Nations Bible

2 Samuel 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Mbubata igbe ọgbụgba ndụ na Jerusalem

1Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi, 2Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim. 3Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ, 4nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ. 5Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu.

6Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ. 7Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke.

8Mgbe ahụ, iwe were Devid, nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza. Ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.

9Devid tụrụ egwu Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?” 10O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git. 11Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile.

12Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “ Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid. 13Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja. 14Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ, 15mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

16Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu Onyenwe anyị, o ledara ya anya nʼime obi ya.

17Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, guzobe ya nʼọnọdụ ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Devid chụrụ aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Onyenwe anyị. 18Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 19O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya.

20Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.”

21Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu Onyenwe anyị onye họpụtara m karịa nna gị maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, Onyenwe anyị ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ Onyenwe anyị. 22E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!”

23Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

El traslado del arca a Jerusalén

  • Baala de Judá es otro nombre para Quiriat-jearim, la ciudad donde el arca del pacto había permanecido en la casa de Abinadab desde su regreso del territorio filisteo. El rey David reunió a treinta mil hombres escogidos de Israel para trasladarla desde allí hacia Jerusalén sobre una carreta nueva guiada por los hijos de Abinadab, Uza y Ahío.Fuentes: Baale-judah · Abinadab · Ahio · el propio texto bíblico
  • Cuando los bueyes tropezaron en la era de Nacón, Uza extendió la mano para sostener el arca y murió en el lugar. David llamó a ese sitio Pérez-uza, que significa brecha de Uza, y desvió temporalmente el arca a la casa de Obed-edom geteo durante tres meses antes de completar su traslado a Jerusalén.Fuentes: Perez-uzzah · Uzzah · el propio texto bíblico
  • Mical, hija de Saúl y esposa de David, miró desde una ventana y despreció en su corazón al rey al verlo saltar y danzar con un efod de lino ante el arca. Cuando ella le reprochó lo que consideraba una conducta indigna ante el pueblo, David defendió su regocijo ante Dios, y Mical no tuvo hijos hasta el día de su muerte.Fuentes: Michal · Saul · el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Baale-judah · Hoy: Deir el Azar · 31.809, 35.104 · versículo 2
  • Perez-uzzah · Hoy: within 1 km of Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 8
  • City of David · 31.774, 35.236 · versículos 10, 12, 16

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.