2 Crónicas 2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Nkwado maka iwu ụlọnsọ ukwu
1Solomọn nyere iwu ka e wuo ụlọ nso ukwu nye Aha Onyenwe anyị, ka e wuokwara ya bụ Solomọn ụlọeze. 2O manyere ndị ọrụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa (70,000) na-ebu ibu, na ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ (80,000), na ndị o doro dịka ndịisi ha, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị isii (3,600).
3Solomọn zigara Hiram eze Taịa ozi sị ya,
“Zidatara m osisi sida dịka i mere nʼoge nna m Devid wuru ụlọeze nke ya. 4Ugbu a, ana m akwado iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, na ido ya nsọ nye ya maka ịchụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼihu ya, na idebe nʼebe ahụ achịcha nsọ a na-edo nʼusoro mgbe niile. Na isure aja nsure ọkụ ụtụtụ na anyasị, na nʼụbọchị izuike niile, na nʼọnwa ọhụrụ na nʼoge mmemme ndị ọzọ niile a kara aka nke Onyenwe anyị Chineke anyị. Nke a bụ ụkpụrụ na-adịgide nye ụmụ Izrel ruo ebighị ebi.
5“Ụlọnsọ m ga-ewu ga-adị ukwuu nʼihi na Chineke anyị dị ukwuu karịa chi ndị ọzọ niile. 6Ma onye pụrụ iwu ụlọnsọ nye ya, ebe ọ bụ na eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe, ezughị ịba gị? Onye ka mụ onwe m bụ, na m ga-ewu ụlọnsọ nye ya, ma ọ bụghị naanị ebe a ga-anọ chụọ aja dị iche iche nʼihu ya?
7“Zitere m, onye ǹka, onye maara otu e si eji ọlaedo na ọlaọcha, na bronz, na igwe arụ ọrụ. Onye bụkwa onye maara ọrụ ǹka metụtara akwa dị iche iche, akwa ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie, na nke anụnụ anụnụ. Ọ ga-abụkwa onye igbunye akara nʼihe doro anya, onye ga-arụ ọrụ na Juda na nʼime Jerusalem, ebe ọ ga-eso ndị ǹka m, bụ ndị nna m Devid họpụtara rụọ ọrụ.
8“Zitekwara m osisi sida, na osisi junipa, na osisi algụm, ndị sitere nʼọhịa Lebanọn, nʼihi na ndị gị bụ ọkachamara nʼọrụ ịwa osisi. Aga m ezitekwa ndị m ga-abịa soro ha rụọ ọrụ, 9ime ka osisi ha ga-egbutere m dị ukwuu, nʼihi na ya bụ ụlọnsọ ga-ebu ibu, maakwa mma. 10Aga m enye ndị ọrụ gị, bụ ndị na-awa osisi, narị puku bushel na iri puku bushel ọka wiiti abụọ a kwọrọ akwọ, na narị puku bushel na iri puku bushel ọka balị abụọ, na narị puku galọọnụ ite mmanya vaịnị na iri galọọnụ abụọ, nakwa narị puku galọọnụ mmanụ na iri galọọnụ mmanụ oliv abụọ.”
11Hiram, eze Taịa zighachiiri Solomọn akwụkwọ ozi sị ya.
“Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị hụrụ ndị ya nʼanya ka o ji mee gị eze ha.”
12Hiram kwukwara sị,
“Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel. Onye kere eluigwe na ụwa. Onye nyere Devid, bụ eze, nwa nwere nghọta na akọnuche dị otu a, iwuru Onyenwe anyị ebe obibi, na iwukwa ụlọeze nke aka ya.
13“Ana m ezitere gị Huram-Abi, onye ọka maara ọrụ ya nke ọma. 14Onye nne ya si nʼebo Dan nke dị nʼIzrel, ma nna ya bụ onye Taịa. Ọ bụ onye a zụrụ nʼọrụ ịkpụ ụzụ nke ọma, nʼihe gbasara ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, na nkume, na osisi. Ọ makwa otu e si eji akwa odo odo, na akwa anụnụ anụnụ, na akwa uhie uhie na ezi akwa ọcha arụ ọrụ. Igbunye ụdị akara ọbụla nʼihe nakwa ichepụta ihe ọ ga-eji ihe ọbụla enyere ya mee doro ya anya nke ọma. Ọ ga-esonye ndị ǹka gị, na ndị nke onyenwe m Devid, bụ nna gị.
15“Ugbu a, ka onyenwe m zitere ndị ohu ya ọka wiiti ahụ, na ọka balị, na mmanya vaịnị, na mmanụ oliv, dịka ọ kwere na nkwa. 16Anyị ga-egbutu osisi niile ị chọrọ site nʼugwu Lebanọn, sitekwa nʼosimiri budata ha obodo Jopa, ebe i nwere ike isite buruo ha Jerusalem.”
17Emesịa, Solomọn gụrụ ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel ọnụ, dịka Devid mere, achọpụtara na ha dị narị puku iri ise na atọ, na narị isii (153,600). 18O mere iri puku ndị ọrụ asaa (70,000) nʼime ha ka ha bụrụ ndị na-ebu ibu, na ọnụọgụgụ dị iri puku asatọ (80,000) ka ha bụrụ ndị ga-awa nkume, meekwa puku ndị ikom atọ na narị isii (3,600), ndị ga-abụ ndịisi ọrụ ime ka ọrụ na-aga nke ọma.
¿Sabías que…?
Preparativos para la Construcción del Templo
- Para conseguir madera para el templo, Salomón renovó la alianza de David con Hiram, rey de la ciudad fenicia de Tiro. Hiram dispuso que maderas de cedro, ciprés y sándalo del monte Líbano bajaran en forma de balsas por el mar Mediterráneo hasta el puerto de Jope, desde donde los obreros de Salomón las transportarían a Jerusalén.Fuentes: el propio texto bíblico · Hiram · Joppa · Lebanon
- El maestro artesano enviado por Hiram para dirigir la obra artística fue Huram-abí, cuya madre pertenecía a la tribu israelita de Dan y cuyo padre era de Tiro. Su destreza abarcaba la metalurgia, la cantería, la carpintería, el grabado y el tejido y teñido de telas finas en púrpura, carmesí y azul.Fuentes: el propio texto bíblico · Dan · Hiram
- Salomón organizó una vasta fuerza laboral con los extranjeros residentes en la tierra de Israel, que sumaban 153.600 hombres según un censo previo realizado por David. Fueron designados como cargadores, canteros en las montañas y supervisores de los proyectos de construcción.Fuentes: el propio texto bíblico · David
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Tyre · 33.271, 35.196 · versículos 3, 11, 14
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 7, 16
- Lebanon · 33.540, 35.584 · versículos 8, 16
- Great Sea · Hoy: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · versículo 16
- Joppa · Hoy: Jaffa · 32.054, 34.753 · versículo 16
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org