1 Samuel 24
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Devid edoo Sọl ndụ
1Mgbe Sọl sitere nʼịlụso ndị Filistia agha lọta, a gwara ya sị, “Devid nọ nʼọzara En-Gedi.” 2Sọl chịịrị puku ndị agha atọ a zụrụ nke ọma site nʼIzrel niile, pụọ ịchọ Devid na ndị ikom ya nʼetiti ọgba nkume, na nʼakụkụ ụzọ dị warawara nke Ewu Ọhịa.
3Mgbe ọ bịaruru nso nʼọgba atụrụ nke dị nʼụzọ ahụ, otu ọgba nkume dị nʼebe ahụ, Sọl banyere nʼime ya, ịga mposi. Devid na ndị ikom ya nọ nʼime ime ọgba nkume ahụ. 4Ndị ikom Devid sịrị ya, “Ahaa ugbu a bụ oge gị! Taa bụ ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwuru okwu ya, mgbe ọ sịrị, ‘Aghaghị m inyefe gị onye iro gị nʼaka, ka i mee ya dịka o si masị gị.’ ” Ma Devid ji nwayọọ gaa nso ebe Sọl nọ bipụ ọnụ ọnụ uwe mwụda ya.
5Emesịa, obi Devid malitere ịma ya ikpe nʼihi na o bipụrụ ọnụ ọnụ uwe mwụda Sọl. 6Ọ gwara ndị ya na ha so okwu sị, “ Onyenwe anyị ekwela na m ga-emeso nna m ukwu, onye Onyenwe anyị tere mmanụ mmeso dị otu ahụ, maọbụ na m ga-eweli aka imegide ya. Nʼihi na onye Onyenwe anyị tere mmanụ ka ọ bụ.” 7Devid sitere nʼokwu ndị a o kwuru baara ndị so ya mba. O nyeghị ha ohere ibuso Sọl agha. Emesịa, Sọl hapụrụ ọgba nkume ahụ.
8Mgbe Sọl si nʼọgba nkume ahụ pụọ ịga nʼihu nʼije ya, Devid sitere nʼime ọgba nkume ahụ pụta, kpọọ Sọl oku sị ya, “Onyenwe m, eze!” Sọl tụgharịrị ma Devid kpọrọ isiala nye ya, daa nʼala kpuo ihu ya nʼala. 9Mgbe ahụ Devid gwara Sọl okwu sị, “Gịnị mere i ji na-aṅa ntị nʼokwu ndị mmadụ na-ekwu, ndị ahụ na-asị Devid na-achọ ụzọ ọ ga-esi merụọ gị ahụ? 10Taa, i jirila anya gị hụ na ọ bụghị eziokwu. Onyenwe anyị nyere gị nʼaka m nʼime ọgba nkume ahụ ị banyere, ụfọdụ ndị mụ na ha so gwara m ka m gbuo gị, ma ahapụrụ m gị ndụ nʼihi na m sịrị, ‘Agaghị m eweli aka m megide nna m ukwu nʼihi na ọ bụ onye Onyenwe anyị tere mmanụ.’ 11Lee, nna m, lee iberibe uwe mwụda gị nʼaka m. Ebipụtara m ọnụ ọnụ uwe gị, ma egbughị m gị. Jiri nke a ghọta ma matakwa na ikpe nnupu isi na ajọ omume megide gị amaghị m. O nweghị ụzọ m si mejọọ gị, ma ị nọ na-achọsikwa m ike iwere ndụ m. 12Ka Onyenwe anyị kpebie nʼetiti mụ na gị, ka Onyenwe anyị bọọ ọbọ ihe ọjọọ niile i mere. Ma agaghị m emetụ gị aka. 13Dịka ilu ndị mgbe ochie si dị, ‘Ihe ọjọọ na-esi nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ,’ ma agaghị m emetụ gị aka.
14“Ma onye kwanụ ka eze Izrel na-achọ ijide? Onye ka ọ na-atụfu oge ya ịchọgharị? Ọ bụ ozu nkịta? Ka ọ bụ akpị? 15Ka Onyenwe anyị bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị, ya kpebiekwa okwu anyị. Ya leba okwu m anya kpepụta m, ya gosi na m bụ onye ikpe na-amaghị site nʼịnapụta m nʼaka gị.”
16Mgbe Devid kwuchara okwu ndị a, Sọl zara sị ya, “Ọ bụ olu Devid nwa m dị nke ahụ?” Ọ malitekwara ịkwa akwa. 17Ọ sịrị Devid, “Ị bụ ezi mmadụ karịa m, nʼihi na i jirila ezi omume kwụghachi m ajọ omume m. 18E, i gosila m oke obi ebere taa, nʼihi na mgbe Onyenwe anyị nyefere m nʼaka gị, ị gbughị m. 19Ebee ka onye ahụ nọ nʼụwa niile, nke pụrụ ịhapụ onye iro ya mgbe ọ mara nʼọnya ya? Ka Onyenwe anyị kwụghachi gị ezi ihe nʼihi obi ebere i gosiri m taa. 20Ugbu a, amatala m na ị ghaghị ịbụ eze, ị ga-achịkwa alaeze Izrel. 21Biko, ṅụọra m iyi nʼaha Onyenwe anyị na mgbe oge ahụ ruru, na ị gaghị egbu ụmụ m, maọbụ hichapụ aha m site nʼezinaụlọ nna m.”
22Devid ṅụụrụ Sọl iyi. Emesịa, Sọl laghachiri nʼụlọ ya, ma Devid na ndị ikom ya laghachiri nʼọgba nkume ha.

¿Sabías que…?
David Perdona a Saúl en En-gadi
- En-gadi, que significa fuente del cabrito, se ubica en el desierto de Judá, en la ribera occidental del Mar Muerto. Sus riscos escarpados, conocidos como los Peñascos de las Cabras Monteses, y sus numerosas cuevas sirvieron de refugio para David y sus hombres al huir del rey Saúl.Fuentes: Engedi · el propio texto bíblico
- Aunque David tuvo la oportunidad de matar a Saúl en la cueva y sus hombres lo incitaron a hacerlo, se negó a atacarlo porque Saúl era el ungido del SEÑOR. En lugar de ello, David solo cortó la orilla del manto de Saúl para demostrar que no abrigaba malas intenciones contra él.Fuentes: el propio texto bíblico · Saul
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Engedi · Hoy: Ein Gedi · 31.450, 35.383 · versículo 1
- Wildgoats’ Rocks · Hoy: within 4 km of Ein Gedi · 31.450, 35.383 · versículo 2
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org