1 Reyes 5
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Nkwado maka iwu Ụlọnsọ ukwu
1Mgbe Hiram eze Taịa nụrụ na eteela Solomọn mmanụ ịbụ eze nʼọnọdụ nna ya Devid, o zipụrụ ndị ozi ya ijekwuru Solomọn, nʼihi na ya na Devid bụ enyi, dịrịkwa na mma. 2Mgbe ahụ, Solomọn zigara Hiram ozi, sị ya:
3“Ị maara na Devid nna m enweghị ike iwu ụlọnsọ ukwuu nye Aha Onyenwe anyị Chineke ya, nʼihi agha niile ọ lụrụ mgbe ọ dị ndụ. Ọ nọkwa na-eche ka Onyenwe anyị nye ya udo. 4Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke m enyela m udo nʼakụkụ ọbụla. Enwekwaghị m ndị iro, ma ọ bụkwanụ ihe ndakwasị ọjọọ ọbụla. 5Nʼihi ya, ana m achọ iwu ụlọnsọ ukwu nye Aha Onyenwe anyị Chineke m, dịka Onyenwe anyị gwara nna m Devid mgbe ọ sịrị ya, ‘Nwa gị nwoke, onye m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, ga-ewu ụlọnsọ ukwu nye Aha m.’
6“Ya mere, nye iwu ka e gbutuoro m osisi sida nke Lebanọn. Ndị ọrụ m ga-esoro ndị nke gị nʼọrụ a. Aga m akwụ gị ihe ọbụla i kpebiri bụ ụgwọ ọrụ ha. Ị maara na anyị enweghị ndị ọka igbutu osisi dịka ndị Saịdọn.”
7Mgbe Hiram nụrụ ozi Solomọn ziri, obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu. O kwuru sị, “Otuto dịrị Onyenwe anyị taa, nʼihi na o nyela Devid nwa nwoke nwere amamihe ịchị mba ukwuu a.”
8Ya mere, Hiram zigaara Solomọn ozi sị,
“Anụla m ozi i ziteere m. Aga m emekwa ihe niile dịka i kwuru banyere i budatara gị osisi sida na osisi junipa. 9Ndị ohu m ga-esi nʼugwu Lebanọn budaruo ha nʼosimiri Mediterenịa. A ga-ekekọta ha ọnụ, zitere gị ha nʼebe ị chọrọ ịnọ buru ha. Mgbe ha sere nʼelu mmiri rute ebe ị chọrọ, anyị ga-atọsakwara gị ha, ka i buru ha. Ma gị onwe gị ga-eme ihe bụ ọchịchọ m, site na-inye ndị ụlọ m ihe oriri.”
10Nʼụzọ dị otu a, Hiram nọgidere na-ezitere Solomọn osisi sida na junipa niile ọ chọrọ. 11Solomọn nyere Hiram na ezinaụlọ ya narị puku bushel, na iri puku bushel ọka wiiti abụọ, ka ọ bụrụ ihe oriri nye ezinaụlọ ya, tinyekwara narị puku galọọnụ, na iri puku galọọnụ abụọ nke mmanụ oliv asụrụ asụ. Solomọn nọgidere na-enye Hiram ihe ndị a kwa afọ. 12Onyenwe anyị nyere Solomọn amamihe dị ukwuu dịka o kwere ya na nkwa. Hiram na Solomọn nwere mmekọ udo, ha abụọ gbakwara ndụ.
13Eze Solomọn, sitere nʼakụkụ Izrel niile kpọbata ndị ọrụ mmanye ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ. 14Nʼotu ọnwa, ọ na-eziga puku mmadụ iri nʼime ndị a ka ha gaa Lebanọn ịrụ ọrụ. Nʼọnwa ọzọ, ọ na-ezigakwa puku mmadụ iri ka ha gaa gbanwee ndị buuru ụzọ gaa. Nʼụzọ dị otu a, otu ụzọ nʼime iri puku mmadụ atọ ndị a na-anọ na Lebanọn otu ọnwa maka ịrụ ọrụ, ma ha na-alọta zuo ike ọnwa abụọ. Adoniram bụ onyeisi ndị ọrụ mmanye a. 15Solomọn nwere ndị ọrụ ọzọ ọnụọgụgụ ha dị iri puku asaa na-ebu ibu, nweekwa ndị na-awa nkume nʼugwu ọnụọgụgụ ha dị iri puku asatọ. 16Nʼagụnyeghị ndị a, o nwekwara ndịisi, ndị na-elekọta ndị ọrụ ndị a, ọnụọgụgụ ha dị puku atọ na narị atọ. 17Dịka iwu eze si dị, ha na-esite nʼebe a na-awa nkume ebupụta nkume dị mma buru ibu nke e ji ewu ntọala ụlọnsọ ukwu ahụ 18Ndị ikom si Gebal, nyere ndị ọrụ Solomọn na ndị ọrụ Hiram aka, igbutu osisi na ịwa ha. Ha nyekwara aka ịkwado nkume e ji ewu ụlọ ahụ.

¿Sabías que…?
Preparativos para el templo
- El rey Hiram de Tiro, una importante ciudad marítima fenicia, mantuvo relaciones pacíficas con David y formalizó un tratado con Salomón. A cambio de madera de cedro y ciprés del Líbano transportada por mar en balsas, Salomón abastecía anualmente a la casa de Hiram con grandes cantidades de trigo y aceite puro de oliva.Fuentes: Hiram · Tyre · el propio texto bíblico
- Para preparar los materiales del templo, Salomón recurrió a la destreza maderera de los sidonios. Constructores de Tiro y de Gebal —antigua ciudad costera fenicia conocida por los griegos como Biblos— trabajaron junto a los israelitas en la cantera cortando grandes piedras labradas y preparando la madera.Fuentes: Gebal · el propio texto bíblico
- Salomón organizó una inmensa fuerza de trabajo, reclutando a 30.000 israelitas que servían en el Líbano en turnos rotativos de 10.000 hombres al mes bajo la supervisión de Adoniram. Además, 70.000 cargadores y 80.000 canteros laboraban en las montañas, dirigidos por 3.300 capataces.Fuentes: Adoniram · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Tyre · 33.271, 35.196 · versículo 1
- Lebanon · 33.540, 35.584 · versículos 6, 9, 14
- Great Sea · Hoy: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · versículo 9
- Gebal · Hoy: Byblos · 34.119, 35.646 · versículo 18
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org