.941, 24.811 · versículo 8
- Cauda · Hoy: Gavdos · 34.833, 24.083 · versículo 16
- Syrtis · Hoy: Sidra · 31.500, 18.000 · versículo 17
- Adriatic Sea · Hoy: Adriatic and Ionian Seas · 38.000, 19.000 · versículo 27
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org