Nations Bible

1 Samuel 2

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.

Ekpere Hana

1Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị:

“Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị;

nʼime Onyenwe anyị ka e buliri mpi m elu.

Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m,

nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị.

2“O nweghị onye dị nsọ dịka Onyenwe anyị;

o nweghị onye dị karịa gị,

o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị.

3“Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako,

ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga.

Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke maara ihe niile,

ya bụ onye na-anwale ọrụ niile.

4“Ụta ndị na-ebu agha agbajiela

ma ndị ahụ dara mba ka e nyere ike.

5Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri,

ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa.

Nwanyị aga amụtala ụmụ asaa

ma nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa.

6“ Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ,

ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ.

7Onyenwe anyị na-ezite ụbịam na akụnụba;

ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu.

8Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenye

na-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ.

Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ,

na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ.

“Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke Onyenwe anyị

nʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa.

9Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ ya

ma ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị.

“Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa.

10Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide Onyenwe anyị ka a ga-etipịa.

Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha.

Onyenwe anyị ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe.

“Ọ ga-enye eze ya ike

bulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.”

11Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi Onyenwe anyị, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka.

Ụmụ ọjọọ Elayị

12Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị Onyenwe anyị anya. 13Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya. 14Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo. 15Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja, ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.”

16Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.”

17Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị anya.

18Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja. 19Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja. 20Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka Onyenwe anyị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri Onyenwe anyị.” 21Onyenwe anyị gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu Onyenwe anyị.

22Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute. 23Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a? 24Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị Onyenwe anyị banyere unu. 25Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide Onyenwe anyị, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ịla ha nʼiyi.

26Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị Onyenwe anyị na mmadụ mma.

Amụma megide ezinaụlọ Elayị

27Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero? 28Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ. 29Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m.

30“Nʼihi ya, otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwupụtara, sị, ‘Ekwere m nkwa na ndị ezinaụlọ gị na nke nna gị ga-eje ozi nʼihu m ruo mgbe ebighị ebi,’ ma ugbu a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, ‘Ọ gaghị adịkwa otu a nʼebe m nọ! Nʼihi na ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma ndị niile na-eleda m anya, ka a ga-akpọ ihe efu. 31Oge na-abịa mgbe m ga-ebipụ ike gị na ike ezinaụlọ nna gị, wezuga ha ka nwoke ọbụla nʼezinaụlọ gị hapụ ito ghọọ agadi. 32Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị. 33Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi.

34“ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị. 35Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile. 36Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ”

Ilustración artística: una interpretación, no un registro histórico.

¿Sabías que…?

El cántico de Ana y el sacerdocio en Silo

  • Los hijos de Elí, Ofni y Finees, violaban las costumbres del santuario al exigir carne cruda antes de quemar la grasa en el altar y al usar un garfio de tres dientes para sacar carne de las ollas. Sus exigencias agresivas trataban las ofrendas del Señor con desprecio.Fuentes: el propio texto bíblico · Hophni · Phinehas
  • Mientras servía ante Elí en Silo, el niño Samuel vestía un efod de lino. Cada año, cuando sus padres iban a ofrecer el sacrificio anual, su madre Ana le llevaba una pequeña túnica confeccionada por ella.Fuentes: el propio texto bíblico · Samuel · Hannah
  • Un hombre de Dios anunció juicio contra la casa de Elí por profanar los sacrificios y honrar a sus hijos corruptos más que a Dios. La profecía advirtió que el linaje sacerdotal de Elí perdería su posición, señalando que tanto Ofni como Finees morirían el mismo día.Fuentes: el propio texto bíblico · Eli · Hophni

Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.

Lugares de este capítulo

  • Shiloh · Hoy: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · versículo 14
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 27

Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Habla con nosotros

Cuéntanos desde dónde lees, cómo te ha ayudado la Biblia o qué podemos mejorar. Leemos todos los mensajes.