Nations Bible

Hechos 25

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Pọl nʼihu Festọs

1Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site nʼoge Festọs bịara na mpaghara ọchịchị ya, o sitere Sizaria garuo Jerusalem. 2Nʼebe ahụ ka ndịisi nchụaja na ndịisi ndị Juu kọwara ya ihe banyere Pọl. 3Ha rịọkwara ya nʼamara ọ ga-emere ha bụ ime ka Pọl bịa na Jerusalem. Nʼihi na ha agbaala izu igbu ya nʼụzọ. 4Ma Festọs zara, “Pọl nọ dịka onye mkpọrọ na Sizaria. Ebe ahụ ka mụ onwe m ga-alaghachi na mgbe na-adịghị anya. 5Ya mere, ka ndịisi unu ji ikike soro m gaa, boo nwoke ahụ ebubo ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọjọọ o mere.”

6Ọ nọnyeere ha ihe dịka ụbọchị asatọ maọbụ ụbọchị iri, tupu ọ laghachi na Sizaria. Nʼụbọchị so ya, ọ nọdụrụ nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọpụta Pọl. 7Mgbe ọ bịaruru, ndị Juu sitere Jerusalem bịa gbara ya gburugburu na-ekwu ọtụtụ ihe megide ya nke ha na-enweghị ike ịkọwa.

8Ma Pọl gọọrọ onwe ya, na-asị, “Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide iwu ndị Juu maọbụ ụlọnsọ, maọbụ Siza.”

9Ma ebe Festọs na-achọ inwe ihuọma nʼebe ndị Juu nọ, ọ sịrị Pọl, “Ị chọrọ ịga Jerusalem ka m kpee gị ikpe nʼebe ahụ?”

Pọl eburu ikpe gaa nʼihu Siza

10Ma Pọl sịrị, “Eguzo m nʼụlọikpe Siza nʼonwe ya, ebe e kwesiri ka a nọdụ kpee m ikpe. Ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere ndị Juu, dịka ị maara nke ọma. 11Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesiri ọnwụ, anaghị m arịọ ka m gbanarị ọnwụ. Ma ọ bụrụ na ọ dịghị eziokwu dị nʼebubo ndị Juu a na-ebo m, mmadụ ọbụla agaghị e were m nyefee nʼaka ha. Ya mere, ọ bụ Siza ka m na-akpọku.”

12Ya mere, mgbe Festọs na ndị na-adụ ya ọdụ gbara izu, ọ zara, “Ị kpọkuola Siza, ọ bụkwa Siza ka ị ga-agakwuru.”

Festọs na eze Agripa e nwee nzukọ

13Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, eze Agripa na Benaisi bịara Sizaria ịnabata Festọs. 14Mgbe ha nọrọ ọtụtụ ụbọchị nʼebe ahụ, Festọs kọwara eze a ọnọdụ Pọl sị, “Ọ dị nwoke Feliks hapụrụ nʼụlọ mkpọrọ nʼebe a. 15Mgbe m gara Jerusalem, ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu gwara m banyere ya. Ha rịọkwara ka m maa ya ikpe.

16“Ma emere m ka ha ghọta na o megidere iwu ndị Rom ịrara mmadụ ọbụla nye tupu ekpee ya ikpe nyekwa ya ohere ịgọrọ onwe ya nʼihu ndị na-ebo ya ebubo. 17Nʼihi nke a, mgbe ha bịara nʼebe a, atụfughị m oge ọbụla, kama nʼụbọchị nke ọzọ ya, anọdụrụ m nʼoche ikpe, nye ikike ka a kpọbata nwoke ahụ. 18Mgbe ndị na-ebo ya ebubo biliri, ọ dịghị otu nʼime ụrụ ala ndị m chere ha ga-akpọ aha nke ha gụpụtara na o mere. 19Okwu ha niile bụ ịrụ ụka banyere okpukpe ha, na banyere otu onye ọzọ a na-akpọ Jisọs onye nwụrụ, onye Pọl na-ekwusịkwa ike na ọ dị ndụ. 20Ọ rara m ahụ imedo okwu dị otu a. Nʼihi ya, a jụrụ m ya ma ọ ga-amasị ya ị ga nʼụlọikpe dị na Jerusalem ka ọ nọrọ nʼebe ahụ gọrọ onwe ya. 21Ma Pọl rịọrọ ka e debe ya nʼụlọ mkpọrọ ruo mgbe Siza nʼonwe ya ga-ekpebi ikpe ya. Ya mere, ezighachiri m ya nʼụlọ mkpọrọ tutu ruo mgbe m jikeere izigara ya Siza.”

