Nations Bible

1 Timoteo 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

1Ndị niile bụ ohu ga-ahụ ndị nwe ha dị ka ndị ekwesiri inye ugwu na nsọpụrụ, ka a ghara ikwujọ aha Chineke na ozizi anyị. 2Ndị nke nwere ndị kwere ekwe dịka ndị nwe ha ekwesighị ilelị ha anya nʼihi na ha bụ ụmụnna ha. Kama, ha kwesiri ijere ndị nwe ha ozi nke ọma karịa, nʼihi na ndị na-erite uru nʼọrụ ha bụ ndị kwere ekwe bụrụkwa ndị anyị hụrụ nʼanya.

Ndị ozizi ụgha na ịhụ ego nʼanya

Ihe ndị a ka ị ga-akụziri ha, dụkwaa ha ọdụ banyere ime nke a. 3Onye ọbụla na-ezi ihe ọzọ nke na-adabaghị nʼokwu ezi ntọala na-enye ndụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na ozizi nke ibi ndụ kwesiri onye nke Chineke, 4bụ onye nganga na-afụli elu, ma bụrụkwa onye na-amaghị ihe. Ọchịchọ obi ya bụ nke na-ezighị ezi ma jupụtakwa nʼịrụ ụka na ekworo nke na-eweta ịkpọ asị na esemokwu, na nkwulu nakwa ajọ echiche, 5na isi ịrụ ụka niile nke na-esite nʼaka ụmụ mmadụ ndị echiche ha na-enweghịkwa eziokwu. Ha na-eche na ife Chineke bụ ụzọ e si aba ọgaranya.

6Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere. 7Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ. 8Ya mere, ọ bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere. 9Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi. 10Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ.

Ndụmọdụ mmechi Pọl dụrụ Timoti

11Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ. 12Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe. 13Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu 14ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe. 15Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. 16Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen.

Ndị ọgaranya

17Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ. 18Gwa ha ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya nʼọrụ ọma niile, ka ha nwee obiọma na inyere ndị ọzọ aka, dịkwa njikere ikenye ndị ọzọ ihe site nʼihe ha nwere. 19Nʼụzọ dị otu a, ha na-akpadoro onwe ha akụ nke ga-abụrụ ha ntọala siri ike nʼọgbọ dị nʼihu, nke a ga-eme ka ha rite ndụ ahụ nke bụ ezigbo ndụ nʼuru.

20Timoti chebekwa ihe ndị ahụ e nyefere gị nʼaka, wezuga onwe gị site nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, na ịrụ ụka nzuzu nke ha na-akpọ ihe ọmụma, 21bụ nke ụfọdụ kwupụtara, ma na ime nke a, ha esitela nʼụzọ okwukwe kpafuo.

Ka amara dịnyere gị. Amen.

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

Piedad, contentamiento y el encargo a Timoteo

  • La solemne exhortación de este capítulo recuerda que Cristo Jesús hizo la buena confesión en su testimonio ante Poncio Pilato. Pilato fue el sexto procurador romano de Judea, del 26 al 36 d.C., con sede en Cesarea, aunque subía con frecuencia a Jerusalén; su tiempo en el cargo abarcó los ministerios de Juan el Bautista y de Jesús, y su nombre se recuerda sobre todo en relación con el juicio de Jesús.Fuentes: el propio texto bíblico · Pontius Pilate
  • El capítulo se dirige a Timoteo como hombre de Dios y le dice que guarde lo que le ha sido confiado. El nombre Timotheus significa honrar a Dios. Era un joven discípulo y compañero de Pablo en muchos viajes; su madre, Eunice, y su abuela, Loida, se mencionan como eminentes en piedad, y su padre era griego.Fuentes: el propio texto bíblico · Timotheus

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.