Nations Bible

2 Reyes 8

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Nlọghachi nwanyị Shunem

1Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.” 2Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia afọ asaa.

3Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya. 4Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.” 5Mgbe Gehazi na-akọrọ eze otu Ịlaisha si mee ka nwantakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, nwanyị ahụ, onye bụ nne nwantakịrị ahụ, batara nʼime ụlọeze.

Mgbe ahụ, Gehazi kwuru sị, “Onyenwe m eze, onye a bụ nwanyị ahụ, leekwa nwa ya nwoke, onye Ịlaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.” 6Eze jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị ya, “Ọ bụ eziokwu?” Nwanyị ahụ kọọrọ eze akụkọ ihe niile mere.

Mgbe ahụ, eze dunyere ya otu onyeisi nʼime ndị ozi ya ka o nyere ya aka inwetaghachi ihe ya niile, ya na ụgwọ ruru ya nʼihi mkpụrụ ubi ya niile ha ghọrọ mgbe ahụ o bi nʼala ndị Filistia.

Hazael egbuo Ben-Hadad

7Mgbe ihe ndị a gasịrị Ịlaisha gara Damaskọs, isi obodo ndị Siria. Nʼoge a, Ben-Hadad eze Aram, na-arịa ọrịa. “A gara gwa eze na onye nke Chineke abịala nʼebe ahụ.” 8Mgbe eze nụrụ ya, ọ kpọrọ Hazael sị ya, “Were onyinye ịnata ihuọma nʼaka gị wegara onye nke Chineke, site nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase. Jụọ ya, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ”

9Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs, wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’ ”

10Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma Onyenwe anyị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.” 11Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa.

12Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?”

Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.”

13Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?”

Ịlaisha zara, “ Onyenwe anyị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.”

14Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.” 15Ma nʼechi ya, Hazael chịịrị akwa na-egbo oyi, banye ya na mmiri jiri ya baa nʼebe eze dina, gbasaa ya nʼihu eze, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. Emesịa, Hazael ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Jehoram eze Juda

16Nʼafọ nke ise nke ọchịchị Joram nwa Ehab eze Izrel, mgbe Jehoshafat bụ eze Juda, ka Jehoram nwa Jehoshafat malitere ọchịchị ya dịka eze Juda. 17Ọ dị iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem. 18O soro ụzọ ndị eze Izrel dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. 19Ma nʼagbanyeghị nke a, nʼihi ohu ya bụ Devid Onyenwe anyị achọghị ibibi Juda. Nʼihi na o kwere nkwa ime ka oriọna dịịrị Devid na ụmụ ụmụ ruo mgbe ebighị ebi.

20Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze. 21Ya mere, Jehoram duuru ụgbọ agha ya niile gaa nʼobodo Zaịa. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu; ma ndị agha ya gbaghachiri azụ, laa nʼụlọ ha. 22Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa.

Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ.

23Akụkọ ihe niile Jehoram mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Juda mere nʼụbọchị ndụ ha? 24Joram sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri nna ya ha nʼobodo Devid. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Ahazaya eze Juda

25Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ka Ahazaya nwa Jehoram, bụ eze Juda malitere ịchị. 26Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya, nwa nwa Omri, eze Izrel 27O soro ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ nwanyị si nʼezinaụlọ Ehab.

28Ahazaya sooro Joram nwa Ehab, gaa ibuso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ. 29Ya mere, eze Joram lọghachitere na Jezril, ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ndị Aram merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ.

Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram eze Juda, gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.

¿Sabías que…?

Sucesión Profética y Alianzas Reales

  • Cuando el rey Ben-hadad de Damasco enfermó, envió a su oficial Hazael con presentes en cuarenta camellos para consultar a Eliseo. Eliseo lloró al prever la inmensa crueldad que Hazael causaría a Israel, y al día siguiente Hazael asfixió al rey con un paño mojado para usurpar el trono de Siria.Fuentes: el propio texto bíblico · Hazael · Ben-hadad · Damascus
  • Joram de Judá se casó con Atalía, hija de Acab y Jezabel, alineando el reino del sur con las prácticas y políticas de la monarquía del norte. Esta alianza continuó con su hijo Ocozías, quien se unió al rey de Israel en el conflicto militar contra Hazael en Ramot de Galaad.Fuentes: el propio texto bíblico · Jehoram · Ahaziah · Ahab
  • Tras sobrevivir a siete años de hambre entre los filisteos, la mujer sunamita acudió al rey para reclamar sus propiedades abandonadas. El testimonio directo de Giezi sobre la resurrección de su hijo motivó al rey a devolverle no solo sus tierras, sino también todos los frutos de las cosechas pasadas.Fuentes: el propio texto bíblico · Gehazi

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Damascus · 33.511, 36.306 · versículos 7, 9
  • Syria · Hoy: Aram · 33.511, 36.306 · versículos 7, 9, 13, 28, 29
  • Aram · 33.511, 36.306 · versículo 15
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 17, 26
  • Edom · 30.746, 35.604 · versículos 20, 21, 22
  • City of David · 31.774, 35.236 · versículo 24
  • Ramah · Hoy: Tall er Rumeith · 32.500, 36.015 · versículo 29

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.