Nations Bible

2 Samuel 20

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Nnupu isi Sheba megide Devid

1Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị,

“Anyị enweghị oke nʼime Devid,

anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi.

Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!”

2Ya mere, ndị ikom Izrel niile tụgharịrị hapụ Devid, soro Sheba nwa Bikri. Ma ndị ikom Juda nọgidere soro eze ha site na Jọdan ruo Jerusalem.

3Mgbe Devid lọghachitere nʼụlọ ya na Jerusalem. O nyere iwu ka ndị iko ya nwanyị iri ndị ahụ ọ hapụrụ ilekọta ụlọ, ndị ahụ ha na Absalọm dinara, nọrọ nʼụlọ dị iche, ebe a nọ na-eche ha nche. Eze abakwurughị ha ọzọ. Ha bụ ndị emechibidoro ụzọ, ha na-ebi ndụ dịka ndị di ha nwụrụ anwụ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ha.

4Mgbe ahụ, eze gwara Amasa okwu sị, “Kpokọta ndị agha Juda ka ha bịakwute m nʼime abalị atọ. Gị onwe gị kwa ga-eso ha bịa nʼoge ahụ.” 5Amasa pụrụ jee ịkpọkọta ndị Juda; ma o were ya ọtụtụ oge karịa abalị atọ.

6Devid sịrị Abishai, “Lee nwoke a bụ Sheba nwa Bikri na-aga ime ihe ọjọọ ga-adị njọ karịa nke Absalọm mere. Chịrị ndị agha nna gị ukwu chụso ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-achọta obodo e wusiri ike gbaba, ebe anyị na-apụghị inweta ya.” 7Ya mere ndị agha Joab, na ndị Keret na Pelet, na ndị niile bụ dike na dimkpa nʼagha pụrụ nʼikike ọchịchị Abishai. Ha si Jerusalem pụọ ịchụso Sheba nwa Bikri.

8Mgbe ha rutere nʼoke nkume ahụ dị na Gibiọn, Amasa pụtara izute ha. Joab yi uwe agha ya nʼoge a; ọ fanyekwara mma agha ya nʼọbọ nʼukwu ya. Mgbe ọ gara nʼihu, mma ahụ si nʼọbọ ya dapụta.

9Joab kelere Amasa sị ya, “Kedụ ka ị dị nwanna m.” Mgbe ahụ, Joab ji aka nri ya jide Amasa nʼahụọnụ isutu ya ọnụ, 10Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ.

11Mgbe ahụ, otu nʼime ndị agha Joab guzo nʼakụkụ Amasa sị, “Onye ọbụla dịnyeere Joab na Devid ya bịa soro Joab nʼazụ.” 12Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa. 13Mgbe e bupụsịrị ozu Amasa nʼụzọ, ndị agha niile sooro Joab gaa ijide Sheba, nwa Bikri.

14Sheba gabigara ebo niile nke Izrel ruo Ebel-Bet-Maaka, gabigakwa oke ala ndị Bikri, bụ ndị zukọtara soro ya. 15Ndị agha Joab bịara gbochie ya na Ebel-Bet-Maaka. Ha wuru ihe mgbochi ruo obodo ahụ, nọbichie mgbidi dị ya gburugburu. Ebe ha nọ na-akụ mgbidi ahụ ihe, ka ha kwatuo ya. 16Otu nwanyị maara ihe si nʼobodo ahụ kpọọ oku sị, “Geenụ m ntị, geenụ m ntị, gwanụ Joab ka ọ bịa nʼebe a. Achọrọ m ịgwa ya okwu.” 17Joab pụtara gaa ya nso. Nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ọ bụ gị bụ Joab?”

Ọ zara sị, “E, ọ bụ m.”

Mgbe ahụ, ọ gwara ya, “Gee ntị, ka i nụ ihe ohu gị nwere ikwu.”

Joab sịrị ya, “Ana m ege ntị.”

18Ọ gara nʼihu sị, “Nʼoge ochie a na-ekwu sị, ‘Gaa jụta ase nʼEbel,’ nʼụzọ dị otu a ka ha si ekwubi okwu. 19Anyị bụ ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. I na-achọ ibibi obodo bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji chọọ iloda ihe nketa nke Onyenwe anyị?”

20Joab zara sị, “Mba! Ọ bụghị uche m ịla obodo a nʼiyi. 21Ọ bụghị otu a ka okwu ahụ dị. Otu nwoke a na-akpọ Sheba nwa Bikri, nke si nʼobodo ugwu Ifrem e weliela aka ya imegide eze, bụ Devid. Nyefee nwoke a ọsịịsọ nʼaka m, aga m esi nʼobodo a pụọ.”

Nwanyị ahụ sịrị Joab, “A ga-atụpụtara gị isi ya site na mgbidi.”

22Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem.

Ndịisi na-ejere Devid ozi

23Ọ bụ Joab ka e mere onyeisi agha na-achị ndị agha niile nke Izrel.

Benaya nwa Jehoiada bụ onye na-achịkọta ndị Keret na ndị Pelet na-eche eze nche.

24Adoniram na-ahụ maka ihe banyere ndị ọrụ mmanye.

Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta ihe niile na-eme nʼobodo.

25Sheva bụ ode akwụkwọ eze,

Zadọk na Abịata bụ ndị nchụaja.

26Ira, onye si nʼobodo Jaịa, bụ onye nchụaja eze Devid.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

La revuelta de Seba y el asedio de Abel

  • Seba, un hombre de la tribu de Benjamín (el mismo linaje del antiguo rey Saúl), aprovechó las tensiones entre las tribus del norte de Israel y Judá tras la derrota de Absalón para iniciar una nueva revuelta contra David.Fuentes: Sheba · el propio texto bíblico
  • David había nombrado a Amasa para dirigir el ejército en lugar de Joab. Durante la persecución de Seba, Joab eliminó a su rival junto a la gran piedra de Gabaón, saludando a Amasa con un beso mientras lo hería con una daga oculta.Fuentes: Amasa · Joab · el propio texto bíblico
  • Abel-bet-maaca era una ciudad fortificada en el norte, en el territorio de Neftalí, descrita como 'madre en Israel' y conocida como un lugar para resolver disputas. Una mujer sabia de la ciudad negoció con Joab para levantar el asedio a cambio de la vida de Seba.Fuentes: Beth-maacah · el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 3, 7, 22
  • Jordan · Hoy: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículo 2
  • Gibeon · Hoy: El Jib · 31.847, 35.183 · versículo 8

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.