Hechos 14
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Pọl nʼobodo Aikoniọm
1Nʼobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nʼụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu nʼụzọ pụrụ iche nke mere nʼọtụtụ mmadụ, ndị Juu na ndị mba ọzọ kwenyekwara. 2Ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu ahụ, kpaliri ndị mba ọzọ mee ka mkpụrụobi ha jọọ njọ megide ụmụnna. 3Otu ọ dị, ha nọgidere nʼebe ahụ ogologo oge, na-ekwusakwa okwu nke Onyenwe anyị na-atụghị egwu ọbụla. Onye nke gosikwara na ọ bụ okwu amara ya ka ha na-ekwu site nʼinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. 4Ma ndị obodo ahụ kewara abụọ, ụfọdụ nʼime ha dịnyere ndị Juu. Ụfọdụ dịnyekwara ndị ozi. 5Mgbe ndị mba ọzọ, na ndị Juu, ha na ndị ndu ha, gbara izu ime ha ihe ihere, tụọkwa ha nkume. 6Ndị ozi ahụ matara nzube ha site nʼebe ahụ gbapụ ọsọ gbaruo nʼakụkụ Laikonia, gbaba nʼime obodo Listra na Debi na obodo nta ndị ọzọ ndị dị nʼakụkụ ebe ahụ. 7Nʼebe ahụ, ha gara nʼihu na-ekwusakwa oziọma ahụ.
Nʼime obodo Listra na Debi
8Nʼobodo Listra, o nwere otu nwoke dara ngwụrọ site nʼoge a mụrụ ya. Nwoke a ejibeghị ụkwụ ya abụọ gaa ije mgbe ọbụla. 9O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu. Onye legidere ya anya hụ na ọ nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka a gwọọ ya, 10were oke olu sị, “Guzoro nʼụkwụ gị abụọ.” Nwoke ahụ wuliri elu malite ịga ije.
11Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ ihe Pọl mere, ha tiri mkpu nʼasụsụ Laikonia sị, “Ndị a bụ chi bịakwutere anyị nʼụdịdị mmadụ.” 12Banabas ka ha kpọrọ Zeus ma kpọkwa Pọl Hamis nʼihi na ọ bụ ya bụ onye ọka okwu. 13Onye nchụaja Zeus, nke ụlọ arụsị ya dị nso nʼihu obodo, kpụtara oke ehi wetakwa okoko osisi dị iche iche. Ya na igwe mmadụ ahụ chọrọ ịchụ aja nye ha nʼọnụ ụzọ ama ha.
14Mgbe ndị ozi ahụ, Banabas na Pọl nụrụ ihe ndị a, ha dọwara uwe ha, gbara ọsọ jekwuru igwe mmadụ ahụ na-eti mkpu, 15na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha. 16Nʼoge gara aga, ọ hapụrụ mba niile ka ha na-eme ihe masịrị ha. 17Nʼagbanyeghị nke a ọ hapụghị ị debere onwe ya ihe ndị ga-agbara ya akaebe, site nʼọrụ ọma ya niile. Dị ka inye unu mmiri ozuzo site nʼeluigwe, na mkpụrụ nke ala nʼoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri na-emekwa ka obi na-atọ unu ụtọ.” 18Nʼagbanyeghị okwu ndị a, ọ rara ha ahụ igbochi igwe mmadụ ahụ ịchụrụ ha aja.
19Ma ndị Juu sitere nʼAntiọk na Aikoniọm bịara kpalie obi igwe mmadụ ahụ. Nʼihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya pụọ nʼobodo, chee na ọ nwụọla. 20Ma mgbe ndị na-eso ụzọ bịara gbaa ya gburugburu, o bilitere, laghachikwa nʼime obodo ahụ. Ma nʼechi ya, ya na Banabas sooro gaa Debi.
Pọl na Banabas alaghachi Antiọk nke Siria
21Ha zisasịrị oziọma nʼime obodo ahụ, nke mere ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ha lọghachiri nʼobodo Listra site ya gaa Aikoniọm na Antiọk. 22Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.” 23Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya. 24Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia. 25Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia.
26Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru. 27Mgbe ha bịaruru, ha kpọkọtara nzukọ kọwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee, na otu o siri meghe ọnụ ụzọ nke okwukwe nye ndị mba ọzọ. 28Ha na ndị na-eso ụzọ nọgidere nʼebe ahụ ruo oge dị anya.

¿Sabías que…?
Pablo y Bernabé en Licaonia
- Iconio era la capital de Licaonia, una provincia romana del interior de Asia Menor cuyas ciudades principales eran Iconio, Listra y Derbe. El Diccionario Bíblico de Easton (1897) sitúa Iconio, la actual Konieh, al pie del monte Tauro, a unas 120 millas tierra adentro; Listra estaba en una región agreste, y Derbe era un pueblo pequeño a unas veinte millas de Listra, en la parte oriental de la llanura alta.Fuentes: Iconium · Lycaonia · Lystra · Derbe
- Cuando un hombre cojo de nacimiento comenzó a caminar, la multitud en Listra gritó en lengua licaonia que los dioses habían bajado en forma humana, llamando Zeus a Bernabé y Hermes a Pablo, porque Pablo era el principal orador. El Diccionario Bíblico de Easton (1897) usa los nombres romanos Júpiter y Mercurio, y dice que probablemente tomaron a Bernabé por Júpiter por su aspecto majestuoso y venerable; sobre el habla local, afirma que la lengua era probablemente el antiguo asirio, aunque otros han pensado que era un griego corrupto mezclado con palabras siríacas.Fuentes: el propio texto bíblico · Lystra · Lycaonia
- Este recorrido por Licaonia pertenece al primer viaje misionero de Pablo, que una cronología fecha en el año 45 d. C. y en cerca de un año. El Diccionario Bíblico de Easton (1897) señala que Pablo no sufrió persecución en Derbe; desde allí, él y Bernabé regresaron a Listra, Iconio y Antioquía de Pisidia para fortalecer a los discípulos y designar ancianos, y luego siguieron por Pisidia.Fuentes: First Missionary Journey · Derbe · Antioch (Pisidia) · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Iconium · Hoy: Konya · 37.872, 32.492 · versículos 1, 19, 21
- Lycaonia · 38.000, 33.000 · versículos 6, 11
- Lystra · Hoy: Tel Lystra · 37.602, 32.338 · versículos 6, 8, 21
- Antioch · Hoy: Antioch in Pisidia · 38.306, 31.189 · versículos 19, 21
- Pamphylia · 37.000, 31.000 · versículo 24
- Pisidia · 38.306, 31.189 · versículo 24
- Attalia · Hoy: Antalya · 36.881, 30.704 · versículos 25, 26
- Perga · 36.960, 30.854 · versículo 25
- Antioch · Hoy: Antioch on the Orontes · 36.227, 36.172 · versículos 26, 27
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org