Nations Bible

1 Samuel 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Mbughachi igbe ọgbụgba ndụ

1Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nọrọ nʼobodo ndị Filistia ọnwa asaa. 2Emesịa, ndị Filistia kpọrọ ndị nchụaja ha na ndị na-ajụ mmụọ ase jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme banyere igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị? Gwa anyị otu anyị ga-esi zilaga ya nʼala ya.”

3Ndị ahụ zara sị, “Ọ bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel, unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a.”

4Ha jụrụ, “Olee ụdị onyinye aja ikpe ọmụma anyị ga-enye.”

A gwara ha, “Dịka ọnụọgụgụ ndịisi obodo Filistia si dị ise, unu ga-eziga onyinye oyiyi etuto ise nke e jiri ọlaedo kpụọ na oyiyi oke ise nke e jikwa ọlaedo kpụọ, nʼihi na ọ bụ otu ụdị ihe otiti ahụ ka o ji tie unu na ndịisi obodo unu niile. 5Jiri ọlaedo kpụọ oyiyi etuto na oke ndị ahụ na-emebi ala unu, si otu a nye chi ndị Izrel nsọpụrụ. Ma eleghị anya ọ ga-ewezuga aka ike ya site nʼebe unu na chi unu dị iche iche na ala unu nọ. 6Gịnị mere unu ga-eji nyịchie obi unu dịka ndị Ijipt na Fero mere? Mgbe Chineke mesiri ha ike, ọ bụ na ha ahapụghị ndị Izrel ka ha laa?

7“Wuonụ ụgbọala ọhụrụ, werekwanụ nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide nʼụgbọ ahụ. Ehi ndị a ga-abụ ndị a na-ejibeghị kọọ ọrụ ubi mbụ. Mgbe unu kegidere ehi ndị a, chịrịnụ ụmụ ha chụba ha nʼebe a na-edebe ehi. 8Werenụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị tinye nʼụgbọala ahụ, tinyekwa ihe ọlaedo ndị ahụ unu na-enye ka ọ bụrụ aja ikpe ọmụma unu nʼime igbe nta unu ga-etinye nʼakụkụ ya. Zilaganụ ya nʼụzọ ọ ga-agbaso. 9Ma guzonụ na-ele ya anya. Ọ bụrụ na ọ gafee oke ala anyị banye Bet-Shemesh, unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị mere ka ihe ọjọọ ndị a dakwasị anyị. Ma ọ bụrụ na o meghị otu a, ọ bụrụ na ọ lọghachi, anyị ga-amata na ihe otiti a bụ naanị ihe ndaba nke dakwasịrị anyị, o sikwaghị nʼaka Onyenwe anyị.”

10Ha were dịka okwu ndị a si dị. Ha weere nne ehi abụọ na-enye ụmụ ara kegide ha nʼụgbọala ahụ, werekwa ụmụ ha kpọchie nʼọgba anụ. 11Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ e tinyere oke na oyiyi etuto ọlaedo ndị ahụ a kpụrụ akpụ ka ha dọkwasịrị nʼelu ụgbọala ahụ. 12Ehi ndị ahụ dọkpụrụ ụgbọ ahụ gawa nʼụzọ Bet-Shemesh. Ha na-ebekwa muuu mgbe ha na-aga. Ha sogidere ụzọ ahụ na-aga. Ha echigharịghị gaa aka nri maọbụ aka ekpe. Ndị eze ndị Filistia sogidekwara ha nʼazụ tutu rute nʼoke ala Bet-Shemesh.

13Nʼoge a, ndị Bet-Shemesh nọ nʼubi na-ewe ihe ubi nke ọka wiiti na ndagwurugwu ala ahụ. Mgbe ha lepụrụ anya hụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, ọṅụ juru ha obi. 14Mgbe ụgbọala ahụ batara nʼubi nwoke a na-akpọ Joshua na Bet-Shemesh, ọ kwụsịrị nʼakụkụ otu nkume ukwu dị nʼebe ahụ. Ngwangwa, ndị nọ nʼebe ahụ gbuwasịrị osisi e ji mee ụgbọ ahụ, gbukwaa ehi abụọ ahụ, were ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. 15Ndị ikom Livayị nọ nʼebe ahụ buliri igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ dị nʼakụkụ ya nke ọlaedo niile a kpụrụ akpụ dị nʼime ya, dọkwasị ha nʼelu nkume. Ndị Bet-Shemesh chụrụ ọtụtụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nye Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. 16Mgbe ndị eze ise obodo ndị Filistia hụrụ ihe mere, ha laghachiri nʼEkrọn nʼụbọchị ahụ.

17Onyinye etuto ọlaedo ise a kpụrụ akpụ nke ha nyere Onyenwe anyị dị ka aja ikpe ọmụma nʼihi ihe mere ha bụ maka obodo ndị Filistia ndị a, Ashdọd, Gaza, Ashkelọn, Gat na Ekrọn. 18Ha wetakwara oke ọlaedo a dịka ọnụọgụgụ obodo ndị Filistia si dị, bụ nke ndịisi ise ahụ nwere, obodo ndị e wusiri ike, na obodo nta niile ha. Nkume ukwu ahụ ebe a dọkwasịrị igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, bụ ihe akaebe nʼubi Joshua, onye Bet-Shemesh ruo taa.

19Ma Onyenwe anyị tigburu iri ndị ikom asaa nʼetiti ndị Bet-Shemesh nʼihi na ha nyobara anya nʼime igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Nʼihi ya ndị Bet-Shemesh ruru ụjụ nʼihi ndị ahụ niile Onyenwe anyị tigburu. 20Ndị Bet-Shemesh jụrụ sị, “Onye pụrụ iguzo nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke a dị nsọ? Olee ebe anyị ga-ezigakwa igbe ọgbụgba ndụ a?”

21Ha zipụrụ ndị ozi ka ha gaa gwa ndị Kiriat Jearim sị ha, “Ndị Filistia ezighachila igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Bịanụ buru ya gaa nʼobodo unu.”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

El retorno del Arca

  • Los gobernantes filisteos representaban una confederación de cinco ciudades principales: Asdod, Gaza, Ascalón, Gat y Ecrón. Para buscar alivio de las plagas que sufrieron, sus sacerdotes y adivinos aconsejaron enviar una ofrenda por la culpa con cinco tumores y cinco ratones de oro, que correspondían a los cinco príncipes y sus territorios.Fuentes: el propio texto bíblico · Ashdod · Gaza · Ashkelon
  • Bet-semes era una ciudad sacerdotal en el límite norte de Judá. Esta condición sacerdotal explica la presencia de levitas que pudieron bajar el Arca y colocarla sobre la gran roca en el campo durante la siega del trigo.Fuentes: el propio texto bíblico · Beth-shemesh
  • Para comprobar si sus calamidades provenían del Dios de Israel o si habían ocurrido por casualidad, los filisteos uncieron al carro dos vacas que criaban y que nunca habían llevado yugo, encerrando a sus terneros. Contra el instinto maternal natural, las vacas avanzaron directamente por el camino hacia Bet-semes sin desviarse.Fuentes: el propio texto bíblico

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Ekron · Hoy: Tel Miqne · 31.777, 34.852 · versículos 16, 17
  • Ashdod · Hoy: Tel Ashdod · 31.757, 34.658 · versículo 17
  • Ashkelon · Hoy: Tel Ashkelon · 31.664, 34.546 · versículo 17
  • Gaza · Hoy: Tell Harube · 31.504, 34.464 · versículo 17
  • Kiriath-jearim · Hoy: Deir el Azar · 31.809, 35.104 · versículo 21

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.