22Agripa gwara Festọs, “Achọrọ m ịnụ okwu site nʼọnụ nwoke a nʼonwe ya.”

Ọ sịrị, “Ị ga-anụ ya echi.”

Pọl nʼihu Agripa

23Ya mere, nʼechi ya, Agripa na Benaisi rutere nʼụlọ ọha na-anọ anụ ikpe nʼoke nganga. Ọtụtụ ndịisi agha na ndị a maara aha ha nʼobodo a sooro ha. Festọs nyere iwu ka a kpọbata Pọl. 24Festọs sịrị, “Eze Agripa na ndị niile soro anyị nọrọ nʼebe a, unu ahụla nwoke a onye ọha ndị Juu niile, ma ndị nọ nʼebe a ma ndị nọ na Jerusalem, wetara ikpe ya nʼaka m na-eti mkpu na o kwesighị ịdị ndụ ọzọ. 25Ma achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke kwesiri ka ọ nwụọ. Ma ebe ọ rịọrọ ka Siza lenye ikpe ya anya, ekpebiri m iziga ya. 26Ma enweghị m ihe ọbụla doro anya m ga-edegara Siza banyere ya. Ya mere m jiri kpọpụta ya nʼihu unu niile, ma karịsịa nʼihu gị onwe gị eze Agripa, ka ọ ga-abụ anyị tulesịa ihe banyere ya, ka m nwee ihe m ga-ede. 27Nʼihi na ọ bụ ihe na-ezighị ezi na m ga-ezipụ onye mkpọrọ na-egosighị nʼebubo e boro ya.”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

La apelación de Pablo al César

  • Cesarea, en el Mediterráneo, a unas setenta millas al noroeste de Jerusalén, era la capital de la provincia romana de Judea y la sede de los procuradores. Herodes el Grande la construyó y la nombró en honor de César Augusto, y allí se sentó Festo en el tribunal; subir a Jerusalén y bajar a Cesarea sigue el camino entre esa capital costera y la ciudad montañosa.Fuentes: Caesarea · Jerusalem · el propio texto bíblico
  • El Easton's Bible Dictionary (1897) identifica a Festo como el procurador de Judea que sucedió a Félix; pocas semanas después de que Festo asumiera el cargo, se le presentó el caso de Pablo, a quien Félix había dejado preso en Cesarea. El mismo diccionario dice que no halló nada digno de muerte o de cadenas y habría puesto en libertad a Pablo si este no hubiera apelado al César; tras la apelación, Festo consultó a su consejo y respondió que Pablo iría ante el César.Fuentes: Portius Festus · Felix · el propio texto bíblico
  • Agripa II, nacido en Roma y hermano de Berenice, fue nombrado por el emperador Claudio superintendente del templo de Jerusalén y, más tarde, rey sobre la tetrarquía de Felipe y Lisanias. Él y Berenice bajaron a Cesarea para presentar sus respetos a Festo, quien, sin saber cómo investigar disputas sobre la propia religión de los judíos y sobre un Jesús que Pablo afirmaba que estaba vivo, hizo comparecer a Pablo ante el rey para tener cargos definidos que escribir al emperador.Fuentes: Agrippa · Bernice · el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Caesarea · Hoy: Caesarea Maritima · 32.500, 34.892 · versículos 1, 4, 6, 13, 24
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 3, 7, 9, 15, 20, 24
  • Rome · 41.892, 12.485 · versículos 25, 27

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.