2 Samuel 23
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Okwu ikpeazụ Devid
1Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru:
“Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi,
ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu.
Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ,
onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel.
2“Mmụọ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ m,
okwu ya dịkwa m nʼire.
3Chineke Izrel kwuru okwu,
Oke nkume Izrel sịrị m,
‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume,
mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke.
4Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta
nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị.
Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara
nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’
5“Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ.
Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya,
Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile.
Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke.
Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile.
6Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu,
nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta.
7Onye ọbụla metụrụ ogwu aka,
bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe.
A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.”
Ndị ọka agha Devid
8Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere:
Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
9Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha. Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ, 10ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. Onyenwe anyị nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ.
11Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ. 12Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
13Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim. 14Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem. 15Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!” 16Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị. 17Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, Onyenwe anyị, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya.
Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
18Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. 19Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
20Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya. 21O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya 22Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ. 23A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
24Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ:
Asahel, nwanne Joab,
Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem
25Shama, onye Harod,
Elika, onye Harod,
26Helez onye Palti,
Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa,
27Abieza, onye Anatot,
Mebunai, onye Husha,
28Zalmon, onye Ahohi,
Maharai, onye Netofa,
29Heled, nwa Baana, onye Netofa,
Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin,
30Benaya, onye Piraton,
Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash,
31Abi-Albon, onye Arba,
Azmavet, onye Bahurim
32Eliaba, onye Shaalbon,
Ụmụ Jashen,
Jonatan 33nwa Shama, onye Hara
Ahiam, nwa Shara nke Hara,
34Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka,
Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo,
35Hezro, onye Kamel,
Paraị, onye Aaba,
36Igal nwa Netan, onye Zoba,
nwa Hagri,
37Zelek, onye Amọn,
Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya,
38Ira, onye Itra,
Gareb, onye Itra
39na Ụraya, onye Het.
¿Sabías que…?
Las últimas palabras y los valientes de David
- El oráculo poético de David describe al gobernante ideal como alguien que ejerce el poder con justicia y temor de Dios, comparando ese liderazgo con la luz clara de un amanecer sin nubes y la frescura de la lluvia sobre la hierba.Fuentes: el propio texto bíblico
- Mientras David se refugiaba en la cueva de Adulam y los filisteos acampaban en el valle de Refaim y Belén, tres guerreros rompieron el cerco enemigo para sacar agua del pozo junto a la puerta de Belén. Conmovido por su lealtad, David no quiso beberla y la derramó como libación ante el Señor, considerándola la sangre de hombres que habían arriesgado sus vidas.Fuentes: el propio texto bíblico · Adullam · Bethlehem · Valley of Rephaim
- Entre los guerreros de élite mencionados figuraba Benaía hijo de Joiada, oriundo de Cabseel, recordado por abatir a dos héroes de Moab, matar a un león en un foso en un día de nieve y desarmar a un gigante egipcio para matarlo con su propia lanza.Fuentes: el propio texto bíblico · Benaiah · Kabzeel
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Valley of Rephaim · 31.763, 35.219 · versículo 13
- Bethlehem · 31.704, 35.208 · versículos 14, 15, 16, 24
- Moab · Hoy: Moab 1 · 31.181, 35.701 · versículo 20
- Tekoa · Hoy: Khirbet Teku’a · 31.632, 35.210 · versículo 26
- Arabah · 30.417, 35.151 · versículo 31
- Maacah · 33.258, 35.581 · versículo 34
- Zobah · 33.935, 36.151 · versículo 36
- Ammon · 31.955, 35.934 · versículo 37
- Jattir · Hoy: Khirbet Attir · 31.352, 35.016 · versículo 38
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org