Nations Bible

2 Reyes 22

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Akwụkwọ iwu a chọtara

1Afọ asatọ ka Josaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze Juda. Iri afọ atọ na otu ka ọ chịrị na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jedida, nwa Adaya onye Bozkat. 2O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid kpamkpam, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.

3Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị ya, eze Josaya, zigara ode akwụkwọ bụ Shefan nwa Azalaya, onye bụkwa nwa nwa Meshulam, ka ọ gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ọ sịrị ya, 4“Gakwuru Hilkaya onyeisi nchụaja, sị ya, gụkọta ego nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bụ nke ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị mmadụ. 5Gwa ha ka ha nyefee ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ ahụ. Ka ndị ikom a kwụọ ndị ọrụ na-arụzi ụlọnsọ Onyenwe anyị ụgwọ ọrụ, 6ya bụ, inye ya ndị ọkpọ ǹtu, ndị na-ewu ụlọ, na ndị na-edo nkume ụlọ. Ha jirikwa ego ahụ zụta osisi na nkume a wara awa, maka i ji dozie ụlọnsọ ahụ. 7Ọ dịghị mkpa ka ha gụzie otu ha si mefuo ego nke e nyefere ha nʼaka, nʼihi na ọrụ ha egosila na ha kwesiri ntụkwasị obi.”

8Hilkaya onyeisi nchụaja, sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.” O nyere ya Shefan, onye nke gụkwara ya. 9Mgbe ahụ, Shefan, bụ ode akwụkwọ, bịakwutere eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼaka ndị ọrụ na nʼaka ndị nlekọta nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.” 10Mgbe ahụ, Shefan bụ ode akwụkwọ, gwara eze sị, “O nwere akwụkwọ Hilkaya, onye nchụaja nyere m.” Shefan gụpụtara ihe dị nʼakwụkwọ a nʼihu eze.

11Mgbe eze nụrụ okwu niile dị nʼime Akwụkwọ Iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya. 12O nyere Hilkaya bụ onyeisi nchụaja, Ahikam nwa Shefan, Akboa nwa Mikaya, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha, 13“Gaanụ jụta Onyenwe anyị ase, nʼisi m na nʼisi ndị m, na Juda niile, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a nke a chọtara. Nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị dị ukwuu bụ nke na-ere ọkụ megide anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ erubeghị isi nʼokwu nke akwụkwọ iwu a, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime ya banyere anyị.”

14Hilkaya onye nchụaja, Ahikam, Akboa, Shefan na Asaya, jekwuuru Hulda, bụ onye amụma nwanyị. Onye bụ nwunye Shalum, nwa Tikva, nwa Hahas, ọ bụ onye na-elekọta uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.

15Ọ sịrị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị, 16‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, dịka ihe niile e dere nʼime akwụkwọ nke eze Juda gụrụ, si dị. 17Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na arụsị niile nke aka ha mepụtara. Iwe m ga-adị ọkụ megide ebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’ 18Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ Onyenwe anyị sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ. 19Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe m kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, na ha ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ, na ihe tọgbọrọ nʼefu, nʼihi na i dọwara uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m, mụ onwe m anụkwala, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 20Ya mere, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a.’ ”

Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

El Libro de la Ley Redescubierto

  • Durante las reparaciones del templo en el decimoctavo año del reinado de Josías, el sumo sacerdote Hilcías halló el Libro de la Ley en la casa del SEÑOR. Cuando el escriba real Safán leyó el contenido del rollo ante el rey, Josías rasgó sus vestiduras en señal de aflicción por la desobediencia histórica de Judá a sus mandamientos.Fuentes: el propio texto bíblico · Hilkiah · Shaphan · Josiah
  • Para consultar al SEÑOR acerca del rollo recién encontrado, Josías envió una delegación real a la profetisa Hulda, quien residía en el Segundo Barrio de Jerusalén. Hulda transmitió una profecía anunciando calamidad sobre Judá a causa de la idolatría, pero aseguró a Josías que moriría en paz gracias a su humilde arrepentimiento.Fuentes: el propio texto bíblico · Second Quarter · Ahikam

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 14
  • Second Quarter · Hoy: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 14

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.